< Yeremiya 25 >

1 Yehova anayankhula ndi Yeremiya za anthu onse a ku Yuda mʼchaka chachinayi cha ufumu wa Yehoyakimu mwana wa Yosiya mfumu ya ku Yuda, chimene chinali chaka choyamba cha ufumu wa Nebukadinezara mfumu ya ku Babuloni.
Okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Jehoiakim, nwa Josaya na Juda. Ọ bụkwa nʼafọ nke mbụ nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn.
2 Choncho mneneri Yeremiya anawuza anthu onse a ku Yuda pamodzi ndi onse amene amakhala mu Yerusalemu kuti:
Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem:
3 Kwa zaka 23, kuyambira chaka cha 13 cha ufumu wa Yosiya mwana wa Amoni mfumu ya ku Yuda mpaka lero lino, Yehova wakhala akundipatsa mauthenga ake ndipo ine ndakhala ndikuyankhula ndi inu kawirikawiri, koma inu simunamvere.
Kemgbe afọ iri abụọ na atọ, sitekwa nʼafọ iri na atọ nke ọchịchị eze Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda ruo taa, ka okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, a gwara m unu okwu, mgbe na mgbe, ma unu jụrụ ige ntị nʼihe m gwara unu.
4 Ndipo ngakhale Yehova kawirikawiri wakhala akukutumizirani atumiki ake onse, aneneri, inuyo simunamvere kapena kutchera khutu.
Ọ bụkwa ezie na Onyenwe anyị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu.
5 Aneneriwo ankanena kuti, “Ngati aliyense wa inu abwerere, kusiya njira zake zoyipa ndi machitidwe ake oyipa, ndiye kuti mudzakhala mʼdziko limene Yehova anapereka kwa makolo anu kwamuyaya.
Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a Onyenwe anyị nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi.
6 Musatsatire milungu ina nʼkuyitumikira ndi kuyipembedza. Musapute mkwiyo wanga ndi mafano amene mwapanga ndi manja anu. Mukatero Ine sindidzakuwonongani.
Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ.
7 “Koma inu simunandimvere,” akutero Yehova, “ndipo munaputa mkwiyo wanga ndi mafano amene munapanga ndi manja anu. Choncho munadziwononga nokha.”
“Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.”
8 Nʼchifukwa chake Yehova Wamphamvuzonse akuti, “Chifukwa simunamvere mawu anga,
Ya mere, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m.
9 ndidzayitana mafuko onse akumpoto, pamodzi ndi mtumiki wanga Nebukadinezara mfumu ya ku Babuloni,” akutero Yehova, “ndipo adzathira nkhondo dziko lino ndi anthu ake pamodzi ndi mitundu yonse ya anthu ozungulira dzikoli. Ndidzawawononga kwathunthu ndi kuwasandutsa chinthu chochititsa mantha ndi chonyozeka, mpaka muyaya.
Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
10 Ndidzathetsa mfuwu wachimwemwe ndi wachisangalalo, mawu a mkwati ndi mkwatibwi, phokoso la mphero ndi kuwala kwa nyale.
Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya.
11 Dziko lonse lidzakhala bwinja ndi chipululu, ndipo mitundu ina idzatumikira mfumu ya ku Babuloni kwa 70.
Ala a niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, mba ndị a niile ga-ejere eze Babilọn ozi iri afọ asaa.
12 “Koma zaka 70 zikadzatha, ndidzalanga mfumu ya ku Babuloni pamodzi ndi anthu ake, chifukwa cha zolakwa zawo,” akutero Yehova, “ndipo dziko lawo lidzakhala chipululu mpaka muyaya.
“Ma mgbe iri afọ asaa zuru, aga m ata eze Babilọn na mba ya, bụ ala ndị Babilọn, ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m emekwa ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
13 Ndidzachita zinthu zonse zimene ndinayankhula zotsutsa dzikolo, zonse zimene zalembedwa mʼbuku lino, ndiponso zonse zimene Yeremiya analosera zotsutsa anthu amenewa.
Aga m emekwa ka ihe niile m buru ụzọ kwuo megide ala ahụ bịakwasị ya, bụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ a, na ihe niile Jeremaya buru nʼamụma megide mba niile dị iche iche.
14 Iwo eni adzakhala akapolo a anthu a mitundu yochuluka ndi mafumu amphamvu. Ndidzawabwezera molingana ndi zochita zawo ndi ntchito za manja awo.”
A ga-eme ka ha ghọọ ndị ohu nye mba dị iche iche na nke ndị eze dị ukwuu. Aga m akwụghachikwa ha dịka omume ha si dị, na dịka akaọrụ ha si dịkwa.”
15 Yehova, Mulungu wa Israeli, anandiwuza kuti, “Tenga chikho ichi chodzaza ndi vinyo wa ukali wanga, ndipo ukamwetse anthu a mitundu yonse kumene ndikukutuma.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel gwara m, “Nara m iko a dị m nʼaka, nke a gbajuru mmanya ọnụma m, gaa mee ka mba niile m zigara gị ijekwuru ṅụrụ site na mmanya ọnụma m dị nʼime ya.
16 Akadzamwa adzayamba kudzandira ndi kuchita misala chifukwa cha nkhondo imene ndikuyitumiza pakati pawo.”
Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.”
17 Choncho ine ndinatenga chikhocho mʼdzanja la Yehova ndipo ndinamwetsa mitundu yonse ya anthu kumene Iye ananditumako:
Ya mere, esi m nʼaka Onyenwe anyị nara iko ahụ, meekwa ka mba ndị ahụ niile o ziri m ka m jekwuru ṅụrụ ihe dị nʼime ya.
18 Anandituma ku Yerusalemu ndi ku mizinda ya Yuda, kwa mafumu ake ndi nduna zake kuti ndikawasandutse ngati bwinja ndi chinthu chochititsa mantha ndi chonyozeka ndiponso chotembereredwa, monga mmene alili lero lino.
Jerusalem na obodo Juda niile, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, si nʼiko ahụ ṅụrụ ihe dị nʼime ya, nʼihi ime ka e bibie ha, ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe a bụrụ ọnụ, dịka ha dị taa.
19 Ananditumanso kwa Farao, mfumu ya ku Igupto, kwa atumiki ake, nduna zake ndi kwa anthu ake onse,
Fero, eze Ijipt, na ndị na-ejere ya ozi, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ya niile,
20 ndi kwa anthu ena onse a mitundu yachilendo; mafumu onse a ku Uzi; mafumu onse a Afilisti, a ku Asikeloni, ku Gaza, ku Ekroni ndiponso kwa anthu a ku chigwa chotsala cha Asidodi;
na ndị mba ọzọ niile bi nʼebe ahụ; na ndị eze Uz; na ndị eze ndị Filistia niile, bụ nke ndị Ashkelọn, na Gaza, na Ekrọn, na ndị fọdụrụ nʼime Ashdọd.
21 Edomu, Mowabu ndi Amoni.
Ndị eze Edọm, na Moab, na ndị Amọn;
22 Ananditumanso kwa mafumu onse a ku Turo ndi ku Sidoni; kwa mafumu a kutsidya la nyanja;
na ndị eze Taịa na Saịdọn, na ndị eze obodo ha dị nʼakụkụ osimiri, nke dị nʼofe nke ọzọ;
23 ku Dedani, ku Tema, ku Buzi ndi kwa onse ometa chamʼmbali.
na ala Dedan, na Tema, na Buz, na ndị niile bi nʼebe dị anya.
24 Ananditumanso kwa mafumu onse a ku Arabiya ndi mafumu onse a anthu achilendo amene amakhala mʼchipululu.
Na ndị eze Arebịa, na ndị eze mba niile ndị ahụ bi nʼọzara;
25 Anandituma kwa mafumu onse a ku Zimuri, Elamu ndi Mediya;
na ndị eze Zimri, na Elam, na Midia;
26 ndiponso kwa mafumu onse a kumpoto, akufupi ndi kutali omwe, mafumu onse a dziko lapansi. Ndipo potsiriza pake, idzamwenso ndi mfumu Sesaki.
na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa. Mgbe eze ndị a niile ṅụtụrụ site nʼihe dị nʼiko ahụ, eze Sheshak ga-esitekwa na ya ṅụrụ.
27 “Ndipo uwawuze kuti, ‘Yehova Wamphamvuzonse, Mulungu wa Israeli akuti: Imwani, ledzerani ndipo musanze, mugwe osadzukanso chifukwa cha nkhondo imene ndikutumiza pakati panu.’
“Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’
28 Koma ngati akana kutenga chikhocho mʼdzanja lako ndi kumwa, uwawuze kuti, ‘Yehova Wamphamvuzonse akuti: Muyenera kumwa ndithu!’”
Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
29 Taonani, tsopano ndiyamba kulanga mzinda uno umene umadziwika ndi dzina langa. Kodi inu muganiza kuti simudzalangidwa? Ayi, simudzapulumuka chifukwa ndikutumiza nkhondo pa onse okhala pa dziko lapansi, akutero Yehova Wamphamvuzonse.
Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
30 “Tsopano iwe nenera mawu owatsutsa ndipo uwawuze kuti, “‘Yehova adzabangula kumwamba; mawu ake adzamveka ngati bingu kuchokera ku malo ake opatulika. Adzabangula mwamphamvu kukalipira dziko lake. Iye adzafuwula ngati anthu oponda mphesa, kukalipira onse amene akukhala pa dziko lapansi.
“Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha, “‘Onyenwe anyị ga-esi nʼelu bigbọọ; ọ ga-esitekwa nʼebe obibi ya dị nsọ mee ka olu ya daa ụda. Ọ ga-ebigbọsị ike megide ala ya Ọ ga-eti mkpu dịka ndị ahụ na-azọcha mkpụrụ vaịnị; ọ ga-eti mkpu megide ndị niile bi nʼụwa.
31 Phokoso lalikulu lidzamveka mpaka kumalekezero a dziko lonse lapansi, chifukwa Yehova adzazenga mlandu anthu a mitundu yonse; adzaweruza mtundu wonse wa anthu ndipo oyipa adzawapha ndi lupanga,’” akutero Yehova.
Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebo mba niile nke ụwa ebubo. Ọ ga-eme ka ikpe ọmụma rute mmadụ niile, meekwa ka e jiri mma agha bibie ndị ajọ omume.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
32 Yehova Wamphamvuzonse akuti, “Taonani! Mavuto akuti akachoka pa mtundu wina akukagwa pa mtundu wina; mphepo ya mkuntho ikuyambira ku malekezero a dziko.”
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, mbibi na-agbasa site nʼotu mba na-eru na mba ọzọ; oke ifufe na-abịakwa site na nsọtụ niile nke ụwa.”
33 Pa tsiku limenelo, onse ophedwa ndi Yehova adzangoti mbwee ponseponse, pa dziko lonse lapansi. Palibe amene adzawalire kapena kusonkhanitsa mitemboyo kuti ikayikidwe mʼmanda, koma idzakhala mbwee ngati ndowe.
Nʼoge ahụ, ndị ahụ Onyenwe anyị ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi.
34 Khetsani misozi ndi kufuwula mwamphamvu, abusa inu; gubudukani pa fumbi, inu atsogoleri a nkhosa. Pakuti nthawi yanu yophedwa yafika; mudzagwa ndi kuphwanyika ngati mbiya yabwino kwambiri.
Kwasienụ akwa ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu akwa; tụrụọnụ onwe unu nʼala, unu ndị ndu nke igwe ewu na atụrụ. Nʼihi na oge a ga-egbu unu eruola, unu ga-adakwa tiwasịa dịka ite aja.
35 Abusa adzasowa kothawira, atsogoleri a nkhosa adzasowa malo opulumukira.
Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị enwe ebe ha ga-agbaga ọsọ; ndị ndu igwe ewu na atụrụ agaghị enwekwa ebe ha ga-ezo onwe ha.
36 Imvani kulira kwa abusa, atsogoleri a nkhosa akulira, chifukwa Yehova akuwononga msipu wawo.
Geenụ ntị ka unu nụrụ ịkwa akwa ndị ọzụzụ atụrụ, geenụ ntị nụrụ mkpu akwa ndị ndu igwe ewu na atụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-ebibi ebe ịta nri ha.
37 Makola awo a nkhosa amene anali pamtendere adzasanduka bwinja chifukwa cha mkwiyo woopsa wa Yehova.
Ebe mmakpu ọma niile nke anụ ụlọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi oke iwe nke Onyenwe anyị.
38 Ngati mkango, Yehova wasiya phanga lake, pakuti dziko lawo lasanduka chipululu chifukwa cha nkhondo ya owazunza ndiponso chifukwa cha mkwiyo woopsa wa Yehova.
Ọ ga-apụkwute ha, dịka ọdụm si esi nʼebe ndina ya na-apụta ịchụ anụ ọhịa. Ọ ga-eme ka ala ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, nʼihi mma agha nke onye mmegbu, na nʼihi oke iwe Onyenwe anyị.

< Yeremiya 25 >