< Masalimo 19 >
1 Kwa mtsogoleri wa mayimbidwe. Salimo la Davide. Zakumwamba zimalengeza za ulemerero wa Mulungu; thambo limalalikira ntchito za manja ake.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.
2 Tsiku ndi tsiku zimayankhula mawu ambiri, usiku ndi usiku zimaonetsa poyera nzeru.
Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.
3 Palibe kuyankhula, palibe mawu aliwonse; liwu lawo silimveka.
Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha.
4 Koma uthenga wawo umapita pa dziko lonse lapansi, mawuwo amafika mpaka kumalekezero a dziko lapansi.
Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
5 Dzuwa lili ngati mkwatibwi wobwera kuchokera ku nsanja yake, ngati katswiri wokondwerera kuthamanga pa mpikisano.
Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta, dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.
6 Limatuluka kuyambira mbali ina ya thambo ndi kuzungulira mpaka mbali inanso; palibe chinthu chotha kupewa kutentha kwake.
Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe, bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.
7 Lamulo la Yehova ndi langwiro, kutsitsimutsa moyo. Maumboni a Yehova ndi odalirika, amapereka nzeru kwa wopanda nzeru.
Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.
8 Malangizo a Yehova ndi olungama, amapereka chimwemwe mu mtima. Malamulo a Yehova ndi onyezimira, amapereka kuwala.
Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè.
9 Kuopa Yehova ndiye chinthu changwiro, chimakhala mpaka muyaya. Maweruzo a Yehova ndi owona ndipo onse ndi olungama;
Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi.
10 ndi a mtengowapatali kuposa golide, kuposa golide weniweni; ndi otsekemera kuposa uchi, kuposa uchi wochokera pa chisa chake.
Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
11 Mtumiki wanu amachenjezedwa nawo; powasunga pali mphotho yayikulu.
Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.
12 Ndani angathe kudziwa zolakwa zake? Mundikhululukire zolakwa zanga zobisika.
Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile? Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m.
13 Muteteze mtumiki wanunso ku machimo ochita akudziwa; iwo asandilamulire. Kotero ndidzakhala wosalakwa, wopanda mlandu wa tchimo lalikulu.
Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị. Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m. Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke, onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị.
14 Mawu a mʼkamwa mwanga ndi zolingalira za mu mtima mwanga zikhale zokondweretsa pamaso panu, Inu Yehova, Thanthwe langa ndi Mpulumutsi wanga.
Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m, ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile, bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.