< Numeri 10 >

1 Yehova anawuza Mose kuti,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
2 “Sula malipenga awiri a siliva, ndipo uziwagwiritsa ntchito posonkhanitsa anthu pamodzi ndiponso powasamutsa mʼmisasa.
“Kpụọ opi ọlaọcha abụọ, jiri ha na-akpọ mkpọkọta nzukọ ụmụ Izrel na ime ka ha mara mgbe mbuli ije nke ọmụma ụlọ ikwu ruru.
3 Pamene akuliza malipenga onse awiri, anthu onse asonkhane kwa iwe pa khomo la tenti ya msonkhano.
Mgbe a fụrụ opi abụọ ahụ, nzukọ Izrel niile ga-ezukọta nʼihu gị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
4 Akaliza limodzi lokha, atsogoleri, akulu a mafuko a Aisraeli, asonkhane kwa iwe.
Ma ọ bụrụ naanị otu opi ka a fụrụ, ọ bụ ndị ndu, ndịisi ikwu Izrel niile ga-ezukọta bịakwute gị.
5 Akaliza lipenga lochenjeza, misasa yomwe ili kummawa iyambe kusamuka.
Otu ụda opi ike ga-egosi na ebo Izrel niile mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebuli ije.
6 Akaliza lipenga lochenjeza lachiwiri, misasa yakummwera iyambe kusamuka. Kuliza kwa lipenga lochenjeza kudzakhala chizindikiro choyamba ulendo.
Opi ike ahụ daa ụda nke ugboro abụọ, ọ na-egosi na ndị mara ụlọ ikwu ha na ndịda ga-ebuli ije. Ịda ụda nke opi ike bụ ihe e ji amata na oge ibuli ije eruola.
7 Pofuna kusonkhanitsa anthu, muziliza malipenga, koma mosiyana ndi mmene malipenga ochenjeza amalizidwira.
Mgbe a ga-akpọkọta ndị Izrel niile a ga-egbu opi, kama ụda ya ga-adị iche.
8 “Ana a Aaroni, ansembe aja, ndiwo aziliza malipengawo. Zimenezi zikhale zokhazikika kwa inu ndi ku mibado yanu yonse.
“Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile.
9 Pamene mukupita ku nkhondo mʼdziko lanu lomwe, kulimbana ndi mdani amene akukuzunzani, muziliza malipenga ochenjeza ndipo Yehova Mulungu wanu adzakukumbukirani ndi kukulanditsani mʼmanja mwa adani anu.
Mgbe unu gara ibu agha nʼala unu imegide onye iro na-akpagbu unu, fụọnụ opi ike. Nke a ga-eme ka Onyenwe anyị Chineke unu cheta unu, ma napụta unu site nʼaka ndị iro unu.
10 Komanso pa nthawi yanu ya chisangalalo, pa maphwando anu oyikika ndi maphwando a mwezi watsopano, muziliza malipenga pa nsembe zanu zopsereza ndi nsembe zanu za chiyanjano, ndipo zidzakhala chikumbutso chanu pamaso pa Mulungu. Ine ndine Yehova Mulungu wanu.”
Unu ga-egbukwa opi ndị a nʼoge aṅụrị, nʼoge mmemme unu a kara aka, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ niile. Gbukwaanụ opi mgbe unu na-achụ aja nsure ọkụ unu, na aja udo unu niile. Ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta unu nʼihu Chineke unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”
11 Pa chaka chachiwiri, mwezi wachiwiri, tsiku la 20, mtambo unachoka pamwamba pa chihema cha umboni.
Nʼụbọchị iri abụọ, nʼime ọnwa nke abụọ, nʼafọ nke abụọ, igwe ojii ahụ biliri site nʼelu ụlọ nzute nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
12 Ndipo Aisraeli ananyamuka kuchoka mʼchipululu cha Sinai ndipo anayenda malo osiyanasiyana mpaka pamene mtambo unayima mʼchipululu cha Parani.
Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran.
13 Kameneka kanali koyamba kuti Aisraeli anyamuke monga momwe Yehova analamulira Mose.
Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka Onyenwe anyị si nye Mosis iwu banyere ije ha.
14 Magulu a msasa wa Yuda ndiwo anayamba kunyamuka potsata mbendera yawo. Mtsogoleri wa gulu lawo anali Naasoni mwana wa Aminadabu.
Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha.
15 Mtsogoleri wa gulu la fuko la Isakara anali Netanieli mwana wa Zuwara,
Netanel nwa Zua bụ onyendu usuu ebo Isaka.
16 Eliabu mwana wa Heloni ndiye anali mtsogoleri wa fuko la Zebuloni.
Eliab nwa Helọn bụ onyendu usuu ebo Zebụlọn
17 Kenaka anagwetsa chihema, ndipo Ageresoni ndi Amerari amene ananyamula chihemacho, ananyamuka.
Mgbe ahụ, e wedara ụlọ nzute ahụ. Ụmụ Geshọn na Merari buru ya, bilikwaa ije ha.
18 Kenaka magulu a msasa wa fuko la Rubeni ananyamuka potsatira mbendera yawo. Mtsogoleri wawo anali Elizuri mwana wa Sedeuri.
Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ruben biliri ije, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elizọ nwa Shedeua bụ onyendu ha.
19 Mtsogoleri wa fuko la Simeoni anali Selumieli mwana wa Zurisadai,
Shelumiel nwa Zurishadai bụ onyendu usuu ebo Simiọn.
20 ndipo Eliyasafu mwana wa Deuweli ndiye ankatsogolera fuko la Gadi.
Eliasaf nwa Deuel bụ onyendu usuu ebo Gad.
21 Kenaka Akohati ananyamuka atanyamula zinthu zopatulika. Chihema chinkayenera kuyimikidwa iwo asanafike.
Mgbe ahụ, ụmụ Kohat ndị bu ihe nsọ ndị ahụ niile, biliri ije ha. Tutu ha erute, e guzobere ụlọ nzute ahụ nʼebe o kwesiri ịdị.
22 Magulu a msasa wa Aefereimu anatsatira potsatira mbendera yawo. Elisama mwana wa Amihudi ndiye anali mtsogoleri wawo.
Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ifrem biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elishama nwa Amihud bụ onyendu ha.
23 Gamalieli mwana wa Pedazuri ndiye anali mtsogoleri wa fuko la Manase.
Gamaliel nwa Pedazo bụ onyendu usuu ebo Manase.
24 Abidani mwana wa Gideoni ndiye anali mtsogoleri wa mtundu wa Benjamini.
Abidan nwa Gidiọni bụ onyendu usuu ebo Benjamin.
25 Pambuyo pa magulu onse panali magulu a msasa wa Dani, omwe ankateteza magulu onsewa ndipo ananyamuka potsatira mbendera yawo. Mtsogoleri wawo anali Ahiyezeri mwana wa Amisadai.
Na ngwụsị usoro ahụ, usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Dan biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai.
26 Pagieli mwana wa Okirani ndiye anali mtsogoleri wa fuko la Aseri,
Pagịel nwa Okran bụ onyendu usuu ebo Asha.
27 ndipo mtsogoleri wa mtundu wa Nafutali anali Ahira mwana wa Enani.
Ahira nwa Enan bụ onyendu usuu ebo Naftalị.
28 Umenewu ndiwo unali mndandanda wa kayendedwe ka magulu a Aisraeli pamene ankanyamuka ulendo wawo mʼmagulumagulu.
Nke a bụ usoro usuu ụmụ Izrel si bilie ije ha.
29 Ndipo Mose anawuza Hobabu mwana wa Reueli Mmidiyani, mpongozi wa Mose kuti, “Tikunyamuka kupita ku malo amene Yehova anati, ‘Ndidzakupatsani.’ Tiye upite nafe ndipo tidzakusamalira bwino, pakuti Yehova analonjeza zinthu zabwino kwa Israeli.”
Mosis gwara Hobab nwa Reuel, nna nwunye ya onye Midia okwu sị, “Anyị ebiliela ije ịga ebe ahụ Onyenwe anyị gwara anyị sị, ‘Aga m enye unu.’ Bịa ka ị soro anyị. Anyị ga-emezi gị nke ọma nʼihi na Onyenwe anyị ekwela Izrel nkwa ọtụtụ ezi ihe.”
30 Hobabu anayankha kuti, “Ayi, sindipita nanu, ndibwerera ku dziko la kwathu ndi kwa abale anga.”
Ma ọ zara sị, “E e, agaghị m eso unu. Ana m alaghachi nʼala nke aka m ịlaghachikwuru ụmụnna m.”
31 Ndipo Mose anati, “Pepa usatisiye popeza ukudziwa kumene tingamange misasa mʼchipululu muno ndipo udzakhala maso athu.
Ma Mosis zara sị ya, “Biko ahapụla anyị nʼihi na ị maara ebe anyị nwere ike kwụsị zuo ike nʼọzara. Ị ga-abụrụ anyị anya anyị ji ahụ ụzọ.
32 Iweyo ukapita nafe, tidzagawana nawe zinthu zabwino zomwe Yehova adzatipatsa.”
Ọ bụrụ na i soro anyị, anyị ga-ekenye gị ihe ọma ọbụla Onyenwe anyị ga-enye anyị.”
33 Motero ananyamuka ku Phiri la Yehova nayenda ulendo wa masiku atatu. Bokosi la Chipangano cha Yehova linkayenda patsogolo pawo pa masiku atatuwo kuti apeze malo woti apumulepo.
Ya mere ha sitere nʼugwu Onyenwe anyị bilie ije. Jeekwa ije abalị atọ. Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-aga ha nʼihu ụbọchị atọ ndị ahụ niile ịchọtara ha ebe ha ga-akwụsị zuo ike.
34 Mtambo wa Yehova unkawaphimba masana pamene ankasamuka pa misasa yawo.
Igwe ojii Onyenwe anyị dị nʼelu ha nʼehihie mgbe ha si nʼọmụma ụlọ ikwu ha bilie ije.
35 Nthawi iliyonse imene Bokosi la Chipangano likunyamuka, Mose ankanena kuti, “Dzukani, Inu Yehova! Adani anu abalalike; Odana nanu athawe pamaso panu.
Mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ ahụ biliri ije, Mosis na-ekwu sị, “Bilie O Onyenwe anyị, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro gị niile site nʼihu gị gbalaga.”
36 “Pamene likupumula, ankanena kuti, “Bwererani, Inu Yehova, ku chinamtindi cha Aisraeli.”
Ma mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ bịara ebe izuike, Mosis na-ekwukwa sị, “Lọghachi O Onyenwe anyị, bịakwute ọtụtụ mmadụ ndị a, bụ imerime puku ndị Izrel.”

< Numeri 10 >