< Oweruza 4 >

1 Ehudi atamwalira, Aisraeli anachitanso zinthu zoyipira Yehova.
Mgbe Ehud nwụsịrị, ụmụ Izrel mekwara ihe ọjọọ megide Onyenwe anyị.
2 Choncho Yehova anawapereka mʼmanja mwa Yabini, mfumu ya ku Kanaani, imene inkalamulira ku Hazori. Mkulu wa ankhondo ake anali Sisera, amene ankakhala ku Haroseti-Hagoyimu.
Nʼihi ya, Onyenwe anyị renyere ha nʼaka Jabin, eze Kenan, onye chịrị nʼobodo Hazọ. Aha onyeisi ndị agha ya bụ Sisera, onye bi nʼobodo a na-akpọ Heroshet Hagoyim.
3 Aisraeli analira kwa Yehova kuti awathandize, chifukwa Sisera anali ndi magaleta achitsulo 900 ndipo anazunza Aisraeli mwankhanza kwa zaka makumi awiri.
Nʼihi na o nwere narị ụgbọ agha igwe itoolu, ma megbukwaa ụmụ Izrel nke ukwu iri afọ abụọ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ka o nyere ha aka.
4 Debora, mneneri wamkazi, mkazi wake wa Rapidoti ndiye ankatsogolera Israeli nthawi imeneyo.
Nʼoge a, Debọra, bụ nwanyị na-ebu amụma, nwunye Lapidọt bụ onyendu ụmụ Izrel.
5 Iye ankakhala pansi pa mtengo wa mgwalangwa wa Debora, pakati pa Rama ndi Beteli mʼdziko la ku mapiri la Efereimu, ndipo Aisraeli ankapita kwa iye kuti akaweruze milandu yawo.
Ọ na-anọ nʼokpuru osisi nkwụ a na-akpọ Nkwụ Debọra, nke dị nʼagbata Rema na Betel, bụ nʼala ugwu ugwu Ifrem na-ekpe ikpe. Nʼebe ahụ ka ụmụ Izrel na-ejekwuru ya ka o doziere ha okwu ha niile.
6 Debora uja anatuma munthu kuti akayitane Baraki mwana wa Abinoamu wa ku Kedesi mʼdziko la Nafutali ndipo anati kwa iye, “Yehova Mulungu wa Israeli akukulamula iwe kuti, ‘Pita kasonkhanitse anthu ku phiri la Tabori. Ubwere nawo anthu 10,000 a fuko la Nafutali ndi a fuko la Zebuloni.
O ziri ozi kpọọ Barak, nwa Abinoam, onye bi nʼobodo Kedesh, nke dị nʼime Naftalị, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị Chineke ụmụ Izrel na-enye gị iwu, ‘Gaa chịkọtaa puku ndị agha iri bụ ndị sitere nʼebo Naftalị na Zebụlọn, duru ha jeruo ugwu Taboa.
7 Ine ndidzakokera Sisera mkulu wa ankhondo a Yabini pamodzi ndi magaleta ake ndi asilikali ake kwa inu ku mtsinje wa Kisoni ndipo ndidzamupereka mʼmanja mwanu.’”
Aga m edute Sisera, ọchịagha ndị agha Jabin, mee ka ọ bịaruo nso iyi ukwu Kishọn, ya na ụgbọ agha ya niile na ndị agha ya niile ma nyefee ha nʼaka gị.’”
8 Baraki anamuyankha kuti, “Mukapita nane limodzi ine ndipita. Koma ngati sitipitira limodzi, inenso sindipita.”
Barak sịrị ya, “Ejikeere m ịga ma ọ bụrụ na ị ga-eso m. Ọ bụrụkwanụ na ị jụ iso m, agaghị m aga.”
9 Debora anati, “Chabwino, ine ndipita nawe limodzi. Koma mudziwe kuti inu simudzalandirapo ulemu pa zimene mwachitazi popeza Yehova wapereka Sisera mʼmanja mwa munthu wamkazi.” Choncho Debora ananyamuka kupita ku Kedesi pamodzi ndi Baraki.
Debọra sịrị, “Aghaghị m isoro gị jee ma nʼihi mkpebi gị nʼihe a, nsọpụrụ agaghị abụ nke gị, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe Sisera nʼaka nwanyị.” Ya mere, Debọra biliri soro Barak jee obodo Kedesh.
10 Baraki anayitana mafuko a Zebuloni ndi Nafutali kuti abwere ku Kedesi. Anthu 10,000 anamutsatira, ndipo Debora anapita naye pamodzi.
Barak sitere nʼebo Zebụlọn na Naftalị kpọkọtaa ndị ikom ga-eso ya jee agha ahụ, puku ndị agha iri ndị dịnyere ya. Debọra sokwa ya jee.
11 Nthawi imeneyo nʼkuti Mkeni wina dzina lake Heberi atalekana ndi Akeni anzake, zidzukulu za Hobabu, mlamu wa Mose, nakamanga tenti yake pafupi ndi mtengo wa thundu ku Zananimu pafupi ndi Kedesi.
Nʼoge a, Heba, onye Ken, ahapụla ndị Ken ndị ọzọ, ndị bụ ụmụ ụmụ Hobab, nwanne nwunye Mosis gaa maa ụlọ ikwu ya nʼokpuru osisi ukwu dị na Zaananim, nke dị nso Kedesh.
12 Pamene Sisera anamva kuti Baraki mwana wa Abinoamu wapita ku phiri la Tabori,
Mgbe ha gwara Sisera na Barak nwa Abinoam arịgorola nʼelu ugwu Taboa,
13 anasonkhanitsa magaleta ake achitsulo 900 ndi anthu onse amene anali naye ndipo anachoka ku Haroseti-Hagoyimu kupita ku mtsinje wa Kisoni.
Sisera kpọkọtara ndị agha ya niile, tinyere narị ụgbọ agha itoolu ya, site na Haroshet Haroyim gaa nʼiyi ukwu Kishọn.
14 Debora anawuza Baraki kuti, “Dzukani! Paja ndi lero limene Yehova wapereka Sisera mʼmanja mwako. Kodi Yehova sanakhale akukutsogolerani?” Choncho Baraki anatsika phiri la Tabori, anthu 10,000 akumutsata.
Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa.
15 Yehova anasokoneza Sisera ndi magaleta ake pamodzi ndi ankhondo ake onse. Baraki ndi anthu ake anawapirikitsa ndipo Sisera anatsika pa galeta yake nayamba kuthawa pansi.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jiri mma agha ya chụsaa Sisera na ndị agha ya na ụgbọ agha igwe ha nʼihu Barak. Sisera nʼonwe ya hapụrụ ụgbọ agha ya jiri ụkwụ gbapụ ọsọ.
16 Baraki analondola magaletawo pamodzi ndi ankhondo onse mpaka ku Haroseti-Hagoyimu, ndipo ankhondo onse a Sisera anaphedwa ndi lupanga. Palibe munthu ndi mmodzi yemwe anatsala.
Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.
17 Komabe Sisera anathawa pansi mpaka anakafika ku tenti ya Yaeli mkazi wa Heberi Mkeni uja, chifukwa panali mtendere pakati pa Yabini mfumu ya Hazori ndi banja la Heberi, Mkeni uja.
Ma Sisera gbapụrụ ọsọ gaa zoo onwe ya nʼụlọ ikwu Jael, nwunye Heba, onye Ken. Nʼihi udo dị nʼetiti eze Jabin, onye Hazọ, na ndị ezinaụlọ Heba, onye Ken.
18 Yaeli anatuluka kukachingamira Sisera ndipo anati, “Bwerani mbuye wanga, lowani momwemo musaope.” Choncho analowa mʼtenti muja, ndipo anamufunditsa chofunda.
Jael pụrụ ije zute Sisera sị ya, “Bịa Onyenwe m, bakwute m. Atụla ụjọ.” Ya mere na ọ bara nʼime ụlọ ikwu ya, o weere akwa ịchụ oyi kpuchie ya.
19 Anati, “Ndili ndi ludzu, chonde patseniko madzi pangʼono akumwa, ndili ndi ludzu.” Mkaziyo anatsekula thumba la chikopa mmene munali mkaka, namupatsa kuti amwe, ndipo anamufunditsanso.
Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Akpịrị na-akpọ m nkụ, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” O meghere karama akpụkpọ mmiri ara ehi, nye ya ihe ọṅụṅụ, jirikwa akwa ahụ sachie ya.
20 Kenaka anawuza mkaziyo kuti, “Muyime pa khomo la tentili, ndipo munthu wina akabwera kudzakufunsani kuti, ‘Kodi kwafika munthu wina kuno?’ Inu muyankha kuti, ‘Ayi.’”
Sisera gwara nwanyị ahụ bụ Jael okwu sị, “Guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ a. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa jụọ gị, ‘O nwere onye gbabatara nʼebe a?’ sị ya, ‘Mba.’”
21 Koma Yaeli mkazi wa Heberi, anatenga chikhomo cha tenti ndi hamara ndi kupita mwakachetechete kwa Sisera uja. Tsono Sisera ali mtulo chifukwa chotopa, mkazi uja anamukhomera chikhomo chija mʼmutu mwake. Chinatulukira kwinaku mpaka kulowa mʼnthaka, ndipo anafa pomwepo.
Ike gwụrụ nnọọ Sisera. Mgbe ahụ, ọ malitere ịrahụ ụra, Jael, nwunye Heba, wepụtara otu ǹtu e ji a kpọgide ụlọ ikwu ahụ nʼala, werekwa mkpirisi igwe nʼaka ya. O jiri nwayọọ jekwuuru Sisera ebe o dina na-arahụ ụra, kpọọ ya ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. Otu a ka Sisera si nwụọ.
22 Baraki atafika akulondola Sisera, Yaeli anatuluka kukamuchingamira namuwuza kuti, “Lowani mudzaone munthu amene mukumufunafuna.” Tsono atalowa anangoona Sisera ali thapsa pansi wakufa ndi chikhomo chili mʼmutu mwake.
Mgbe Barak bịara ịchọ Sisera, Jael jekwuru ya sị, “Bịa ka m gosi gị nwoke ahụ ị na-achọ.” Barak sooro ya jee, ma lee, Sisera anwụọlarị site na ǹtu ahụ a kpọrọ ya nʼisi.
23 “Choncho pa tsiku limenelo Mulungu anagonjetsa Yabini mfumu ya Akanaani, pamaso pa Aisraeli.
Nʼụbọchị ahụ, Chineke meriri Jabin, eze ndị Kenan nʼihu ụmụ Izrel.
24 Ndipo Aisraeli anapanikizabe Yabini, mfumu ya Akanaani, mpaka kumuwonongeratu.
Aka ụmụ Izrel bụ nke dị ike na-adịkwa ike nke ukwu megide Jabin bụ eze Kenan ruo mgbe ha lara ya nʼiyi.

< Oweruza 4 >