< Eksodo 6 >

1 Yehova anawuza Mose kuti, “Tsopano udzaona zimene ndimuchite Farao: Chifukwa cha dzanja langa lamphamvu adzalola anthu anga kuti atuluke. Chifukwa cha dzanja langa lamphamvu adzawatulutsa mʼdziko lake.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero. Nʼihi ike aka m, ọ ga-ezipụ ha. Nʼihi ike aka, ọ ga-achụpụ ha site nʼala ya.”
2 Mulungu anatinso kwa Mose, “Ine ndine Yehova.
Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
3 Ndinaonekera kwa Abrahamu, kwa Isake ndi kwa Yakobo monga Mulungu Wamphamvuzonse, koma sindinawadziwitse dzina langa kuti ndine Yehova.
Egosiri m Ebraham na Aịzik na Jekọb onwe m dịka Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ma ọ dịghị mgbe m mere ka ha mata aha m dịka Onyenwe anyị.
4 Ndinakhazikitsa pangano langa ndi iwo kuwalonjeza kuti ndidzawapatsa dziko la Kanaani kumene anakhalako kale ngati alendo.
Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa.
5 Ndamvanso kubuwula kwa Aisraeli, amene Aigupto awayesa akapolo ndipo ndakumbukira pangano langa.”
Ugbu a, anụla m ịsụ ude ụmụ Izrel, bụ ndị ahụ ndị Ijipt mere ka ha bụrụ ndị ohu. Echetakwala m ọgbụgba ndụ m.
6 “Nʼchifukwa chake nena kwa Aisraeli kuti, ‘Ine ndine Yehova, ndipo ndidzakutulutsani mʼgoli la Aigupto. Ndidzakumasulani mu ukapolo, ndidzakuwombolani ndi dzanja langa lotambasuka ndi kuchita ntchito zachiweruzo.
“Ya mere, gwa ụmụ Izrel, ‘Abụ m Onyenwe anyị. Aga m akpọpụta unu site nʼọnọdụ ịbụ ohu ndị Ijipt. Aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu nye ha. Aga m eji aka ike m nke m ga-esetipụ, ya na ihe ngosipụta dị ukwuu nke ikpe ikpe m, gbapụta unu.
7 Ndidzakutengani kukhala anthu anga, ndipo Ine ndidzakhala Mulungu wanu. Pamenepo inu mudzadziwa kuti Ine ndine Yehova Mulungu wanu amene ndinakutulutsani mʼgoli la Aigupto.
Mgbe ahụ, aga m ewere unu ka unu bụrụ ndị m. Aga m abụ Chineke unu. Unu ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, onye kpọpụtara unu site nʼaka ịbụ ohu nʼala Ijipt.
8 Ndipo ndidzakufikitsani ku dziko limene ndinalumbira kuti ndidzalipereka kwa Abrahamu, kwa Isake ndi kwa Yakobo. Ndidzakupatsani dziko limenelo kuti likhale lanu. Ine ndine Yehova.’”
Aga m akpọbata unu nʼala ahụ m weliri aka m elu, ṅụọ nʼiyi, nye Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ime ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Abụ m Onyenwe anyị.’”
9 Mose anawafotokozera Aisraeli zimenezi, koma iwo sanamumvere chifukwa cha kukhumudwa ndi goli lankhanza.
Mosis gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ma ha egeghị ntị nʼihi ịda mba nke obi ha na ahụhụ sitere na ndọgbu nʼọrụ ha.
10 Kenaka Yehova anati kwa Mose,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị,
11 “Pita ukawuze Farao mfumu ya Igupto kuti awalole Aisraeli atuluke mʼdziko lake.”
“Gaa gwa Fero eze Ijipt, ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha pụọ nʼala ya.”
12 Koma Mose ananena kwa Yehova kuti, “Ngati Aisraeli sanandimvere, Farao akandimvera chifukwa chiyani, pajatu sinditha kuyankhula bwino?”
Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Mgbe ụmụ Izrel na-aṅaghị m ntị, olee otu Fero ga-esi ṅaa m ntị? Nke ka nke, enweghị m ike ikwu okwu nke ọma.”
13 Ndipo Yehova analamula Mose ndi Aaroni kuti awuze Aisraeli ndi Farao mfumu ya Igupto kuti Aisraeli ayenera kutuluka mʼdziko la Igupto.
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu banyere ụmụ Izrel na banyere Fero eze Ijipt. O nyere ha iwu sị ha site nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.
14 Atsogoleri a mafuko awo anali awa: Ana a Rubeni mwana wachisamba wa Israeli anali Hanoki, Palu, Hezironi ndi Karimi. Awa anali mafuko a Rubeni.
Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile. Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ, Hanok na Palu, Hezrọn na Kami. Ndị a bụ agbụrụ Ruben.
15 Ana a Simeoni anali Yemueli, Yamini, Ohadi, Yakini, Zohari ndi Saulo mwana wa kwa mkazi wa Chikanaani. Awa anali mafuko a Simeoni.
Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ, Jemuel, Jamin, Ohad, Jakin, Zoha na Shaul (onye nne ya bụ onye Kenan). Ndị a bụ agbụrụ Simiọn.
16 Mayina a ana a Levi pamodzi ndi zidzukulu zawo anali awa: Geresoni, Kohati ndi Merari. Levi anakhala ndi moyo kwa zaka 137.
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Livayị nʼusoro e si mụọ ha: Geshọn, Kohat na Merari. Livayị nʼonwe ya gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
17 Ana a Geresoni, mwa mafuko awo, anali Libini ndi Simei.
Ụmụ ndị ikom Geshọn, nʼagbụrụ ha, bụ Libni na Shimei, nʼusoro ezinaụlọ ha.
18 Ana a Kohati anali Amramu, Izihari, Hebroni ndi Uzieli. Kohati anakhala ndi moyo zaka 133.
Ụmụ ndị ikom Kohat bụ, Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Kohat gbara narị afọ na iri afọ atọ na atọ mgbe ọ nwụrụ.
19 Ana a Merari anali Mali ndi Musi. Awa anali mafuko a Levi monga mwa mibado yawo.
Ụmụ ndị ikom Merari bụ Mahali na Mushi. Ndị a niile si nʼagbụrụ Livayị, dịka ihe e dere banyere ha si dị.
20 Amramu anakwatira Yokobedi mlongo wa abambo ake, amene anabereka Aaroni ndi Mose. Amramu anakhala ndi moyo kwa zaka 137.
Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya. Erọn na Mosis bụ ụmụ ha ndị ikom. Ma Amram gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
21 Ana a Izihari anali Kora, Nefegi ndi Zikiri.
Ụmụ ndị ikom Izha bụ Kora, Nefeg na Zikri.
22 Ana a Uzieli anali Misaeli, Elizafani ndi Sitiri.
Ụmụ ndị ikom Uziel bụ, Mishael, Elzafan na Sitri.
23 Aaroni anakwatira Eliseba, mwana wamkazi wa Aminadabu, mlongo wa Nasoni ndipo Iye anabereka Nadabu, Abihu, Eliezara ndi Itamara.
Erọn lụrụ Elisheba, nwa Aminadab, na nwanne nwanyị Nashọn. Ụmụ ha bụ, Nadab, na Abihu, Elieza na Itama.
24 Ana a Kora anali Asiri, Elikana ndi Abiasafu. Awa ndiwo mafuko a Kora.
Ụmụ ndị ikom Kora bụ, Asịa, Elkena na Abiasaf. Ndị a bụ ndị ikwu Kora.
25 Eliezara mwana wa Aaroni anakwatira mmodzi mwa ana aakazi a Putieli, ndipo anabereka Finehasi. Awa anali atsogoleri a mabanja a Levi, monga mwa mafuko awo.
Elieza, nwa Erọn lụrụ otu nʼime ụmụ Putiel, onye mụtaara ya Finehaz. Ndị a bụ aha ndịisi ezinaụlọ Livayị dịka ikwu ha si dị.
26 Aaroni ndi Mose ndi aja amene Yehova anawawuza kuti, “Tulutsani Aisraeli mu Igupto mʼmagulu awo.”
Ọ bụkwa Mosis na Erọn ka Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Sitenụ nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel dịka ọnụọgụgụ ha si dị.”
27 Mose ndi Aaroni ndiwo amene anayankhula ndi Farao mfumu ya Igupto kuti atulutse Aisraeli mu Igupto.
Ha bụ ndị gwara Fero, eze Ijipt okwu banyere ime ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụọ. Ọ bụkwa otu Mosis na Erọn ahụ.
28 Tsopano pamene Yehova anayankhula kwa Mose mu Igupto,
Otu ụbọchị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼIjipt,
29 anati, “Ine ndine Yehova. Umuwuze Farao mfumu ya Igupto zonse zimene Ine ndikuwuze iwe.”
ọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, gaa gwa Fero eze Ijipt ihe niile m gwara gị.”
30 Koma Mose anati kwa Yehova, “Farao akandimvera bwanji, pakuti ine sinditha kuyankhula bwino?”
Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Lee, abụ m onye na-adịghị ekwuzi okwu nke ọma, gịnị mere Fero ga-eji gee ntị nʼihe m ga-agwa ya?”

< Eksodo 6 >