< Yeremiya 24 >

1 Nebukadinezara, mfumu ya ku Babuloni anatenga ukapolo Yekoniya mwana wa Yehoyakimu mfumu ya ku Yuda pamodzi ndi nduna zake, anthu aluso ndi akatswiri a ku Yuda ndi kupita nawo ku Babuloni. Pambuyo pake Yehova anandionetsa madengu awiri a nkhuyu atayikidwa pa khomo pa Nyumba ya Yehova.
Emesịa, Onyenwe anyị gosiri m nkata fiig abụọ, nke a dọbara nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼoge a, Nebukadneza eze Babilọn esitelarị na Jerusalem dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, eze Juda, na ndịisi Juda, na ndị ọka, na ndị ụzụ, mee ka ha gaa biri na Babilọn, nke dị na mba ọzọ.
2 Mʼdengu limodzi munali nkhuyu zabwino kwambiri, ngati nkhuyu zoyambirira kucha. Mʼdengu linalo munali nkhuyu zoyipa kwambiri zosati nʼkudya.
Otu nkata nwere mkpụrụ fiig mara mma, dịka ndị ahụ na-ebu ụzọ acha, nkata nke ọzọ nwere mkpụrụ fiig nke jọrọ njọ, ha jọrọ njọ na mmadụ enweghị ike ịracha ha.
3 Yehova anandifunsa kuti, “Yeremiya, kodi ukuona chiyani?” Ndinayankha kuti, “Ndikuona nkhuyu zabwino kwambiri ndi nkhuyu zoyipa zosati nʼkudya.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụrụ m ajụjụ sị m, “Jeremaya, gịnị ka ị hụrụ?” Azara m sị ya, “Ahụrụ m mkpụrụ fiig. Ụfọdụ dị nnọọ ezi mma, ma ndị ọzọ jọrọ njọ. Ha adịghịkwa mma nracha.”
4 Tsono Yehova anandiwuza kuti,
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
5 “Ine Yehova, Mulungu wa Israeli ndikuti, ‘Anthu a ku Yuda amene ndinawachotsa ku malo ano nʼkupita nawo ku ukapolo ku dziko la Ababuloni ndikuwafanizira ndi nkhuyu zabwinozi.
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel kwuru: Ndị ahụ m mere ka e si na Juda dọta nʼagha, ndị e buuru gaa nʼala Kaldịa dị m dịka mkpụrụ osisi fiig ndị a mara mma.
6 Ndidzaonetsesa kuti ndiwachitire zabwino ndipo ndidzabwera nawonso ku dziko lino. Ndidzawamanga osati kuwapasula; ndidzawadzala osati kuwazula.
Anya m ga-adịkwasị ha nʼahụ ịhụ na ihe gaara ha nke ọma. Aga m akpọghachitekwa ha nʼala a. Aga m ewulikwa ha elu ghara ikwada ha; Aga m akụ ha dịka osisi ghara ihopu ha.
7 Ndidzawapatsa mtima woti andidziwe kuti ndine Yehova. Adzakhala anthu anga ndipo Ine ndidzakhala Mulungu wawo, chifukwa adzabwerera kwa Ine ndi mtima wawo wonse.
Aga m enye ha ụdị obi ha ga-eji mata m, na m bụ Onyenwe anyị. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Nʼihi na obi ha niile ka ha ga-eji lọghachikwute m.
8 “‘Koma monga nkhuyu zoyipa zija, zomwe ndi zoyipa kwambiri zosati nʼkudya,’ Yehova akuti, ‘ndi mmene ndidzalangire Zedekiya mfumu ya ku Yuda, nduna zake pamodzi ndi otsala a mu Yerusalemu, kaya adzakhala ali mʼdziko muno kapena mʼdziko la Igupto.
“‘Ma dịka fiig ọjọọ ndị a, bụ ndị dị njọ nke ukwuu na-enweghị ike iri ha eri,’ Onyenwe anyị sịrị, ‘otu a ka m gaa emeso Zedekaya, eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ahụ niile fọdụrụ ndụ na Jerusalem, ma ha bi nʼime ya, maọbụ biri nʼIjipt.
9 Ndidzawasandutsa chinthu chonyansa kwa maufumu onse a dziko lapansi, chinthu chonyozeka ndi chopandapake, chinthu chochitidwa chipongwe ndi chotembereredwa kulikonse kumene ndidzawabalalitsira.
Aga m eme ka ha ghọọrọ alaeze niile nke ụwa ihe ịsọ oyi, na ihe na-eweta obi ọjọọ. Ha ga-aghọ ihe ịta ụta, na ihe e ji akọ akụkọ, na ihe nkọcha na ihe ịbụ ọnụ nʼebe ọbụla m mere ka ha gaa biri.
10 Ndidzawatumizira nkhondo, njala ndi mliri mpaka atawonongedwa mʼdziko limene ndinawapatsa iwo ndi makolo awo.’”
Aga m ezigakwa mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe nʼetiti ha, tutu ruo mgbe e mere ka ha gwụsịa nʼelu ala ahụ nke m nyere ha, nyekwa ndị bụ nna nna ha.’”

< Yeremiya 24 >