< Hoseya 7 >
1 Pamene ndichiritsa Israeli, machimo a Efereimu amaonekera poyera ndiponso milandu ya Samariya sibisika. Iwo amachita zachinyengo, mbala zimathyola nyumba, achifwamba amalanda anthu katundu mʼmisewu.
mgbe m chọrọ ịgwọ Izrel, mmehie Ifrem na-apụta ihe, a na-ekpughekwa arụ a na-eme na Sameria. Ha na-aghọ aghụghọ, ndị ohi na-akụwakwa ụlọ ndị mmadụ, ndị na-apụnara mmadụ ihe nọ nʼokporoụzọ.
2 Koma sazindikira kuti Ine ndimakumbukira zoyipa zawo zonse. Azunguliridwa ndi zolakwa zawo; ndipo sizichoka mʼmaso mwanga.
Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara na m na-echeta mmehie ha niile. Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu. Ana m ahụkwa ha niile.
3 “Anthuwa amasangalatsa mfumu ndi zoyipa zawozo, akalonga amasekerera mabodza awo.
“Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha; ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha.
4 Onsewa ndi anthu azigololo, otentha ngati moto wa mu uvuni, umene wophika buledi sasonkhezera kuyambira pamene akukanda buledi mpaka atafufuma.
Ha niile bụ ndị na-akwa iko; ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ, nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ, site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri.
5 Pa tsiku la chikondwerero cha mfumu yathu akalonga amaledzera ndi vinyo, ndipo amalowa mʼgulu la anthu achipongwe.
Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị, ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke, ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka.
6 Mitima yawo ili ngati uvuni; amayandikira Mulungu mwachiwembu. Ukali wawo umanyeka usiku wonse, mmawa umayaka ngati malawi a moto.
Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha, ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya. Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ, nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ.
7 Onsewa ndi otentha ngati uvuni, amapha olamulira awo. Mafumu awo onse amagwa, ndipo palibe ndi mmodzi yemwe amandiyitana Ine.
Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ. Ha na-eripịa ndị eze ha. Ndị eze ha niile na-ada, ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m.
8 “Efereimu wasakanikirana ndi mitundu ya anthu ena; Efereimu ndi buledi amene wapsa mbali imodzi.
“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ. Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị.
9 Alendo atha mphamvu zake, koma iye sakuzindikira. Tsitsi lake layamba imvi koma iye sakudziwa.
Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha, ma ha adịghị aghọta ya. Isi awọ apụtala ha nʼisi, ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị.
10 Kunyada kwake Israeli kukumutsutsa, koma pa zonsezi iye sakubwerera kwa Yehova Mulungu wake kapena kumufunafuna.
Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya, maọbụ chọọ ya.
11 “Efereimu ali ngati nkhunda yopusa yopanda nzeru. Amayitana Igupto namapita ku Asiriya.
“Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa.
12 Akamadzapita, ndidzawakola ndi ukonde wanga; ndidzawagwetsa pansi ngati mbalame zamumlengalenga. Ndikadzamva kuti asonkhana pamodzi ndidzawakola.
Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha, dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe. Aga m enye ha ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
13 Tsoka kwa iwo, chifukwa andisiya Ine! Chiwonongeko kwa iwo, chifukwa andiwukira! Ndimafunitsitsa kuwapulumutsa koma amayankhula za Ine monama.
Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ha ajụla m. Ha na-ala nʼiyi nʼihi na ha enupula isi ha megide m. Achọrọ m ka m gbapụta ha, ma ha na-agha ụgha megide m.
14 Iwo salirira kwa Ine kuchokera pansi pa mtima, koma amalira mofuwula ali pa bedi pawo. Amadzichekacheka chifukwa chofuna tirigu ndi vinyo watsopano, koma amandifulatira.
Ha ejighịkwa obi ha akpọku m, kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa. Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya, ha na-egbukasị onwe ha ahụ, na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.
15 Ine ndinawaphunzitsa ndikuwalimbitsa, koma amandikonzera chiwembu.
Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike, ma ha atụgharịala gbaa izu imegide m.
16 Iwo satembenukira kwa Wammwambamwamba; ali ngati uta woonongeka. Atsogoleri awo adzaphedwa ndi lupanga chifukwa cha mawu awo achipongwe. Motero iwo adzasekedwa mʼdziko la Igupto.
Ha adịghị ele anya enyemaka nʼaka Onye kachasị ihe niile elu. Ha dịka ụta rọgọrọ arọgọ, nke àkụ ya na-adịghị agbata ihe ọbụla. Ndị ndu ha ga-ada site na mma agha, nʼihi okwu ọjọọ si ha nʼọnụ na-apụta. Nʼihi nke a, a ga-eji ha mee ihe ọchị nʼala Ijipt.