< Masalimo 150 >
1 Tamandani Yehova. Tamandani Mulungu mʼmalo ake opatulika; mutamandeni ku thambo lake lamphamvu.
Toonu Onyenwe anyị. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.
2 Mutamandeni chifukwa cha machitidwe ake amphamvu; mutamandeni chifukwa cha ukulu wake wopambana.
Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.
3 Mutamandeni poyimba malipenga, mutamandeni ndi pangwe ndi zeze.
Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,
4 Mutamandeni ndi matambolini ndi kuvina, mutamandeni ndi zingwe ndi zitoliro.
jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,
5 Mutamandeni ndi ziwaya zolira za malipenga, mutamandeni ndi ziwaya zolira kwambiri.
werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.
6 Chamoyo chilichonse chopuma chitamande Yehova. Tamandani Yehova.
Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị.