< Masalimo 105 >

1 Yamikani Yehova, itanani dzina lake; lalikirani pakati pa anthu a mitundu ina zimene Iye wachita.
Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
2 Imbirani Iye, imbani matamando kwa Iyeyo; fotokozani za machitidwe ake onse odabwitsa.
Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile.
3 Munyadire dzina lake loyera; mitima ya iwo amene amafunafuna Yehova ikondwere.
Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa.
4 Dalirani Yehova ndi mphamvu zake; funafunani nkhope yake nthawi yonse.
Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.
5 Kumbukirani zodabwitsa zimene Iye anazichita, zozizwitsa zake ndi maweruzo amene anapereka,
Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta,
6 inu zidzukulu za Abrahamu mtumiki wake, inu ana a Yakobo, osankhika ake.
unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
7 Iye ndiye Yehova Mulungu wathu; maweruzo ake ali pa dziko lonse lapansi.
Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.
8 Iyeyo amakumbukira pangano lake kwamuyaya, mawu amene analamula kwa mibado yonse,
Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ,
9 pangano limene Iye anapanga ndi Abrahamu, lumbiro limene analumbira kwa Isake.
ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
10 Iye analitsimikiza kwa Yakobo monga zophunzitsa, kwa Israeli monga pangano lamuyaya:
O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
11 “Ndidzapereka kwa iwe dziko la Kanaani ngati gawo la cholowa chako.”
“Aga m enye gị ala Kenan dịka oke i ga-eketa.”
12 Pamene iwo anali ngati anthu ochepa mʼchiwerengero, ochepa ndithu, ndiponso alendo mʼdzikolo,
Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya.
13 ankayendayenda kuchoka ku mtundu wina wa anthu ndi kupita ku mtundu wina, kuchoka mu ufumu wina kupita ku wina.
Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa alaeze ọzọ.
14 Iye sanalole wina aliyense kuwapondereza; anadzudzula mafumu chifukwa cha iwo:
O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha;
15 “Musakhudze odzozedwa anga; musachitire choyipa aneneri anga.”
sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka; unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
16 Iye anabweretsa njala pa dziko ndipo anawononga chakudya chonse;
O zitere ụnwụ nʼala ahụ, bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri;
17 Iyeyo anatumiza munthu patsogolo pawo, Yosefe anagulitsidwa ngati kapolo.
o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha, Josef, onye e refuru dịka ohu.
18 Iwo anavulaza mapazi ake ndi matangadza, khosi lake analiyika mʼzitsulo,
Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ, nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu,
19 mpaka zimene Iye ananeneratu zitakwaniritsidwa, mpaka mawu a Yehova ataonetsa kuti Iye ananena zoona.
tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru, tutu ruo mgbe okwu Onyenwe anyị nwapụtara ya dịka onye eziokwu.
20 Mfumu inatuma munthu kukamumasula, wolamulira wa mitundu ya anthu anamasula iyeyo.
Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya, onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya.
21 Anamuyika kukhala wolamulira nyumba yake, wolamulira zonse zimene iye anali nazo,
O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya, onye na-achị ihe niile o nwere,
22 kulangiza ana a mfumu monga ankafunira ndi kuphunzitsa nzeru akuluakulu.
ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya, na izi ndị okenye ya amamihe.
23 Tsono Israeli analowa mu Igupto; Yakobo anakhala monga mlendo mʼdziko la Hamu.
Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt; Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa.
24 Yehova anachulukitsa anthu ake; ndipo anachititsa kuti akhale ochuluka kwambiri kuposa adani awo;
Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu; o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha,
25 amene mitima yawo anayitembenuza kuti idane ndi anthu ake, kukonzera chiwembu atumiki ake.
ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya.
26 Yehova anatuma Mose mtumiki wake, ndi Aaroni amene Iye anamusankha.
O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara.
27 Iwo anachita zizindikiro zozizwitsa pakati pawo, zodabwitsa zake mʼdziko la Hamu.
Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha, ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham.
28 Yehova anatumiza mdima nasandutsa dziko kuti likhale la mdima. Koma anthuwo anakaniratu mawu a Yehova.
O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị, nʼihi na ha nupuru isi megide okwu ya.
29 Yehova anasandutsa madzi awo kukhala magazi, kuchititsa kuti nsomba zawo zife.
O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara, nke mere ka azụ niile dị nʼime ya nwụsịa.
30 Dziko lawo linadzaza ndi achule amene analowa mʼzipinda zogona za olamulira awo.
Ala ha niile jupụtara nʼawọ ọ bụladị nʼime ọnụụlọ ndina nke ndị na-achị achị.
31 Iye anayankhula, ndipo kunabwera ntchentche zochuluka ndi nsabwe mʼdziko lawo lonse.
O kwuru okwu, igwe ijiji na anwụ nta dị iche iche ejupụta nʼala ha niile.
32 Iyeyo anatembenuza mvula yawo kukhala matalala, ndi zingʼaningʼani mʼdziko lawo lonse;
Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere ha mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe nʼala ha niile;
33 Anagwetsa mitengo yawo ya mpesa ndi mitengo yawo ya mkuyu, nawononganso mitengo ina ya mʼdziko lawolo.
o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha, kwatusịakwa osisi niile dị nʼala ha.
34 Iye anayankhula, ndipo dzombe linabwera, ziwala zosawerengeka;
O kwuru okwu, igurube na ụkpana a na-apụghị ịgụta ọnụ jupụtara ebe niile;
35 zinadya chilichonse chobiriwira cha mʼdziko lawo, zinadya zonse zotuluka mʼnthaka yawo.
ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ, ripịakwa mkpụrụ niile ha kụrụ nʼubi ha.
36 Kenaka anakantha ana onse oyamba kubadwa a mʼdziko lawo, zipatso zoyamba za umunthu wawo wonse.
Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha.
37 Yehova anatulutsa Israeli, atatenga siliva ndi golide wambiri, ndipo pakati pa mafuko awo palibe mmodzi amene anafowoka.
Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo, ọ dịghị otu onye nʼime ebo ya niile nke ahụ na-esighị ike.
38 Dziko la Igupto linakondwa pamene iwo anachoka, pakuti kuopsa kwa Israeli kunawagwera iwo.
Obi dị Ijipt ụtọ mgbe ha pụrụ, nʼihi na oke egwu ndị Izrel dakwasịrị ha.
39 Iye anatambasula mitambo ngati chofunda chawo, ndi moto owawunikira usiku.
Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi, na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị.
40 Iwo anapempha, ndipo Iye anawabweretsera zinziri ndipo anawakhutitsa ndi chakudya chochokera kumwamba.
Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel, jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ.
41 Iye anatsekula thanthwe, ndipo madzi anatuluka; ngati mtsinje anayenda mʼchipululu.
O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara; ọ sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi.
42 Pakuti anakumbukira lonjezo lake loyera limene linaperekedwa kwa Abrahamu mtumiki wake.
Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ, nke o kwere ohu ya Ebraham.
43 Iye anatulutsa anthu ake akukondwera, osankhika ake akufuwula mwachimwemwe;
O ji aṅụrị dupụta ndị ya, jirikwa ọnọdụ iti mkpu ọṅụ dupụta ndị ya ọ họpụtara;
44 Iye anawapatsa mayiko a anthu a mitundu ina ndipo anakhala olowamʼmalo a zimene ena anazivutikira,
o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche, ha ghọrọ ndị nnweta nke ihe ndị ọzọ rụpụta,
45 kuti iwo asunge malangizo ake ndi kutsatira malamulo ake. Tamandani Yehova.
ka ha nwee ike debe ụkpụrụ ya niile ma na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị.

< Masalimo 105 >