< Masalimo 128 >

1 Nyimbo yoyimba pokwera ku Yerusalemu. Odala ndi onse amene amaopa Yehova, amene amayenda mʼnjira zake.
Abụ nrigo. Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.
2 Udzadya chipatso cha ntchito yako; madalitso ndi chuma zidzakhala zako.
Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.
3 Mkazi wako adzakhala ngati mpesa wobereka mʼkati mwa nyumba yako; ana ako adzakhala ngati mphukira za mitengo ya olivi kuzungulira tebulo lako.
Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị.
4 Ameneyu ndiye munthu wodalitsidwa amene amaopa Yehova.
Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị.
5 Yehova akudalitse kuchokera mʼZiyoni masiku onse a moyo wako; uwone zokoma za Yerusalemu,
Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,
6 ndipo ukhale ndi moyo kuti udzaone zidzukulu zako. Mtendere ukhale ndi Israeli.
ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Ka udo dịrị Izrel.

< Masalimo 128 >