< Numeri 35 >

1 Ku zigwa za Mowabu pafupi ndi Yorodani ku Yeriko, Yehova anawuza Mose kuti,
Nʼoge a, mgbe ndị Izrel ka nọ nʼakụkụ osimiri Jọdan nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu Jeriko, ka Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 “Lamula Aisraeli kuti apereke kwa Alevi midzi yoti azikhalamo kuchokera pa cholowa chomwe adzalandira. Muwapatsenso malo oweteramo ziweto kuzungulira midziyo.
“Nye ndị Izrel iwu ka ha nye ndị Livayị ụfọdụ obodo ebe ha ga-ebi. Obodo ndị a ga-abụ ndị si nʼihe nketa ndị Izrel ketara. Nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ na-akpa nri, nke ga-agba obodo ndị a gburugburu.
3 Midziyo idzakhala yawo ndipo azidzakhala mʼmenemo. Malo a msipu adzakhala a ngʼombe, nkhosa ndi zoweta zawo zina zonse.
Obodo ndị a ga-abụrụ ha ebe obibi, ma ala niile gbara ha gburugburu ga-abụ ebe ịta nri nke igwe ehi na atụrụ, na anụ ụlọ ha niile.
4 “Malo a msipu a mudziwo amene mudzawapatse Aleviwo, adzayambire ku khoma la mudzi ndipo adzatuluke kunja mamita 450, kuzungulira mudziwo.
“Ala ebe ịta nri nke obodo niile nke unu ga-enye ndị Livayị ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼogologo site na mgbidi obodo ga gburugburu mgbidi obodo ọbụla.
5 Kunja kwa mudzi yezani mamita 900 kummawa, mamita 900 kumpoto ndipo mudziwo ukhale pakati. Adzakhala ndi dera limeneli ngati malo a midziyo, owetera ziweto zawo.
Ya mere nʼobodo ndị Livayị ọbụla, ala ịzụ anụ ụlọ ga-adị narị mita anọ na ọkara site na mgbidi ha ruo nʼoke ala ha. Ọ ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ugwu, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ndịda. Obodo ha ga-adịkwa nʼetiti ala ịzụ anụ ụlọ ndị a.
6 “Isanu ndi umodzi mwa midzi imene mudzapereke kwa Alevi idzakhala mizinda yopulumukirako, kumene munthu wopha mnzake adzathawireko. Ndipo mudzawapatsenso midzi ina 42.
“Obodo isii nʼime obodo ndị ahụ unu na-enye ndị Livayị ga-abụ obodo mgbaba, ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama nwere ike gbaga izere ndụ ya. Tinyere obodo ndị a unu ga-enyekwasị ha iri obodo anọ na abụọ ọzọ.
7 Midzi yonse imene mudzapereke kwa Alevi idzakhale 48, pamodzi ndi malo oweterako ziweto.
Ya mere obodo niile a ga-enye ndị Livayị ga-adị iri obodo anọ na asatọ, tinyere obosara ala ịzụ igwe ewu na atụrụ nke gbara obodo ndị a gburugburu.
8 Pamene mukupatula midzi imeneyi pa cholowa cha Aisraeli, muchotsepo midzi yambiri pa mafuko aakulu, ndipo midzi pangʼono pa mafuko aangʼono. Fuko lililonse lidzapereka kwa Alevi molingana ndi kukula kwa cholowa chimene lalandira.”
Obodo unu na-enye ndị Livayị site nʼihe nketa ndị Izrel ga-abụ dịka unu si keta oke unu. A ga-esite nʼaka ebo nwere ọtụtụ obodo wepụta ọtụtụ obodo, ma site nʼaka ebo obodo ha nwere na-ehighị nne wepụta ole na ole.”
9 Ndipo Yehova anawuza Mose kuti,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
10 “Yankhula ndi Aisraeli kuti, ‘Pamene muwoloka Yorodani kulowa mu Kanaani,
“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan,
11 sankhani midzi ina kuti ikhale mizinda yanu yopulumukirako, kumene munthu wopha munthu wina mwangozi angathawireko.
họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama.
12 Adzakhala malo obisalako pothawa munthu wofuna kulipsira, kuti munthu wopha mnzake mwangozi asaphedwe mpaka akayime pamaso pa gulu la anthu kuti akaweruzidwe.
Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ, ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ.
13 Midzi isanu ndi umodzi imene muyiperekeyi idzakhala mizinda yopulumukirako.
Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba.
14 Mupereke itatu mbali ino ya Yorodani ndi itatu ina mu Kanaani kuti ikhale mizinda yopulumukirako.
Họpụta obodo mgbaba atọ nʼakụkụ ọzọ nke Jọdan. Ka atọ ndị ọzọ dịrị na Kenan.
15 Midzi isanu ndi umodzi idzakhala malo opulumukirako Aisraeli, alendo ndi anthu ena onse okhala pakati pawo kuti wina aliyense wopha mnzake mwangozi adzathawireko.
Obodo ndị a agaghị abụ ebe izere ndụ maka naanị ndị Izrel, kama ọ dịkwara ndị ọbịa na ndị ọzọ bi nʼetiti unu, ka onye na-akpachaghị anya gbuo mmadụ gbaga ebe ahụ izere ndụ ya.
16 “‘Ngati munthu amenya mnzake ndi chitsulo, munthuyo nʼkufa, ndiye kuti iyeyo ndi wakupha ndipo wakuphayo aphedwe.
“‘Ọ bụrụ na mmadụ e jiri mkpirisi igwe tigbuo mmadụ ibe ya, a ga-agụ onye dị otu a dịka ogbu mmadụ. A ga-egbukwa ya.
17 Kapenanso ngati wina wake ali ndi mwala mʼdzanja mwake womwe ungaphe munthu, ndipo agenda nawo wina, munthu winayo nʼkufa, ndiye kuti iyeyo ndi wakupha ndipo wakuphayo adzayenera kuphedwa.
A sịkwa na mmadụ ejide nʼaka ya nkume nke o nwere ike iji tugbuo mmadụ, ọ bụrụ na ọ tụọ mmadụ nkume ahụ tugbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. Ogbu mmadụ ahụ aghakwaghị ịnwụ.
18 Kapenanso ngati wina ali ndi chibonga mʼdzanja mwake choti nʼkupha nacho munthu, namenya nacho munthu, munthuyo nʼkufa, ndiye kuti iyeyo ndi wakupha, wakuphayo ayenera kuphedwa.
A sikwa na mmadụ ji ihe e ji osisi tụọ nʼaka ya, nke o nwere ike i ji tigbuo mmadụ, ọ bụrụ na o tie mmadụ ihe osisi ahụ, tigbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. A ghaghị ime ka ogbu mmadụ ahụ nwụọ.
19 Wolipsira adzamuphanso wakuphayo. Pamene akumana naye adzayenera kumupha ndithu.
Onye na-abọ ọbọ ọbara ga-egbu ogbu mmadụ ahụ nʼonwe ya mgbe ọbụla o zutere ya.
20 Ndipo ngati wina wake, chifukwa cha udani, aganiza zokankha munthu wina kapena kumuponyera chinthu china mwadala munthuyo nʼkufa,
Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼekworo nuo onye ọzọ aka, maọbụ kpachara anya tụọ onye ahụ ihe nke mere ka ọ nwụọ,
21 kapena ngati, chifukwa cha udani, amenya mnzake ndi nkhonya, mnzakeyo ndi kufa, munthuyo ayenera kuphedwa. Iyeyo ndi wakupha. Wolipsira adzamuphe wakuphayo pamene akumana naye.
maọbụ na o sitere nʼobi ọnụma jiri aka ya tie mmadụ ihe nke mere ka ọ nwụọ, a ga-egbu onye ahụ, nʼihi na ogbu mmadụ ka ọ bụ. Onye na-agwachite ọchụ ga-egbu ogbu mmadụ ahụ mgbe ọbụla o zutere ya.
22 “‘Koma ngati popanda udani wina uliwonse, mwadzidzidzi akankha wina kapena kumuponyera chinthu osati mwadala,
“‘Ma ọ bụrụ na mmadụ ebughị iro nʼobi nutuo mmadụ ibe ya na mberede, maọbụ tụọ ya ihe,
23 kapena mosamuona nʼkumuponyera mwala womwe utha kumupha, munthuyo nʼkufa, tsono pakuti sanali mdani wake ndipo sanaganizire zomupweteka,
maọbụ tụtuo nkume nke datara dagbuo mmadụ ibe ya mgbe ọ na-ahụghị ya, bụ onye na-abụghị onye iro ya, onye ọ na-ebughị nʼobi imejọ,
24 gulu liweruze pakati pa iye ndi wolipsira monga mwa malamulo ake.
mgbe ahụ, ndị ọgbakọ ga-ekpe ikpe nʼetiti onye e boro ebubo na onye na-agwachite ọchụ dịka usoro iwu ndị a si dị.
25 Gulu lidzapulumutsa munthu wakuphayo mʼmanja mwa wolipsira uja ndi kumubwezera ku mzinda wopulumukirako kumene anathawira. Ayenera kukhala kumeneko kufikira imfa ya mkulu wa ansembe, amene anadzozedwa ndi mafuta oyera.
Nzukọ aghaghị ichekwa onye e boro ebubo na o gburu mmadụ site nʼaka onye na-agwachite ọchụ, zilaga onye ahụ e boro ebubo nʼobodo mgbaba, bụ ebe ha gbalagara. Onye ahụ e boro ebubo ga-anọgide nʼobodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ, bụ onye ahụ e tere mmanụ nsọ.
26 “‘Koma ngati wolakwayo atuluka kunja kwa malire a mzinda wopulumukirako kumene anathawira
“‘Ma ọ bụrụ na ogbu mmadụ a ahapụ obodo mgbaba ahụ pụọ, ọ bụrụkwa,
27 ndipo wobwezera choyipa nʼkumupeza kunja kwa mzindawo, wolipsirayo atha kumupha wolakwayo popanda kugamula mlandu wakupha.
na onye ahụ na-abọ ọbọ ọbara achọta ya nʼazụ obodo mgbaba ahụ, o nwere ike igbu onye ahụ e boro ebubo, ikpe igbu mmadụ agaghị ama ya.
28 Wolakwayo ayenera kukhala mu mzinda wopulumukiramowo mpaka imfa ya mkulu wa ansembe ndipo pamenepo atha kubwerera kwawo. Pokhapokha atafa mkulu wa ansembe ndi pamene angathe kubwerera ku malo ake.
Onye ahụ e boro ebubo na o gburu mmadụ aghaghị ịnọ nʼime obodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ. Ọ bụ naanị mgbe onyeisi nchụaja nwụchara, ka ha nwere ike ịlaghachi nʼụlọ ya, nʼihe nketa ya.
29 “‘Amenewa akhale malamulo ndi malangizo kwa inu nthawi zonse ndi ku mibado ya mʼtsogolo, kulikonse kumene mudzakhalako.
“‘Ndị a bụ usoro iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ, nʼebe obibi unu niile.
30 “‘Aliyense wopha munthu ayeneranso kuphedwa ngati pali umboni okwanira. Koma wina asaphedwe ngati pali mboni imodzi yokha.
“‘Onye ọbụla gburu mmadụ ga-anwụ. A ga-ama ya ikpe ọnwụ naanị mgbe e nwere karịa otu onye akaebe. Ọ dịghị onye ọbụla a ga-egbu nʼihi akaebe nke otu onye gbara megide ya.
31 “‘Osalola kulandira dipo lowombolera munthu wakupha yemwe ayenera kuphedwa. Wakupha ayenera kuphedwa.
“‘Unu a narakwala ihe ịgbara isi nʼọnọdụ ndụ nke onye gburu mmadụ, bụ onye nke ikpe ọnwụ mara. Aghaghị ime ka ha nwụọ.
32 “‘Simuyeneranso kulandira dipo kwa munthu amene wathawira ku mzinda wopulumikirako kuti wothawayo abwerere kwawo, pokhapokha ngati mkulu wa ansembe wamwalira.
“‘Unu a narakwala ihe mgbapụta site nʼaka onye ọbụla nke gbagara nʼobodo mgbaba, site otu a kwere ka ha lọghachite azụ ga biri nʼala nke aka ha tupu onyeisi nchụaja anwụọ.
33 “‘Musayipitse dziko limene mukukhalamolo. Magazi amayipitsa dziko ndipo nʼkosatheka kulipirira dziko chifukwa cha magazi amene akhetsedwa mʼmenemo, kupatula pokhetsa magazi a munthu amene anakhetsa magaziyo.
“‘Unu emerụkwala ala ahụ nke unu bi nʼime ya. Ọbara igbu ọchụ na-emerụ ala. Ọ dịkwaghị mkpuchi mmehie a ga-eme banyere ala a wufuru ọbara nʼime ya, ma ọ bụghị naanị ọbara nke onye ahụ gburu ọchụ ahụ.
34 Choncho musadetse dziko limene mukukhalamo, dziko limene Inenso ndimakhalamo, pakuti Ine Yehova, ndimakhala pakati pa Aisraeli.’”
Unu emerụla ala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya. Nʼihi na mụ onwe m bikwa nʼebe ahụ, mụ bụ Onyenwe anyị bi nʼetiti ụmụ Izrel.’”

< Numeri 35 >