< Miyambo 13 >
1 Mwana wanzeru amamvera malangizo a abambo ake, koma mwana wonyoza samamvetsera chidzudzulo.
Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.
2 Munthu amapeza zinthu zabwino chifukwa cha mawu ake, koma anthu osakhulupirika amalakalaka zachiwawa basi.
Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ, ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha.
3 Iye amene amagwira pakamwa pake amateteza moyo wake, koma amene amayankhula zopanda pake adzawonongeka.
Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka! Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.
4 Munthu waulesi amakhumbira zinthu koma sapeza kanthu, koma munthu wakhama adzalemera.
Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.
5 Munthu wolungama amadana ndi zabodza, koma zochita za munthu woyipa zimanyansa ndiponso zimachititsa manyazi.
Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị, ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu na-ewetara ya ihere na nkọcha.
6 Chilungamo chimateteza munthu wangwiro, koma tchimo limagwetsa munthu wochimwa.
Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile, ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.
7 Wina amadziyesa kuti ndi wolemera chonsecho alibe kanthu kalikonse; munthu wina amaoneka ngati wosauka chonsecho ali ndi chuma chambiri.
Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa. Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.
8 Chuma cha munthu wolemera chitha kuwombola moyo wake, koma munthu wosauka amamva chidzudzulo.
Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya, ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.
9 Nyale ya munthu wolungama ndi yokondweretsa, koma nyale ya munthu woyipa imazimitsidwa.
Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ, ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.
10 Chipongwe chosamalabadirako za anthu ena chimadzetsa mikangano, koma womva malangizo a anzawo ndiwo ali ndi nzeru.
Nganga na-eweta esemokwu, ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.
11 Chuma chochipeza mofulumira chidzatha pangʼonopangʼono koma chuma chosonkhanitsidwa pangʼonopangʼono chidzachulukirachulukira.
Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa; ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.
12 Chinthu chochiyembekezera chikalephereka chimalefula mtima, koma chinthu chochilakalaka chikachitikadi chimakhala ngati mtengo wamoyo.
Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi, mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.
13 Amene amanyoza malangizo adzawonongeka, koma amene amasamala lamulo amalandira mphotho.
Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya, ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.
14 Malangizo a munthu wanzeru ali ngati kasupe wamoyo; amathandiza munthu kuti asakondwe mu msampha wa imfa.
Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
15 Munthu wa nzeru zabwino amapeza kuyanja pakati pa anthu, koma munthu wosakhulupirika adzawonongeka.
Ezi nghọta na-eweta ihuọma, ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi.
16 Munthu wochenjera amachita zinthu mwanzeru, koma chitsiru chimaonetsa poyera uchitsiru wake.
Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ, ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.
17 Wamthenga woyipa amagwetsa anthu mʼmavuto, koma nthumwi yodalirika imabweretsa mtendere.
Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu, ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ.
18 Wokana mwambo adzasauka ndi kunyozedwa, koma wosamala chidzudzulo adzalemekezedwa.
Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere; ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ.
19 Chinthu chochilakalaka chikachitika chimasangalatsa mtima, koma zitsiru zimadana ndi kuleka zoyipa.
Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị.
20 Woyenda ndi anthu anzeru nayenso adzakhala wanzeru; koma woyenda ndi zitsiru adzapwetekeka.
Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe, nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.
21 Choyipa chitsata mwini, koma wochita zolungama adzalandira mphotho yabwino.
Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie, ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume.
22 Munthu wabwino amasiyira zidzukulu zake cholowa, koma chuma cha munthu wochimwa amachilandira ndi olungama.
Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ, ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.
23 Tsala la munthu wosauka limalola chakudya chambiri, koma anthu opanda chilungamo amachilanda.
Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri, ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya.
24 Amene sakwapula mwana wake, ndiye kuti amamuda, koma wokonda mwana wake sazengereza kumulanga.
Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya; ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.
25 Munthu wolungama amakhala ndi zakudya zoti adye nʼkukhuta, koma mʼmimba mwa munthu woyipa mumakhala pululu ndi njala.
Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya, ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume.