< Levitiko 11 >

1 Yehova anayankhula ndi Mose ndi Aaroni kuti,
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn, sị,
2 “Awuze Aisraeli kuti, ‘Nyama zomwe mukhoza kudya mwa nyama zonse za dziko lapansi ndi izi:
“Gwanụ ụmụ Izrel, sị, ‘Nʼime anụmanụ niile dị nʼụwa, ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri.
3 Nyama iliyonse imene ili ndi chipondero chogawikana pakati ndi yobzikula mukhoza kudya.
Unu nwere ike iri anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa. nke na-atagharị ọnụ.
4 “‘Koma pali nyama zina zimene zimabzikula kokha kapena ndi zogawikana zipondero zimene simukuyenera kudya. Nyama zimenezi ndi ngamira, ngakhale imabzikula ilibe zipondero zogawikana. Choncho ndi yodetsedwa, musadye.
“‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha.
5 Ina ndi mbira, ngakhale imabzikula, zipondero zake nʼzosagawikana. Choncho ndi yodetsedwa, musadye.
Ewi: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
6 Inanso ndi kalulu, ngakhale amabzikula, zipondero zake nʼzosagawikana. Choncho ndi wodetsedwa, musadye.
Ewi nkume: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
7 Nkhumba simabzikula ngakhale ili ndi zipondero zogawikana. Choncho ndi yodetsedwa, musadye.
Ezi: Ọ bụ nʼezie na ụkwụ ya wara njakpa ma ọ dịghị atagharị nri ya. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
8 Musamadye nyama yake kapena kukhudza imene yafa chifukwa ndi yodetsedwa.
Unu emetụkwala ozu ha aka maọbụ rie anụ ha, nʼihi na ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
9 “‘Mwa zamoyo zonse zimene zimakhala mʼmadzi a mʼnyanja ndi a mʼmitsinje mukhoza kudya chilichonse chimene chili ndi minga ya pa msana ndi mamba.
“‘Nʼime ihe niile e kere eke dị ndụ biri na mmiri, maọbụ nʼiyi nta na nʼoke osimiri, unu nwere ike iri ụdị ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha.
10 Koma zamoyo zonse za mʼnyanja kapena za mʼmitsinje zimene zilibe minga ya pa msana ndi mamba, kaya ndi tizirombo tonse ta mʼmadzi ndi zamoyo zonse zopezeka mʼmenemo ndi zodetsedwa kwa inu.
Ma unu ekwesighị iri ihe ọbụla nke na-enweghị ntu maọbụ akpịrịkpa, ma ha bụ anụ na-enupụta enupụta, maọbụ na ha so nʼanụ ndị ọzọ dị ndụ bi na mmiri, unu kwesiri ịsọ ha asọ.
11 Pakuti zimenezi ndi zodetsedwa kwa inu, nyama yake musadye, ndipo zikafa zikhalebe zodetsedwa kwa inu.
Ebe ha bụ ihe na-asọ oyi nye unu, unu ekwesighị iri ha, unu ga-agụkwa ozu ha ka ihe na-adịghị ọcha.
12 Chamoyo chilichonse cha mʼmadzi chimene chilibe minga ya pa msana kapena mamba ndi chodetsedwa kwa inu.
Ihe ọbụla bi nʼime mmiri nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha, bụ nke unu ga-asọ asọ.
13 “‘Mbalame zimene simukuyenera kudya chifukwa ndi zodetsedwa ndi izi: mphungu, nkhwazi, mwimba,
“‘Ndị a bụ nnụnụ ndị unu ga-asọ asọ, nke unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha bụ ihe arụ a na-asọ oyi: ugo, udele na udele ojii,
14 nankapakapa, akamtema a mitundu yonse,
ndagbụ na ọgankwọ dị iche iche,
15 akhungubwi a mitundu yonse,
ugolọma ọbụla dị iche iche,
16 kadzidzi wamphondo, kadzidzi wodzuma, chipudo ndi mtundu uliwonse wa akabawi
enyi nnụnụ, egbe abalị, nnụnụ oke osimiri na egbe dị iche iche,
17 kadzidzi wamngʼono, chiswankhono ndi mantchichi,
okwukwu nta, komorant na okwukwu ukwu,
18 tsekwe, vuwo, dembo,
okwukwu nwere mpi, okwolo na udele,
19 indwa, zimeza za mitundu yonse, nsadzu ndi mleme.
ụgbala, utù dị iche iche, nnụnụ ọdụ nta na ụsụ.
20 “‘Zowuluka zonse za miyendo inayi ndi zodetsedwa.
“‘Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ bụ ihe rụrụ arụ nye unu, unu agaghị eri ya.
21 Komabe mwa zowuluka zokhala ndi miyendo inayi zimene mukhoza kudya ndi zokhazo zimene zili ndi miyendo yolumphira.
Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala,
22 Pa zimenezo mungathe kudya izi: dzombe la mitundu yonse, atsokonombwe a mitundu yonse, nkhululu za mitundu yonse, ndi ziwala za mitundu yonse.
ndị a ka unu ga-eri nʼetiti ha, igurube dị iche iche, na akpankwụ dị iche iche, na abụzụ dị iche iche, na ụkpana dị iche iche.
23 Koma za mapiko zina zonse zokhala ndi miyendo inayi muzitenge kukhala zodetsedwa kwa inu.
Ahụhụ ndị ọzọ niile na-efe efe, ndị nwere ụkwụ anọ, bụ ihe rụrụ arụ. Unu ekwesighị iri ha.
24 “‘Zimenezi zidzakudetsani. Aliyense wozikhudza zitafa adzakhala wodetsedwa mpaka madzulo.
“‘Iri ha ga-eme ka unu rụọ arụọ. Onye ọbụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ site nʼoge o bitụrụ ha aka tutu ruo nʼabalị nke ụbọchị ahụ.
25 Aliyense wonyamula chiwalo chilichonse cha nyama zakufazo ayenera kuchapa zovala zake, ndipo adzakhala wodetsedwa mpaka madzulo.
Onye ọbụla metụrụ otu nʼime ozu ha aka ga-asakwa uwe ya, gụọkwa onwe ya dịka onye na-adịghị ọcha ruo uhuruchi.
26 “‘Nyama iliyonse imene ili ndi ziboda zogawikana koma mapazi ake wosagawikana, kapena imene sibzikula muyiyese yodetsedwa kwa inu ndipo munthu aliyense akakhudza nyama yakufayo, adzakhala wodetsedwa.
“‘Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya na-awasaghị abụọ, maọbụ nke na-adịghị atagharị nri ya ugboro abụọ, rụrụ arụ. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
27 Mwa nyama zonse zoyenda ndi miyendo inayi, nyama zonse zokhala ndi zikhadabo kuphazi muzitenge kukhala zodetsedwa ndipo aliyense wozikhudza zitafa adzakhala wodetsedwa mpaka madzulo.
Nʼime anụmanụ niile na-aga ije nʼụkwụ anọ, anụmanụ ọbụla na-aga ije nʼọbụaka ya rụrụ arụ, unu agaghị eri ya. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
28 Aliyense wonyamula nyamazi zitafa ayenera kuchapa zovala zake, ndipo adzakhala wodetsedwa mpaka madzulo. Zimenezi ndi zodetsedwa kwa inu.
Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ.
29 “‘Mwa nyama zokwawa, zimene zili zodetsedwa kwa inu ndi izi: likongwe, mbewa, msambulu za mitundu yonse,
“‘Nʼime anụmanụ niile na-enupụta enupụta nʼala, anụmanụ ndị a bụ ndị rụrụ arụ: nkapi, na oke, na agụ iyi dịka ụdị ha si dị,
30 gondwa, mngʼazi, buluzi, dududu ndi nanzikambe.
na ọba mmiri, na ngwere aghụ, na ngwere, na ngwere uzuzu, na ogumagala.
31 Mwa nyama zonse zoyenda pansi, zimenezi ndi zodetsedwa kwa inu. Munthu aliyense wozikhudza zitafa adzakhala wodetsedwa mpaka madzulo.
Nʼime ihe niile na-enupụta enupụta nʼala ndị a rụrụ arụ nʼebe unu nọ. Onye metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ tutu ruo uhuruchi ụbọchị ahụ.
32 Iliyonse mwa nyama zimenezi ikafa ndi kugwera pa chiwiya chilichonse, kaya chimagwira ntchito yotani, kaya ndi chopangidwa ndi mtengo, kaya ndi cha nsalu, kaya ndi cha chikopa kapena chiguduli chiwiyacho chidzakhala chodetsedwa. Muchiviyike mʼmadzi chiwiyacho komabe chidzakhala chodetsedwa mpaka madzulo, ndipo kenaka chidzakhala choyeretsedwa.
Ihe ọbụla nke ozu ha dakwasịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ, maọbụ osisi, maọbụ akwa, maọbụ akpụkpọ a na-akwa nʼala, maọbụ akpa, ihe ọbụla nke eji ya eme. A ga-etinye ya na mmiri, ọ ga-adịgide nʼime mmiri tutu ruo uhuruchi, mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha.
33 Tsono nyama ina iliyonse mwa zimenezi ikagwera mʼmbiya ya dothi, ndiye kuti chilichonse cha mʼmbiyamo chidzakhala chodetsedwa, ndipo muyenera kuswa mbiyayo.
Ọ bụrụ na otu nʼime ihe ndị a adanye nʼite aja, a ga-etiwa ite ahụ. Ihe niile dị nʼite ahụ abụrụla ihe rụrụ arụ.
34 Chakudya chilichonse chimene mungadye chikakhala kuti chathiridwa mʼmbiyamo, ndiye kuti chakudyacho chidzakhala chodetsedwa, ndipo madzi akumwa wochokera mʼmbiya zotere ndi wodetsedwa.
Ihe oriri ọbụla nke mmiri si nʼite a metụrụ abụrụla ihe rụrụ arụ. Mmiri ọṅụṅụ ọbụla dị nʼime ite ahụ rụkwara arụ.
35 Chiwalo chilichonse cha nyama yakufa chikagwera pa chinthu chilichonse kaya pa uvuni, kapena pa mʼphika, ndiye kuti zinthuzo zidzakhala zodetsedwa, ndipo ziphwanyidwe popeza ndi zodetsedwa.
Ihe ọbụla ozu anụmanụ dị otu a dakwasịrị, maọbụ ite ọkụ eji eghe ihe, maọbụ ekwu a ga-etiwa ha. Nʼihi na ha bụ ihe rụrụ arụ, unu ga-agụ ha dịka ihe rụrụ arụ.
36 Koma kasupe kapena chitsime chamadzi chidzakhala choyeretsedwa ngakhale kuti chilichonse chokhudza nyama yakufayo chidzakhala chodetsedwa. Zimenezi muzitenge kukhala zodetsedwa.
Ọ bụrụkwa na ozu anụmanụ ahụ adaba nʼisi iyi, maọbụ nʼolulu mmiri, mmiri ahụ ga-adị ọcha, kama onye ga-emetụ anụ ahụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
37 Chiwalo chilichonse cha nyama yakufayo chikagwera pa mbewu zimene akuti adzale, mbewu zimenezo zidzakhalabe zabwino.
Ọ bụrụ na ozu anụ ahụ adakwasị mkpụrụ ubi a na-aga ịkụ nʼubi, ọ gaghị emerụ ha.
38 Koma mbewuzo zikakhala zonyowa ndi madzi, ndipo chiwalo chilichonse cha nyama zakufazo chikagwera pa mbewuzo, mbewuzo zikhale zodetsedwa kwa inu.
Ma ọ bụrụ na e tinyere mmiri nʼelu mkpụrụ ọghịgha ndị ahụ, ozu adakwasị nʼelu ya, ha ga-abụ ihe rụrụ arụ.
39 “‘Ngati nyama imene mumaloledwa kudya yafa yokha, ndiye kuti aliyense wokhudza nyama yakufayo adzakhala wodetsedwa mpaka madzulo.
“‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu kwesiri iri eri anwụọ, onye ahụ metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
40 Aliyense amene adyako nyama yakufayo achape zovala zake, ndipo adzakhala wodetsedwa mpaka madzulo. Aliyense amene wanyamula nyama yakufayo ayenera kuchapa zovala zake, ndipo adzakhala wodetsedwa mpaka madzulo.
Onye ọbụla riri ozu anụ ahụ, maọbụ bufuo ozu ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya mmiri.
41 “‘Chinthu chilichonse chokwawa pansi ndi chonyansa, simuyenera kudya.
“‘Anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala bụ ihe rụrụ arụ nye unu. Unu erikwala ha.
42 Musadye chilichonse chokwawa pansi, choyenda chamimba kapena choyenda ndi miyendo inayi kapenanso yambiri popeza ndi chodetsedwa.
Unu agaghị eri anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala, ma ha na-akpụgharị nʼafọ ha, ma ha na-agagharị nʼụkwụ anọ, ma ha nwere ụkwụ dị ọtụtụ. Ha bụ ihe rụrụ arụ.
43 Musadzisandutse nokha odetsedwa ndi chokwawa chilichonse. Musadziyipitse nazo, kuti mukhale odetsedwa.
Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala. Unu abụla ndị na-emerụ onwe unu site nʼanụmanụ ndị a, maọbụ mee ka unu bụrụ ndị e merụrụ site na ha.
44 Ine ndine Yehova Mulungu wanu, choncho dziyeretseni kuti mukhale woyera, chifukwa Ine ndine woyera. Musadzisandutse odetsedwa ndi chokwawa chilichonse.
Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na adị m nsọ. Unu emerụla onwe unu site nʼimetụ anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala aka.
45 Ine ndine Yehova amene ndinakutulutsani ku Igupto kuti ndikhale Mulungu wanu. Tsono mukhale woyera, chifukwa Ine ndine woyera.
Abụ m Onyenwe anyị, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu, ka m bụrụ Chineke unu. Unu aghaghị ịdị nsọ, nʼihi na adị m nsọ.
46 “‘Amenewa ndi malamulo onena za nyama, mbalame, chamoyo chilichonse choyenda mʼmadzi ndiponso chamoyo chilichonse chokwawa.
“‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara ụmụ anụmanụ, na anụ ufe, na anụ bi na mmiri, na anụ ndị na-arịgharị arịgharị nʼala.
47 Muzisiyanitsa pakati pa chodetsedwa ndi choyeretsedwa, komanso pakati pa zomwe mutha kudya ndi zomwe simuyenera kudya.’”
Ka unu si otu a kpaa oke nʼetiti ndị rụrụ arụ na ndị dị ọcha, nʼetiti ihe e kere eke dị ndụ ndị unu nwere ike iri nʼihi na ha dị ọcha, na ndị unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha rụrụ arụ.’”

< Levitiko 11 >