< Yesaya 18 >

1 Tsoka kwa anthu a ku Kusi. Kumeneko kumamveka mkokomo wa mapiko a dzombe.
Ahụhụ ga-adịrị ala ahụ a na-anụ ụzụ ọtụtụ nku nʼime ya, ala ahụ dị nʼofe iyi ukwu niile nke Kush.
2 Dziko limenelo limatumiza akazembe pa mtsinje wa Nailo, mʼmabwato amabango amene amayandama pa madzi, ndikunena kuti, “Pitani, inu amithenga aliwiro, kwa mtundu wa anthu ataliatali a khungu losalala, ndi woopedwa ndi anthu. Akazembe anatumidwa ku dziko la anthu amphamvu ndi logonjetsa anthu ena. Dziko lawo ndi logawikanagawikana ndi mitsinje.”
Ala nke na-ezipụ ndị ozi ya site nʼosimiri, bụ ndị na-eji ụgbọ mmiri papịrọs nʼaga nʼelu mmiri. Gaanụ ngwangwa, unu ndị ozi dị nkọ gakwuru ndị toro ogologo nke ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ, gakwuru ndị a na-atụ egwu nʼebe niile, mba na-achọ okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa, ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.
3 Inu nonse anthu a pa dziko lonse, inu amene mumakhala pa dziko lapansi, pamene mbendera yakwezedwa pa mapiri yangʼanani, ndipo pamene lipenga lilira mumvere.
Unu niile bi nʼelu ụwa dum, na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị. Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile, lee anya; mgbe a fụrụ opi ike, gee ntị.
4 Pakuti Yehova akunena kwa ine kuti, “Ndili chikhalire ku malo anga kuno, ndidzakhala chete, ndi kumangoyangʼana, monga momwe dzuwa limawalira nthawi yotentha, monganso momwe mame amagwera usiku pa nthawi yotentha yokolola.”
Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m, “Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m, dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi, na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ.”
5 Pakuti, anthu asanayambe kukolola, maluwa atayoyoka ndiponso mphesa zitayamba kupsa, Iye adzadula mphukira ndi mipeni yosadzira, ndipo adzadula ndi kuchotsa nthambi zotambalala.
Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị, mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata, ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya, ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.
6 Mitembo ya anthu ankhondo adzasiyira mbalame zamʼmapiri zodya nyama ndiponso zirombo zakuthengo; mbalame zidzadya mitemboyo nthawi yonse ya chilimwe, ndipo zirombo zidzayidya pa nthawi yonse yachisanu.
A ga-ahapụ ozu ndị agha ha ka anụ ufe nke ugwu na ụmụ anụ ọhịa rie ha. Ụmụ nnụnụ ga-eri anụ ha nʼoge okpomọkụ, ma ụmụ anụ ọhịa ga-eri ha nʼoge oyi.
7 Pa nthawi imeneyo anthu adzabwera ndi mphatso kwa Yehova Wamphamvuzonse, zochokera kwa anthu ataliatali ndi osalala, kuchokera kwa mtundu wa anthu woopedwa ndi anthu apafupi ndi akutali omwe, mtundu wa anthu amphamvu ndi a chiyankhulo chachilendo, anthu amene dziko lawo ndi logawikanagawikana ndi mitsinje. Adzabwera nazo mphatso ku Phiri la Ziyoni, ku malo a Dzina la Yehova Wamphamvuzonse.
Ma mgbe ahụ, a ga-ewetara Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye dị iche iche, site na ndị toro ogologo, ndị ahụ na-akwọ mụrụmụrụ, site na ndị a na-atụ egwu nʼebe niile, bụ mba ndị okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa, ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha. A ga-eweta onyinye a nʼUgwu Zayọn, nʼebe ahụ a na-akpọku aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

< Yesaya 18 >