< Numeri 6 >

1 Yehova anawuza Mose kuti,
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 “Yankhula ndi Aisraeli ndipo uwawuze kuti, ‘Ngati mwamuna kapena mkazi afuna kuchita lonjezo lapadera, lonjezo lodzipatula yekha kwa Yehova ngati Mnaziri,
Gwa ndị Izrel sị ha, “Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ṅụrụ iyi o ji kpebie ikwe nkwa pụrụ iche nke ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait,
3 sayenera kumwa vinyo kapena zakumwa zosasa ndipo asamamwe chakumwa chilichonse cha mphesa. Asamamwe madzi a mphesa kapena kudya mphesa zaziwisi kapena zowuma.
ha ga-ekewapụ onwe ha site na ịṅụ mmanya, maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Ha agaghị aṅụ mmiri mkpụrụ vaịnị, ọ gaghị ata mkpụrụ vaịnị ọhụrụ maọbụ nke a mịkpọrọ amịkpọ.
4 Pa nthawi yonse imene ali Mnaziri, asamadye chilichonse chopangidwa kuchokera ku mphesa ngakhale mbewu zake kapena makungu ake.’
Oge ahụ niile ọ bụ onye Nazirait, ọ gaghị eri ihe ọbụla sitere na mkpụrụ osisi vaịnị maọbụ mkpụrụ ya maọbụ okpokoro azụ ya.
5 “‘Pa nthawi yonse ya lonjezo lodzipatula yekhalo, asamete kumutu kwake ndi lumo. Akhale wopatulika mpaka nthawi yake yonse ya kudzipatula yekha kwa Yehova itatha. Alileke tsitsi la pamutu pake kuti likule.’
“‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too.
6 Pa nthawi yonse imene munthuyo wadzipatula yekha kwa Yehova asayandikire mtembo.
“‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ,
7 Ngakhale abambo ake kapena amayi ake kapena mchimwene wake kaya mchemwali wake atamwalira, asadzidetse pokhudza mitembo yawo chifukwa kulumbira kwake kwa kudzipatula yekha kwa Yehova kuli pamutu pake.
ọ bụladị na nna ya, maọbụ nne ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị anwụọ. Ọ gaghị emerụ onwe ya nʼihi ha, nʼihi na akara ikewapụ onwe ya iche nye Chineke dị ya nʼisi.
8 Munthuyo ndi wopatulika masiku onse odzipereka kwake kwa Yehova.
Nʼoge niile nke ikewapụ onwe ya, onye e doro nsọ nye Onyenwe anyị ka ọ bụ.
9 “Ngati munthu wina afa mwadzidzidzi pafupi naye ndi kudetsa tsitsi lake loperekedwalo, amete mutu wake pa tsiku lodziyeretsa, tsiku lachisanu ndi chiwiri.
“‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ na mberede nʼakụkụ onye nazirait, si otu a merụọ agịrị isi ya nke na-egosi ido nsọ ya, ọ ghaghị ịkpacha isi ya nʼụbọchị nke asaa bụ ụbọchị ime ka ọ dị ọcha.
10 Tsono pa tsiku lachisanu ndi chitatu abweretse nkhunda ziwiri kapena mawunda awiri anjiwa kwa wansembe pa khomo lolowera ku tenti ya msonkhano.
Nʼụbọchị nke ọzọ ya, bụ nʼụbọchị nke asatọ. Ọ ghaghị iwetara onye nchụaja nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
11 Wansembe apereke imodzi kuti ikhale nsembe yauchimo ndi ina nsembe yopsereza yotetezera tchimo chifukwa anachimwa popezeka pafupi ndi mtembo. Ndipo tsiku lomwelo apatulenso tsitsi la pamutu pake.
Onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ha chụọrọ ya aja mmehie. Ọ ga-ewerekwa nnụnụ nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ maka ikpuchiri onye ahụ nwere akara ido nsọ mmehie ya, bụ nke o mere site nʼịnọ onye nwụrụ anwụ nso. Ọ ga-edokwa isi ya nsọ ọzọ nʼụbọchị ahụ.
12 Adzipereke kwa Yehova pa nthawi yodzipatula ndipo abweretse nkhosa yayimuna ya chaka chimodzi ngati nsembe yopepesera. Masiku akale sawerengedwanso chifukwa anadzidetsa pa nthawi yodzipatulira kwake.
Ọ ga-ekewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka o mere na mmalite ụbọchị niile nke ido nsọ ya. Wetakwa otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja ikpe ọmụma. A gaghị agụnyere ya ụbọchị ndị ahụ niile gafere tupu o merụọ onwe ya, nʼihi na o merụrụ onwe ya mgbe ọ nọ ọnọdụ imezu nkwa nkewapụ.
13 “Tsono ili ndi lamulo la Mnaziri pamene nthawi yodzipatula kwake yatha: Abwere naye pa khomo la tenti ya msonkhano.
“‘Nke a bụ iwu dịrị onye Nazirait mgbe oge ido onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị zuru. A ga-eduru ya bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
14 Pamenepo apereke chopereka chake kwa Yehova: Nkhosa yayimuna ya chaka chimodzi yopanda chilema kuti ikhale nsembe yopsereza, mwana wankhosa wamkazi mmodzi wopanda chilema kuti ikhale nsembe yauchimo, ndi nkhosa imodzi yayikulu yayimuna kuti ikhale nsembe yachiyanjano,
Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ chee onyinye ya ndị a nʼihu Onyenwe anyị: nwa ebule na-enweghị ntụpọ, gbara otu afọ, maka aja nsure ọkụ na otu nwa nne atụrụ na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ maka aja mmehie, na otu ebule ahụ zuruoke maka aja udo,
15 ndipo abwere pamodzi ndi nsembe yachakudya ndi nsembe yachakumwa ndi dengu la buledi wopanda yisiti, makeke opangidwa ndi ufa wosalala wosakaniza ndi mafuta, ndi timitanda ta buledi topakidwa mafuta.
tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ na otu nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na achịcha e ji ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ oliv mee, na achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e tere mmanụ oliv.
16 “Wansembe apereke zimenezi pamaso pa Yehova ndi kuchita nsembe ya uchimo ndi nsembe yopsereza.
“‘Onye nchụaja ahụ ga-eche ihe aja ndị a niile nʼihu Onyenwe anyị, chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ.
17 Apereke dengu la buledi wopanda yisiti ndiponso nsembe yachiyanjano kwa Yehova ya nkhosa yayimuna, pamodzi ndi chopereka cha chakudya ndi chopereka cha chakumwa.
Ọ ga-eji nwa ebule ahụ chụọ aja udo nye Onyenwe anyị, ya na nkata achịcha na-ekoghị eko ahụ. Ọ ga-achụkwa aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ.
18 “Mnaziriyo amete tsitsi limene analipereka lija pa khomo la tenti ya msonkhano. Atenge tsitsilo ndi kuliyika pa moto umene uli pansi pa nsembe yachiyanjano.
“‘Mgbe ahụ, onye ahụ doro onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị ga-akpụchapụ agịrị isi ya nke bụ ihe na-egosi ido nsọ ya. Ọ ga-eme nke a na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Emesịa, ọ ga-etinye agịrị isi ahụ ọ kpụchapụtara nʼọkụ ahụ dị nʼokpuru aja udo ahụ.
19 “Mnaziriyo atatha kumeta tsitsi analiperekalo, wansembe ayike mʼmanja mwake mwendo wa mmwamba wankhosa yayimuna umene waphikidwa ndipo atengenso keke ndi kamtanda ka buledi, zonse zopanda yisiti zomwe zili mʼdengu lija.
“‘Mgbe a kpụchasịrị onye ahụ agịrị isi ya, nke na-egosi ido nsọ ya, onye nchụaja ga-ewere ubu aka ebule ahụ e sịrị esi, otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu mbadamba achịcha na-ekoghị eko site na nkata ahụ, tinye ha niile nʼaka onye ahụ.
20 Wansembe aziweyule pamaso pa Yehova ngati nsembe yoweyula. Zimenezi ndi zopatulika ndipo ndi za wansembe pamodzi ndi chidale chimene anachiweyula ndi ntchafu yomwe anayipereka ija. Zitatha izi, Mnaziri akhoza kumwa vinyo.
Onye nchụaja ahụ nʼoge a, ga-ewere aja ndị a fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha niile ga-abụ ihe nsọ nye onye nchụaja ahụ, tinyere obi anụ ahụ e fufere efufe, na apata anụ ahụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ doro onwe ya nsọ nwere onwe ya ịṅụ mmanya.
21 “Ili ndi lamulo la Mnaziri yemwe walonjeza kudzipereka kwa Yehova podzipatula yekha kuphatikiza pa zomwe angathe kukwaniritsa. Ayenera kukwaniritsa lonjezo lomwe wachitalo potsata lamulo la Mnaziri.”
“‘Nke a bụ iwu dịrị onye ọ bụla kpebiri ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait. Onyinye onye ahụ ga-enye ga-abụ dịka nkwa ido nsọ ya si dị, tinyere ihe ndị ọzọ ha nwere ike inye. Onye dị otu a aghaghị imezu nkwa ọbụla o kwere dịka iwu metụtara onye Nazirait si dị.’”
22 Yehova anawuza Mose kuti,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
23 “Uza Aaroni ndi ana ake aamuna kuti, ‘Umu ndi mmene muzidalitsira Aisraeli. Muzinena kuti,
“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha,
24 “‘Yehova akudalitse ndi kukusunga;
“‘“Onyenwe anyị gọzie unu ma chebe unu,
25 Yehova awalitse nkhope yake pa iwe, nakuchitira chisomo;
Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu, ma meere unu amara,
26 Yehova akweze nkhope yake pa iwe, nakupatse mtendere.’”
Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ, nyekwa unu udo.”’
27 Choncho akadzatchula dzina langa podalitsa Aisraeli, Ine ndidzawadalitsadi.
“Otu a ka ha ga-esi kwupụta aha m nye ụmụ Izrel. Mụ onwe m ga-agọzikwa ha.”

< Numeri 6 >