< Yoswa 2 >

1 Tsono Yoswa mwana wa Nuni anatuma anthu awiri okazonda dziko mwachinsinsi kuchokera ku Sitimu. Iye anawawuza kuti, “Pitani mukaone dzikolo makamaka mzinda wa Yeriko.” Kotero iwo anapita ndipo anakafika ku nyumba ya mkazi wadama dzina lake Rahabe, ndipo anagona kumeneko.
Joshua nwa Nun sitere na Shitim zipụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo sị ha, “Gaanụ leta otu ihe si aga nʼala ahụ, karịsịa nʼobodo Jeriko.” Ha gara nʼobodo ahụ baa nʼụlọ nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab nọọ ọnọdụ nʼebe ahụ.
2 Mfumu ya Yeriko inawuzidwa kuti, “Aisraeli ena afika mu mzinda muno usiku uno kudzazonda dziko.”
Ma otu onye gwara eze Jeriko okwu sị, “Lee, ụfọdụ ụmụ ndị ikom Izrel batara obodo a nʼabalị inyochapụta ala anyị.”
3 Choncho Mfumu ya Yeriko inatumiza uthenga kwa Rahabe kuti, “Atulutse anthu amene abwera ku nyumba kwakowo chifukwa iwo abwera kuti adzazonde dzikoli.”
Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.”
4 Koma pa nthawiyi nʼkuti mkaziyo atatenga amuna awiriwo ndi kuwabisa. Tsono anayankha kuti, “Inde, anthuwo anafikadi ku nyumba kuno. Koma sindinadziwe kumene anachokera.
Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa.
5 Iwo achoka kuno ndi chisisira, chipata cha mzinda chili pafupi kutsekedwa. Ndiye sindidziwa kumene alowera. Koma mukawalondola msanga muwapeza.”
Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.”
6 Koma nʼkuti atawakweza pa denga azondiwo ndi kuwabisa pansi pa mapesi a thonje amene iye anawayika pa dengapo.
(Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)
7 Nthumwi za mfumu zija zitatuluka ndipo chipata chinatsekedwa. Nthumwizo zinapita kukawafunafuna azondi aja mpaka ku dooko la Yorodani.
Ya mere, ndị ikom ahụ pụrụ na-achụ ndị nnyopụta ahụ nʼakụkụ ụzọ gara ngabiga Jọdan. Ma ngwangwa ha pụrụ, e mechiri ọnụ ụzọ ama e si abata obodo ahụ.
8 Azondiwo asanagone, Rahabe anakwera pa denga
Ma tupu ndị nnyopụta ahụ edina ala ịrahụ ụra nʼabalị ahụ, Rehab rịgokwuru ha,
9 ndipo anawawuza kuti, “Ine ndikudziwa kuti Yehova wakupatsani dziko lino ndipo tili ndi mantha. Anthu onse a mʼdziko lino ali ndi mantha chifukwa cha inu.
gwa ha sị, “Ama m na Onyenwe anyị enyela unu ala a, marakwa na oke ụjọ nke egwu unu adakwasịla anyị, nke mere na ndị niile bi nʼime ala a na-agbaze nʼegwu nʼihi unu,
10 Ife tinamva mmene Yehova anawumitsira madzi a Nyanja Yofiira inu mukufika pamene munatuluka mʼdziko la Igupto. Tamvanso zimene munachita kwa Sihoni ndi Ogi, mafumu awiri a Aamori amene ali kummawa kwa Yorodani. Inu munawawononga kotheratu.
nʼihi na anyị anụla otu Onyenwe anyị si mee ka mmiri dị nʼOsimiri Uhie taa nʼihi unu, mgbe unu si nʼIjipt pụta. Anyị nụkwara ihe unu mere Saịhọn, na Ọg, bụ eze abụọ ndị Amọrị, ndị bi nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, otu unu si bibie ha, gbuchapụ ndị niile bi nʼala ahụ.
11 Titamva zimenezi, ife tinataya mtima ndipo aliyense wa ife ali ndi mantha chifukwa cha inu. Tikudziwa kuti Yehova Mulungu wanu ndi Mulungu wa kumwamba ndi dziko lapansi.
Ma mgbe anyị nụrụ ihe ndị a, obi anyị gbazere nʼihi ụjọ, mmụọ onye ọbụla dara mba nʼihi unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa.
12 Choncho mulumbire pamaso pa Yehova ndi kundipatsa chizindikiro choti mudzachitadi zimene mwalonjeza, kuti monga inu ndakuchitirani chifundo, inunso mudzachitira chifundo a pa banja la abambo anga.
“Ugbu a, ebe ọ bụ na m emeelara unu ebere, jirinụ Onyenwe anyị ṅụọrọ m iyi na unu ga-emere ezinaụlọ m ebere. Gosinụ m ihe ịrịbama nʼeziokwu,
13 Inu mulonjeze kuti simudzapha abambo anga ndi amayi anga, abale anga ndi alongo anga ndi mabanja awo omwe.”
na unu ga-emekwa ka ndụ nna m, na nne m, na ụmụnne m ndị ikom na ndị inyom, na ndị ezinaụlọ ha niile dịrị, na unu ga-anapụta anyị site nʼọnwụ.”
14 Anthuwo anamuyankha kuti, “Ife ndife okonzeka kufa chifukwa cha inu. Ngati iwe sudzawulula zimene tachitazi, ndiye kuti ife tidzakukomera mtima ndi kusunga pangano lathu ndi iwe, Yehova akadzatipatsa dziko lino.”
Ndị ikom ahụ kwere ya nkwa sị, “Ndụ anyị lara ndụ unu. Ọ bụrụ na ị gbaghị anyị ama, anyị ga-egosi gị obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi mgbe Onyenwe anyị ga-enye anyị ala a.”
15 Popeza nyumba ya Rahabe inali pa linga la mzindawo, azondi aja anatulukira pa zenera. Rahabe anawatsitsa pansi ndi chingwe.
Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ.
16 Iye anawawuza kuti, “Pitani ku mapiri kuti okuthamangiraniwo asakupezeni. Mukabisale kumeneko masiku atatu mpaka iwo atabwerera, ndipo kenaka muzikapita kwanu.”
Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.”
17 Anthuwo anati kwa iye, “Lonjezo limene watichititsa ifeli tidzalisungadi
Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị,
18 tikadzalowa mʼdzikoli, iwe udzamangirire kansalu kofiira pa zenera limene unatitulutsira, ndi kusonkhanitsa abambo ako, amayi ako, abale ako ndi banja lako lonse mʼnyumba muno.
ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile.
19 Ngati wina aliyense adzatuluka mʼnyumbamo kuti azikayendayenda mu msewu, magazi ake adzakhala pamutu pake, ife sitidzapalamula kanthu. Koma wina aliyense wokhala mʼnyumba mwakomo akadzaphedwa, mlandu udzakhala wathu.
Ọ bụrụ na onye ọbụla esite nʼụlọ gị pụọ nʼezi, ọbara ya agaghị adị anyị nʼisi, anyị agaghị abụkwa ndị ikpe mara. Ma ikpe ọmụma dịrị anyị ma ọ bụrụ nʼihe ọbụla emee onye ọbụla gị na ya so nọdụ nʼime ụlọ.
20 Komanso iwe ukangowulula zimene ife tikuchitazi ndiye kuti ife sitidzasunga zimene talonjezazi.”
Ma ọ bụrụ na ị gbaa anyị ama, ọ dịkwaghị iwu ji anyị imezu iyi a i mere ka anyị ṅụọrọ gị.”
21 Rahabe anayankha kuti, “Zikhale monga mwaneneramo.” Kenaka iye anawatulutsa ndipo iwowo anapita. Pambuyo pake Rahabe anamangirira kansalu kofiira pa zenera paja.
Rehab zara sị ha, “Dịka okwu niile unu kwuru si dị, otu a ka ọ ga-adị.” O zilagara ha. Ha pụkwara gaara onwe ha. Ma Rehab kekwasịrị ụdọ uhie uhie ahụ nʼọnụ oghereikuku ụlọ ya.
22 Azondi aja anachoka napita ku mapiri ndipo anakhalako masiku atatu. Apa nʼkuti otumidwa ndi mfumu aja atawafunafuna ponseponse nʼkubwerera osawapeza.
Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha.
23 Pambuyo pake azondi awiri aja anayamba ulendo wobwerera kwawo. Anatsika ku mapiri kuja, nawoloka mtsinje mpaka anakafika kwa Yoswa mwana wa Nuni. Ndipo anamuwuza zonse zimene zinawachitikira.
Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha.
24 Iwo anati kwa Yoswa, “Ndithu, Yehova wapereka dziko lonse mʼmanja mwathu. Anthu onse kumeneko akuchita nafe mantha.”
Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.”

< Yoswa 2 >