< Danieli 12 >

1 “Pa nthawi imeneyo Mikayeli, mngelo wamkulu amene amateteza anthu a mtundu wako, adzabwera. Imeneyi idzakhala nthawi ya mavuto aakulu omwe sanaonekepo kuyambira pachiyambi cha mitundu ya anthu mpaka nthawi ikudzayo. Komatu pa nthawiyi anthu a mtundu wako, aliyense amene dzina lake lidzapezeke lolembedwa mʼbuku adzapulumutsidwa.
“Nʼoge ahụ, Maikel, onyeisi ọchịchị ukwuu ahụ, nke na-eche ndị unu, ga-ebili. Ọ ga-abụ oge nhụju anya, a na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe mba ọbụla malitere ruo ugbu a. Ma mgbe ahụ, ndị gị niile, ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ ahụ, ka a ga-anapụta.
2 Ambiri mwa amene akugona mʼnthaka adzadzuka: ena adzapita ku moyo wosatha, ena ku malo amanyazi ndi chilango chosatha.
Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi.
3 Amene ali anzeru mʼnjira ya chilungamo adzawala ngati kuwala kwa mlengalenga, ndipo amene alondolera ambiri ku njira yolungama, adzawala ngati nyenyezi ku nthawi zosatha.
Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe mbara eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi.
4 Koma iweyo, Danieli, sungitsa mawuwa, umate bukuli kufikira nthawi ya chimaliziro. Anthu ambiri adzapita uku ndi uko ndipo nzeru zidzanka zikukulirakulira.”
Ma gị bụ Daniel, zoo okwu e dere nʼakwụkwọ a, mechiekwa ma kachiekwa ha akara tutu ruo ọgwụgwụ oge. Ọtụtụ ga-agbagharị ebe na ebe ọzọ, ma ihe ọmụma ga-aba ụba.”
5 Kenaka ine Danieli poyangʼana ndinaona anthu ena awiri atayima, wina tsidya lino la mtsinje, wina tsidya linalo.
Mgbe ahụ, mụ bụ Daniel weliri anya hụ mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha nọ nʼakụkụ osimiri ahụ, otu nʼakụkụ nke a, otu nʼakụkụ nke ọzọ.
6 Mmodzi mwa awiriwo anafunsa munthu wovala chovala chosalala amene anali mʼmbali mwa madzi a mu mtsinje uja kuti, “Kodi padzapita nthawi yayitali bwanji kuti zodabwitsazi zidzakwaniritsidwe?”
Otu nʼime ha juru nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke guzo nʼakụkụ elu elu nke osimiri ahụ ajụjụ, sị, “Olee mgbe ihe ndị a na-eyi egwu ga-emezu?”
7 Munthu wovala chovala chosalala, amene anali mʼmbali mwa madzi a mu mtsinje uja, anakweza dzanja lake lamanja ndi lamanzere kumwamba, ndipo ndinamumva akulumbira mʼdzina la Wamoyo ku nthawi zonse uja kuti, “Zidzachitika patapita zaka zitatu ndi theka. Zinthu zonsezi zidzachitika akadzatha masautso amene agwera anthu olungama.”
Nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nọ nʼakụkụ elu elu mmiri nke osimiri ahụ chịlịri aka nri na aka ekpe ya elu. Anụkwara m mgbe o ji Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi, “Nʼihe ndị a ga-emezu naanị mgbe afọ atọ na ọkara gafere, tupu onye ahụ na-emebi ike nke ndị dị nsọ ga-abịa nʼisi ngwụcha ndụ ya, ihe ndị a niile ga-emezucha.”
8 Ndinamva, koma sindinamvetsetse. Choncho ndinafunsa kuti, “Mbuye wanga, nanga matsiriziro a zonsezi adzakhala chiyani?”
Anụrụ m ma aghọtaghị m, nʼihi nke a, a sịrị m, “Biko, Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a ga-apụta?”
9 Ndipo anandiyankha kuti, “Pita iwe Danieli, pakuti mawuwa ndi osungidwa ndi omatidwa kufikira nthawi ya chimaliziro.
Ọ sịrị, “Daniel, gawara onwe gị. Nʼihi na-apịachiela okwu ndị a, kachiekwa ya akara tutu ruo nʼọgwụgwụ oge.
10 Anthu ambiri adzayeretsedwa nakhala olungama wopanda chodetsa, koma oyipa adzakhala chiyipire. Palibe mmodzi wa anthu oyipa amene adzamvetsetsa koma okhawo amene ali anzeru adzamvetsetsa.
Ọtụtụ ka a ga-eme ka ha dị ọcha, sachaa ha mee ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ, a ga-anụchakwa ha. Ma ndị ajọ omume ga-aga nʼihu nʼajọ omume ha. O nweghị onye ajọ omume nke ga-aghọtakwa ihe, ma ndị ahụ maara ihe ga-aghọta ihe ihe a pụtara.
11 “Kuyambira pamene nsembe ya tsiku ndi tsiku idzathetsedwa ndi kukhazikitsa kwa chonyansa chobweretsa chisokonezo chija, padzapita masiku 1,290.
“Site nʼoge e mechiri ịchụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị niile ruo nʼoge a ga-ewuli ihe arụ ahụ nke na-eweta mbibi, ga-abụ otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị itoolu.
12 Wodala munthu amene adikirabe nadzafika pa mapeto a masiku 1,335.
Ngọzị ga-adịrị onye ahụ nke na-echere, ma nọgidesịkwa ike ruo mgbe otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị atọ, na iri ụbọchị atọ na ise ahụ gafere.
13 “Koma iweyo Danieli, pitiriza ndipo ulimbikire mpaka matsiriziro. Kenaka udzamwalira. Koma mʼmasiku otsiriza udzauka kuti ulandire gawo lako.”
“Ma gị onwe, gawara onwe gị ruo ọgwụgwụ ihe ndị a. Ị ga-ezukwa ike, ị ga-ebilitekwa nʼoge ikpeazụ ịnara ihe nketa nke ruuru gị.”

< Danieli 12 >