< 2 Mafumu 14 >
1 Mʼchaka chachiwiri cha Yehowasi mwana wa Yowahazi mfumu ya Israeli, Amaziya mwana wa Yowasi mfumu ya Yuda anayamba kulamulira.
Nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoash nwa Jehoahaz nʼIzrel, ka Amazaya nwa Joash eze Juda malitere ọchịchị ya.
2 Iye anali ndi zaka 25 pamene anakhala mfumu ndipo analamulira mu Yerusalemu zaka 29. Amayi ake anali Yehoyadini wa ku Yerusalemu.
Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ bụ eze na Jerusalem iri afọ abụọ na itoolu. Aha nne ya bụ Jehoadin, onye Jerusalem.
3 Iye anachita zolungama pamaso pa Yehova, koma osafanana ndi zomwe anachita Davide kholo lake. Iye anatsatira zochita zonse za Yowasi abambo ake.
O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ma o meghị dịka nna nna ya bụ Devid mere. Nʼihe niile, ọ gbasoro nzọ ụkwụ nna ya Joash.
4 Komabe sanachotse malo opembedzerapo mafano. Anthu anapitiriza kupereka nsembe ndi kufukiza lubani kumeneko.
Ọ wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda gara nʼihu na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ahụ niile.
5 Atakhazikika mu ufumu wake, Amaziya anapha atumiki ake amene anapha abambo ake, mfumu ija.
Mgbe alaeze ahụ siri ike nʼọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya.
6 Komatu iye sanaphe ana a anthu amene anapha abambo ake potsatira zomwe zinalembedwa mʼbuku la Malamulo a Mose. Mʼmenemo Yehova analamula kuti, “Makolo asaphedwe chifukwa cha ana awo, ndipo ana asaphedwe chifukwa cha makolo awo, koma aliyense ayenera kufa chifukwa cha zolakwa zake.”
Ma o meghị ka ụmụ ndị ogbu mmadụ ahụ nwụọ, nʼusoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe Onyenwe anyị nyere iwu sị: “Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.”
7 Iye ndiye amene anapha Aedomu 10,000 mʼchigwa cha Mchere nalanda mzinda wa Sela pa nkhondo ndipo anawutcha Yokiteeli, dzina lake ndi lomwelo mpaka lero lino.
Amazaya bụ onye gburu puku ndị agha Edọm iri na Ndagwurugwu Nnu, dọtakwa obodo Sela nʼagha, gụgharịa ya Jekteel, nke bụ aha a na-akpọ ya ruo ụbọchị taa.
8 Tsono Amaziya anatuma amithenga kwa Yehowasi mwana wa Yehowahazi, mwana wa Yehu mfumu ya Israeli ndi kumuopseza kuti, “Bwera tidzaonane maso ndi maso.”
Mgbe ahụ, Amazaya zigara ndị ozi ka ha jekwuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jehu, eze Izrel, zie ya ozi ịma aka, sị, “Bịa, ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.”
9 Koma Yehowasi mfumu ya Israeli anabweza mawu kwa Amaziya mfumu ya Yuda kuti, “Mtengo wa minga wa ku Lebanoni unatumiza uthenga kwa mkungudza wa ku Lebanoni. ‘Patse mwana wako wamkazi kuti ndimukwatire.’ Kenaka chirombo cha ku Lebanoni chinabwera ndi kupondaponda mtengo wa mingawo.
Ma Jehoash eze Izrel zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda sị ya, “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi, sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ, zọpịa uke ahụ.
10 Inde iwe wagonjetsa Edomu ndipo tsopano wayamba kudzikuza. Dzitamandire chifukwa cha kupambana kwako, koma khala kwanu konko! Nʼchifukwa chiyani ukuyamba dala mavuto amene adzakuwononga pamodzi ndi Yuda?”
I meriela Edọm, nʼezie. Ugbu a, mpako abatala. Ṅụrịa ọṅụ nʼihi mmeri nke i nwetara, ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?”
11 Koma Amaziya sanamvere zimenezi. Choncho Yehowasi mfumu ya Israeli anakamuthira nkhondo. Yehowasi ndi Amaziya anakumana maso ndi maso ku Beti-Semesi mʼdziko la Yuda.
Ma otu ọ dị, Amazaya egeghị ntị. Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha, ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda.
12 Israeli anagonjetsa Yuda ndipo munthu aliyense anathawira kwawo.
Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya.
13 Yehowasi mfumu ya Israeli anagwira Amaziya mfumu ya Yuda, mwana wa Yowasi, mwana wa Ahaziya ku Beti-Semesi. Ndipo anapita ku Yerusalemu nakagwetsa khoma la Yerusalemu kuyambira ku Chipata cha Efereimu mpaka ku Chipata Chapangodya, gawo lotalika mamita 180.
Jehoash bụ eze Izrel nwudere Amazaya bụ eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash gara Jerusalem kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii.
14 Iye anatenga golide ndi siliva yense pamodzi ndi ziwiya zonse zimene zinali mʼNyumba ya Yehova ndi zimene zinali mosungira chuma cha nyumba ya mfumu. Iye anagwiranso anthu nabwerera ku Samariya.
Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọakụ nke ụlọeze. Ọ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria.
15 Ntchito zina za Yehowasi ndi zonse zimene anachita, kuwonjezera za nkhondo yake ndi Amaziya mfumu ya Yuda, kodi sizinalembedwe mʼbuku la mbiri ya mafumu a Israeli?
Ihe banyere akụkọ ndị ọzọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha ọ lụrụ megide Amazaya eze Juda, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
16 Yehowasi anamwalira ndipo anayikidwa mʼmanda mu Samariya pamodzi ndi mafumu a Israeli. Ndipo mwana wake Yeroboamu analowa ufumu mʼmalo mwake.
Jehoash sooro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ, e lie ya na Sameria, ebe e liri eze ndị Izrel ndị ọzọ. Jeroboam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
17 Amaziya mwana wa Yowasi mfumu ya Yuda anakhala zaka khumi ndi zisanu atamwalira Yehowasi mwana wa Yehowahazi mfumu ya Israeli.
Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị.
18 Ntchito zina za Amaziya, kodi sizinalembedwe mʼbuku la mbiri ya mafumu a Yuda?
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amazaya, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
19 Anthu anapangana zomuchita chiwembu mu Yerusalemu ndipo Amaziya anathawira ku Lakisi, koma anatumiza anthu ku Lakisiko nakamuphera komweko.
Ha gbara izuzu imegide ya nʼime Jerusalem, ọ gbapụrụ gbalaga Lakish. Ma ha zipụrụ ndị ikom chụụrụ ya gaa Lakish, gbuo ya nʼebe ahụ.
20 Anabwera naye ku pa kavalo ku Yerusalemu ndi kumuyika mʼmanda pamodzi ndi makolo ake mu Mzinda wa Davide.
Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya na Jerusalem nʼebe e liri ndị nna nna ya ha, nʼobodo Devid.
21 Ndipo anthu onse a ku Yuda anatenga Azariya, amene anali ndi zaka 16 namulonga ufumu mʼmalo mwa abambo ake Amaziya.
Mgbe ahụ, ndị Juda niile duuru Azaraya onye aha ya bụkwa Uzaya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya.
22 Azariya anamanga mzinda wa Elati ndi kuwubwezeretsa ku Yuda, Amaziya atamwalira.
Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.
23 Mʼchaka cha khumi ndi chisanu cha Amaziya mwana wa Yowasi mfumu ya Yuda, Yeroboamu mwana wa Yehowasi mfumu ya Israeli analowa ufumu ku Samariya ndipo analamulira za 41.
Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze.
24 Iye anachita zoyipa pamaso pa Yehova ndipo sanasiye machimo a Yeroboamu mwana wa Nebati, amene anachimwitsa nawo Israeli.
Ma o mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị nʼihi na o wezugaghị onwe ya site na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye ahụ dubara ndị Izrel na mmehie.
25 Iye ndi amene anabwezeretsanso malire a Israeli kuyambira ku Lebo Hamati mpaka ku Nyanja ya Araba, molingana ndi zimene ananena Yehova Mulungu wa Israeli, kudzera mwa mtumiki wake Yona mwana wa Amitai, mneneri wochokera ku Gati-Heferi.
Ọ bụ ya weghachitara oke ala Izrel site na Lebo Hamat ruo nʼosimiri Araba, dịka okwu Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Jona nwa Amitai, onye amụma si Gat Hefa.
26 Pakuti Yehova anaona masautso a Israeli amene anali owawa kwambiri, panalibe kapolo kapena mfulu ngakhale wina aliyense amene akanathandiza Israeli.
Onyenwe anyị hụrụ ọnọdụ ọjọọ nke ndị Izrel nọ nʼime ya; onye ọbụla nʼime ha, ohu na onye nwe onwe ya, nọ nʼoke ahụhụ. Ọ dịkwaghị onye inyeaka ọbụla ha nwere.
27 Pakuti Yehova anali asananene zofafaniza ufumu wa Israeli pa dziko lapansi, Iye anawapulumutsa kudzera mʼdzanja la Yeroboamu mwana wa Yowasi.
Ma ọ bụghị uche Onyenwe anyị ịla Izrel nʼiyi kpamkpam nʼokpuru eluigwe, nʼihi ya ka o mere ka Jeroboam nwa Jehoash napụta ha site nʼaka ndị iro ha.
28 Ntchito zina za Yeroboamu ndi zonse zimene anachita, za kupambana kwake pa nkhondo, za mmene anagonjetsera Damasiko ndi Hamati, imene inali mizinda ya Yuda, kodi sizinalembedwe mʼbuku la mbiri ya mafumu a Israeli?
Akụkọ niile gbasara ihe niile Jeroboam mere, na ike ya niile, na agha niile o buru, na otu o si nwetaghachiri ndị Izrel obodo Damaskọs na Hamat, bụ obodo ndị Juda, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?
29 Yeroboamu anamwalira ndipo anayikidwa mʼmanda pamodzi ndi mafumu a Israeli. Ndipo Zekariya mwana wake analowa ufumu mʼmalo mwake.
Jeroboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ndị eze Izrel nwụrụ anwụ. Ma Zekaraya nwa ya ghọrọ eze Izrel nʼọnọdụ ya.