< Masalimo 135 >
1 Tamandani Yehova. Tamandani dzina la Yehova; mutamandeni, inu atumiki a Yehova,
Toonu Onyenwe anyị. Toonu aha Onyenwe anyị, toonu ya, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile,
2 amene mumatumikira mʼnyumba ya Yehova, mʼmabwalo a nyumba ya Mulungu wathu.
unu ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị, nʼime ogige ụlọ Chineke anyị.
3 Tamandani Yehova, pakuti Yehova ndi wabwino; imbani nyimbo zotamanda dzina lake, pakuti nʼkokoma kutero,
Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị dị mma; bụkuo aha ya abụ otuto, nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi.
4 Pakuti Yehova wasankha Yakobo kuti akhale wake, Israeli kuti akhale chuma chake chapamtima.
Nʼihi na Onyenwe anyị ahọpụtala Jekọb nye onwe ya, ọ họpụtala Izrel ka ọ bụrụ ihe oke ọnụahịa nke aka ya.
5 Ndikudziwa kuti Yehova ndi wamkulu, kuti Ambuye athu ndi wamkulu kuposa milungu yonse.
Amaara m na Onyenwe anyị dị ukwuu, na Onyenwe anyị dị ukwuu karịa chi niile.
6 Yehova amachita chilichonse chimene chimamukomera, kumwamba ndi dziko lapansi, ku nyanja zazikulu ndi ku malo ake onse akuya.
Onyenwe anyị na-eme ihe ọbụla masịrị ya nʼeluigwe na elu ụwa na nʼoke osimiri na nʼime ogbu mmiri niile.
7 Iye amatulutsa mitambo kuchokera ku malekezero a dziko lapansi, amatumiza zingʼaningʼani pamodzi ndi mvula ndipo amatulutsa mphepo ku malo ake osungiramo.
Ọ bụ ya na-eme ka igwe ojii na-apụta site nʼakụkụ niile nke ụwa. Ọ bụkwa ya na-ezite amụma nke na-eweta mmiri ozuzo. Ọ na-ewepụtakwa ifufe site nʼụlọ ifufe ya niile.
8 Anakantha ana oyamba kubadwa a Igupto, ana oyamba kubadwa a anthu ndi nyama.
O tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ụmụ mmadụ buru ụzọ mụọ na ụmụ anụ ụlọ e buru ụzọ mụọ.
9 Iye anatumiza zizindikiro zozizwitsa ndi zodabwitsa pakati pako, iwe Igupto, kutsutsana ndi Farao pamodzi ndi atumiki ake onse.
O zipụrụ ihe ịrịbama ya dị iche iche na ọrụ ebube ya niile nʼetiti unu, o Ijipt, megide Fero na ndị niile na-ejere ya ozi.
10 Iye anakantha mitundu yambiri ya anthu ndi kupha mafumu amphamvu:
O tigburu ọtụtụ mba dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, tigbukwaa ndị eze ha, ndị dị ike nʼagha.
11 Sihoni mfumu ya Aamori, Ogi mfumu ya Basani, ndi maufumu onse a ku Kanaani;
Ụfọdụ nʼime ha bụ Saịhọn, eze ndị Amọrait, na Ọg eze Bashan, na ndị eze niile dị na Kenan.
12 ndipo anapereka dziko lawo ngati cholowa, cholowa cha anthu ake Aisraeli.
O weere ala ndị obodo ahụ niile nye ndị ya, nye ya ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha.
13 Dzina lanu, Inu Yehova, ndi losatha mpaka muyaya, mbiri yanu, Inu Yehova, idziwika mibado yonse.
O Onyenwe anyị, aha gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi a maara aha gị ruo ọgbọ niile.
14 Pakuti Yehova adzaonetsa kuti anthu ake ngosalakwa, ndipo adzachitira chifundo atumiki ake.
Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekpepụta ndị ya. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ ndị ohu ya.
15 Mafano a mitundu ya anthu ndi siliva ndi golide, opangidwa ndi manja a anthu.
Chi ndị mba ọzọ bụ arụsị e jiri aka kpụọ, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.
16 Pakamwa ali napo koma sayankhula maso ali nawo, koma sapenya;
Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ.
17 makutu ali nawo, koma sakumva ndipo mʼkamwa mwawo mulibe mpweya uliwonse.
Ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ọ dịkwaghị nkuume dị nʼime ọnụ ha.
18 Iwo amene amapanga mafanowo adzakhala ngati mafanowo, chimodzimodzinso iwo amene amadalira mafanowo.
Ndị na-eme ha ga-adị ka ha. Ọ bụkwa otu a ka ndị na-atụkwasị ha obi ga-adị.
19 Inu nyumba ya Israeli, tamandani Yehova; inu nyumba ya Aaroni, tamandani Yehova;
Ndị Izrel, toonu Onyenwe anyị. Unu ndị ụlọ Erọn, toonu Onyenwe anyị.
20 Inu nyumba ya Levi, tamandani Yehova; Inu amene mumaopa Iye, tamandani Yehova.
Unu ndị ụlọ Livayị, toonu Onyenwe anyị; unu ndị na-atụ egwu ya, toonu Onyenwe anyị.
21 Wodalitsika ndi Yehova kuchokera mʼZiyoni, amene amakhala mu Yerusalemu. Tamandani Yehova.
Ka otuto dịrị Onyenwe anyị site na Zayọn, nye onye ahụ na-ebi na Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.