< Eksodo 8 >

1 Kenaka Yehova anati kwa Mose, “Ukamuwuze Farao kuti, Lolani anthu anga kuti apite, akandipembedze.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Jekwuru Fero gwa ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Hapụ ndị m, ka ha gaa fee m ofufe.
2 Ndipo ngati simulola kuti apite Ine ndidzalanga dziko lonse la Igupto polidzaza ndi achule.
Ọ bụrụ na ị jụ ịhapụ ha ka ha gaa, aga m eme ka awọ jupụta nʼala Ijipt niile.
3 Mtsinje wa Nailo udzadzaza ndi achule. Achulewo adzatuluka ndi kukalowa mʼnyumba yaufumu, ku chipinda chogona ndi pa bedi lako, mʼnyumba za nduna zako ndi pa anthu ako ndi mophikira buledi ndiponso mopangira bulediyo.
Osimiri Naịl ga-ejupụta nʼawọ. Ha ga-abata nʼụlọeze gị na nʼime ọnụụlọ ndina gị, ma nʼelu ihe ndina gị, ma nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, ma nʼụlọ ndị gị niile, na nʼebe a na-esi nri, ma nʼime ihe e ji agwakọta ụtụ ọka.
4 Achulewo adzakulumphira iwe ndi anthu ako ndiponso nduna zako.”
Awọ ndị a ga-arịgokwa nʼahụ gị, na nʼahụ ndị gị, na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi.’”
5 Ndipo Yehova anati kwa Mose, “Uza Aaroni kuti, ‘Loza ndodo yako ku mitsinje, ku ngalande ndi ku zithaphwi ndipo pakhale achule pa dziko lonse la Igupto.’”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Gwa Erọn, ‘Setịpụ aka gị ya na mkpanaka gị nʼelu osimiri niile, na mmiri nta na ọdọ mmiri ndị Ijipt, mee ka awọ jupụta ala Ijipt niile.’”
6 Kotero Aaroni analoza dzanja lake pa madzi a ku Igupto, ndipo achule anatuluka nadzaza dziko lonse la Igupto.
Erọn setịpụrụ aka nʼelu mmiri niile nke Ijipt, awọ pụtara kpuchie ala ahụ niile.
7 Koma amatsenga anachita zinthu zomwezo mʼmatsenga awo. Iwonso anatulutsa achule mʼdziko lonse la Igupto.
Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ihe ahụ Mosis na Erọn mere. Ha mekwara ka awọ jupụta ala ahụ niile.
8 Kenaka, Farao anayitanitsa Mose ndi Aaroni ndipo anati, “Pemphera kwa Yehova kuti achulewa achoke kwa ine ndi anthu anga, ndipo ine ndidzalola kuti anthu anu apite kukapereka nsembe kwa Yehova.”
Fero kpọrọ Mosis na Erọn rịọọ ha sị, “Rịọọnụ Onyenwe anyị ka o wepụrụ mụ na ndị m awọ ndị a. Emesịa aga m ekwe ka ndị gị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”
9 Mose anati kwa Farao, “Inu mungonditchulira nthawi imene mukufuna kuti ndikupempherereni, nduna zanu pamodzi ndi anthu anu kuti achule achoke mʼnyumba zanu ndi kuti atsale okhawo ali mu mtsinje wa Nailo.”
Mosis zaghachiri Fero sị, “Gị ka ọ dịrị ịgwa m mgbe m ga-arịọ arịrịọ a nʼisi gị na nʼisi ndị gị, ka e wezuga awọ ndị a site nʼụlọ unu, ma hapụ naanị ndị nọ nʼosimiri Naịl.”
10 Farao anati, “Mawa.” Mose anamuyankha kuti, “Chabwino zidzakhala monga mwaneneramu, kuti mudzadziwe kuti palibe wina wofanana ndi Yehova Mulungu wathu.
Mgbe ahụ Fero sịrị Mosis, “Achọrọ m ka i mee ya echi.” Mosis zaghachiri Fero sị, “Ọ dị mma, ka ọ dịrị dịka i kwuru. Mgbe ahụ, ị ga-amata na o nweghị onye dịka Onyenwe anyị Chineke anyị.
11 Achule adzachoka mʼnyumba yanu, mʼnyumba za nduna zanu pamodzi ndi za anthu anu. Koma adzatsala mu mtsinje wa Nailo basi.”
Awọ ndị a niile ga-apụ site nʼebe ị nọ, na site nʼụlọ gị na site nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi na site nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ọ bụ naanị nʼosimiri Naịl ka ha ga-anọ.”
12 Mose ndi Aaroni anachoka, ndipo Mose anapemphera kwa Yehova kuti achotse achule amene anatumiza kwa Farao.
Mgbe Mosis na Erọn sitere nʼụlọ Fero pụọ, Mosis kpọkuru Onyenwe anyị ka o wepụ awọ ndị a o mere ka ha bịakwasị Fero.
13 Ndipo Yehova anachita zomwe Mose anapempha. Achule amene anali mʼnyumba, mʼmabwalo ndi mʼminda anafa
Onyenwe anyị mere ihe Mosis rịọrọ. Awọ ndị ahụ niile nwụrụ nʼime ụlọ, na nʼama, na nʼọhịa.
14 Aigupto anawunjika achulewo milumilu ndipo dziko linanunkha.
E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu.
15 Koma Farao ataona kuti zinthu zinayambanso kukhala bwino, anawumitsanso mtima wake ndipo sanamverenso mawu a Mose ndi Aaroni, monga momwe Yehova ananenera.
Ma mgbe Fero hụrụ na awọ ndị a anwụchaala, o mechiri obi ya jụ ige Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.
16 Kenaka Yehova anati kwa Mose, “Uza Aaroni kuti akweze ndodo yake ndi kumenya fumbi la pa nthaka, ndipo fumbilo lidzasanduka nsabwe pa dziko lonse la Igupto.”
Ya mere, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala Ijipt niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.”
17 Iwo anachita momwemo, ndipo pamene Aaroni anakweza ndodo yake ndi kumenya fumbi, nsabwe zinafika pa munthu aliyense ndi pa ziweto. Fumbi lonse la mʼdziko la Igupto linasanduka nsabwe.
Mosis na Erọn mere nke a. Mgbe Erọn setịpụrụ aka tie mkpanaka ya nʼelu ala, anwụ nta jupụtara nʼala Ijipt niile, nʼahụ ndị mmadụ, na nʼahụ anụmanụ ha. Ndanda ndị a jupụtakwara nʼuzuzu niile dị nʼala ahụ.
18 Koma amatsenga atayesa kupanga nsabwe mwa matsenga awo, analephera. Ndipo nsabwezo zinali pa munthu aliyense ndi pa ziweto zawo.
Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile.
19 Amatsenga anati kwa Farao, “Izi wachita ndi Mulungu.” Koma mtima wa Farao unali wowumabe ndipo sanamvere zonena za Mose ndi Aaroni monga momwe Yehova ananenera.
Naanị ihe ndị na-eme majiki gwara Fero bụ, “Nke a bụ akaọrụ Chineke.” Ma Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ chọghị ige, ọ bụladị ndị majiki ya ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.
20 Kenaka Yehova anati kwa Mose, “Mmawa, upite ukakumane ndi Farao maso ndi maso pamene azidzapita ku madzi ndipo ukanene kuti, ‘Yehova akuti, Lola anthu anga kuti apite akandipembedze.
Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru Fero. Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri, gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
21 Koma ngati suwalola anthu anga kuti apite, Ine ndidzatumiza pa iwe ntchentche zoluma ndi pa nduna zako ndi anthu ako ndi mʼnyumba zanu. Mʼnyumba za Aigupto mudzadzaza ntchentche zoluma. Ngakhale pa nthaka pamene akhalapo padzadzaza ndi ntchentche zoluma.’”
Ọ bụrụ na ị chọghị ime otu a, aga m eme ka igwe ijiji jupụta nʼala Ijipt niile. Ha ga-ejupụta gị nʼahụ na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi, na nʼahụ ndị gị niile, na nʼime ụlọ unu niile.
22 “Koma pa tsikulo ndidzapatula dera la Goseni, kumene kumakhala anthu anga, motero kuti sikudzakhala ntchentche zoluma. Choncho iwe udzadziwa kuti Ine Yehova ndi amene ndikulamulira dziko lino.
“‘Nʼụbọchị ahụ, igwe ijiji ndị a agaghị emetụ ndị nọ na Goshen ebe ndị m bi. Mgbe ahụ ka ị ga-amata na mụ bụ Onyenwe anyị bịara ije nʼala a.
23 Ndidzasiyanitsa pakati pa anthu anga ndi anthu ako. Chizindikiro chozizwitsa ichi chidzachitika mawa.”
Aga m emekwa ka ọ pụta ìhè na o nwere ihe dị iche nʼetiti ndị m na ndị gị. Ihe ịrịbama a ga-emezukwa echi.’”
24 Ndipo Yehova anachita zimenezi: Ntchentche zoluma zochuluka zinalowa mʼnyumba yaufumu ya Farao ndi nyumba za nduna zake. Choncho ntchentche zolumazi zinawononga dziko lonse la Igupto.
Nʼechi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe ijiji dị egwu nʼọnụọgụgụ bịara nʼala Ijipt, jupụta nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị niile na-ejere ya ozi, na nʼala Ijipt niile. E mere ka ala Ijipt bụrụ ihe e ji ijiji mebie.
25 Kenaka Farao anayitanitsa Mose ndi Aaroni nati, “Pitani kaperekeni nsembe kwa Mulungu wanu mʼdziko lomwe lino.”
Mgbe ihe ndị a na-eme, Fero kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha okwu sị, “Gaanụ chụọrọ Chineke unu aja, ma ka ọ bụrụ nʼala Ijipt.”
26 Koma Mose anati, “Sitingathe kutero pakuti nsembe zathu kwa Yehova Mulungu ndi zowayipira Aigupto. Ngati tipereke nsembe zowayipira Aigupto mʼmaso mwawo, adzatiponya miyala kuti tife.
Mosis zaghachiri Fero sị, “Nke ahụ abụghị ihe ziri ezi, nʼihi na aja anyị na-aga ịchụrụ Onyenwe anyị Chineke anyị bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ndị Ijipt. Ọ bụrụ na anyị achụọ aja a nʼihu ha, ha ga-eji nkume tugbuo anyị.
27 Ife tiyenera kuyenda ulendo wa masiku atatu kupita ku chipululu kukapereka nsembe kwa Yehova Mulungu wathu monga anatilamulira.”
Anyị ga-aga njem ụbọchị atọ nʼime ọzara gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja, dịka o nyere anyị iwu ka anyị mee.”
28 Farao anati, “Ine ndikulolani kuti mupite ku chipululu kukapereka nsembe kwa Yehova Mulungu wanu, koma musapite kutali kwambiri. Tsopano ndipempherereni.”
Fero zaghachiri ha sị, “Aga m ekwenye ka unu ga chụọrọ Onyenwe anyị Chineke unu aja nʼọzara, ma unu agaghị aga ebe dị anya. Ugbu a, kperenụ m ekpere.”
29 Mose anayankha kuti, “Ine ndikangochoka pano, ndikapemphera kwa Yehova ndipo mawa lomweli ntchentche zoluma zidzachoka kwa Farao, nduna zake pamodzi ndi anthu ake. Koma Farao, onetsetsani kuti musachitenso zachinyengo ndi kuwakaniza anthu kuti asakapereke nsembe kwa Yehova.”
Mosis zara Fero sị ya, “Ngwangwa m si nʼihu gị pụọ, aga m arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Echi, a ga-esite nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị na-ejere ya ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile wezuga ijiji ndị a. Ọ ga-adị mkpa na Fero ga-elezi anya hapụ ịghọ aghụghọ ọzọ site ịjụ ka ụmụ Izrel gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”
30 Choncho Mose anasiyana ndi Farao nakapemphera kwa Yehova.
Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Fero pụọ rịọọ Onyenwe anyị ka o mee ka ijiji ndị a gabiga.
31 Ndipo Yehova anachita zomwe Mose anapempha: Ntchentche zoluma zinachoka kwa Farao ndi nduna zake ndiponso kwa anthu ake. Palibe ngakhale imodzi yomwe inatsala.
Onyenwe anyị mere dịka Mosis rịọrọ. Ijiji ndị a sitere nʼụlọ Fero na ụlọ ndị na-ejere ya ozi na ụlọ ndị Ijipt niile pụọ. O nwekwaghị ijiji ọ bụla fọdụrụ nʼala ahụ.
32 Koma nthawi imeneyinso Farao anawumitsa mtima wake ndipo sanalole kuti anthu atuluke.
Ma nʼoge a, Fero gara nʼihu ime ka obi ya sie ike. O kweghị ka ụmụ Izrel laa.

< Eksodo 8 >