< Masalimo 13 >
1 Kwa mtsogoleri wa mayimbidwe. Salimo la Davide. Mpaka liti Yehova? Kodi mudzandiyiwala mpaka kalekale? Mpaka liti mudzandibisira nkhope yanu?
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị? Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?
2 Ndidzalimbana ndi maganizo anga ndi kukhala ndi chisoni mu mtima mwanga tsiku lililonse mpaka liti? Mpaka liti adani anga adzandipambana?
Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m? Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?
3 Ndiyangʼaneni ndi kundiyankha, Inu Yehova Mulungu wanga. Walitsani maso anga kuti ndingafe;
Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;
4 mdani wanga adzati, “Ndamugonjetsa,” ndipo adani anga adzakondwera pamene ine ndagwa.
mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.
5 Koma ndikudalira chikondi chanu chosasinthika; mtima wanga umakondwera ndi chipulumutso chanu.
Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.
6 Ine ndidzayimbira Yehova pakuti wandichitira zokoma.
Aga m abụku Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.