< 1 Petro 1 >

1 Ndine Petro, mtumwi wa Yesu Khristu. Ndikulemba kalatayi kwa onse osankhidwa ndi Mulungu, alendo mʼdziko lapansi, obalalikira ku Ponto, Galatiya, Kapadokiya, Asiya ndi Bituniya.
Pita, onyeozi Jisọs Kraịst, Na-edegara unu ndị niile ndị a họpụtara, ndị gbara ọsọ ndụ gaa biri na Pọntọs, na Galeshịa, na Kapadosia, Eshịa na Bitinia, akwụkwọ a.
2 Mulungu Atate anakusankhani, atakudziwani kuyambira pachiyambi, ndipo Mzimu Woyera wakuyeretsani kuti mumvere Yesu Khristu ndikutsukidwa ndi magazi ake. Chisomo ndi mtendere zikhale ndi inu mochuluka.
Unu ndị Chineke bụ Nna họpụtara dị ka o bururị ụzọ mata na ọ ga-eme, jirikwa Mmụọ Nsọ ya doo unu nsọ, ka unu na-erubere Jisọs Kraịst isi, ka ewerekwa ọbara ya sachaa unu: Ka amara na udo baara unu ụba.
3 Alemekezedwe Mulungu, Atate wa Ambuye athu Yesu Khristu. Mwachifundo chake chachikulu anatibadwitsa kwatsopano, mʼchiyembekezo chamoyo pomuukitsa Yesu Khristu kwa akufa,
Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst.
4 kuti tidzalandire chuma chomwe sichingawonongeke, kuyipitsidwa kapena kufota. Chuma chimenechi akukusungirani kumwamba.
Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe.
5 Mwachikhulupiriro, mukusungidwa ndi mphamvu ya Mulungu mpaka chipulumutso chitafika chimene chinakonzedwa kuti adzachionetse nthawi yotsiriza.
Anyị bụ ndị e sitere nʼokwukwe na-echekwa nʼike Chineke, tutu ruo ọbịbịa nzọpụta ahụ, nke a na-ejikere ime ka ọ pụta ìhè nʼọgwụgwụ oge.
6 Zimenezi zikukondweretseni kwambiri, ngakhale tsopano, kwa kanthawi kochepa, mukumva zowawa mʼmayesero osiyanasiyana.
Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu.
7 Mayeserowa abwera nʼcholinga chakuti chikhulupiriro chanu, chimene ndi chamtengo woposa wa golide, amene amawonongeka ngakhale amayengedwa ndi moto, chitsimikizike kuti ndi chenicheni. Pamenepo ndiye mudzalandire mayamiko, ulemerero ndi ulemu pamene Yesu Khristu adzaoneka.
Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè.
8 Ngakhale kuti simunamuone, mumamukonda; ndipo ngakhale kuti simukumuona tsopano, mumamukhulupirira ndipo mumakondwera ndi chimwemwe chachikulu ndi chosaneneka.
Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa.
9 Motero mukulandira mphotho ya chikhulupiriro chanu, ndiyo chipulumutso cha moyo wanu.
Ụgwọ ọrụ ọzọ unu ga-enweta nʼihi okwukwe unu nʼime ya ga-abụ nzọpụta a ga-azọpụta mkpụrụobi unu.
10 Kunena za chipulumutso chimenechi, aneneri amene ananeneratu za chisomo chimene chimabwera kwa inu, anafunafuna mofufuzafufuza za chipulumutsochi,
Banyere nzọpụta a, ndị amụma ahụ kwuru ihe banyere amara ahụ gaje ịbịara unu jiri nnọọ nwayọọ nyochasịa
11 kufuna kudziwa nthawi ndi momwe zidzachitikire zinthu zimene Mzimu wa Khristu amene ali mwa iwo ankanenera za kuvutika kwa Khristu, ndi ulemerero umene adzakhale nawo pambuyo pake.
ma gbalịsie ike ịchọpụta oge na ọnọdụ ahụ bụ nke Mmụọ Kraịst dị nʼime ha kwuru banyere ya, mgbe ọ gbara ama maka ahụhụ Kraịst na ebube nke ga-eso ya.
12 Mulungu anawawululira kuti ntchito yawoyo sankayigwira chifukwa cha iwo eni, koma chifukwa inu, pamene iwo ankayankhula zinthu zimene mwamva tsopano kuchokera kwa amene amalalikira Uthenga Wabwino mwamphamvu ya Mzimu Woyera wotumidwa kuchokera kumwamba. Ngakhale angelo amalakalaka kuona nawo zinthuzi.
E mere ka ha mata na ọrụ ha na-arụ abụghị maka ọdịmma nke ha onwe ha, kama ọ bụ nʼihi ọdịmma nke unu, mgbe ha kwuru okwu banyere ihe ndị a ahụ bụ ndị a gwarala unu ugbu a site nʼọnụ ndị ziri unu oziọma nʼike Mmụọ Nsọ nke e si nʼeluigwe zite. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi ka ọ gụrụ agụụ ịmata ihe ndị a.
13 Choncho konzani mtima wanu, khalani odziretsa; khazikitsani chiyembekezo chanu kotheratu pa chisomo chimene mudzapatsidwe pamene Yesu Khristu adzaonekera.
Nʼihi ya, werenụ uche unu niile jikere ịrụ ọrụ, anya dokwaa unu. Nweenụ olileanya zuruoke nʼamara nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jisọs Kraịst.
14 Monga ana omvera, musatsatenso zilakolako zoyipa zomwe munali nazo pamene munali osadziwa.
Dị ka ụmụ na-erube isi, unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nʼọchịchịrị, na-achị ndụ unu.
15 Koma monga amene anakuyitanani ndi woyera, inunso khalani oyera mtima mʼmakhalidwe anu wonse.
Kama bụrụnụ ndị dị nsọ nʼihe niile unu na-eme, dịka onye kpọrọ unu si dị nsọ.
16 Pakuti, kwalembedwa kuti, “Khalani oyera mtima, chifukwa Ine ndine Woyera.”
Nʼihi na e dere ya ede, “Dịnụ nsọ, nʼihi na adị m nsọ.”
17 Popeza mumapemphera kwa Atate amene amaweruza munthu aliyense mopanda tsankho molingana ndi zochita zake, pa nthawi imene muli alendo pa dziko lapansi khalani moopa Mulungu.
Ebe unu na-akpọku Nna ahụ na-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya sịrị dị na-eleghị mmadụ anya nʼihu, bienụ ndụ unu nʼịtụ egwu Chineke, dịka ndị mbịarambịa nʼụwa a.
18 Pakuti mukudziwa kuti simunawomboledwe ndi zinthu zimene zimawonongeka monga siliva kapena golide, kuchoka ku khalidwe lanu lachabe limene munalandira kwa makolo anu.
Nʼihi na unu matara na-ejighị ihe pụrụ imebi emebi, dịka ọlaọcha na ọlaedo gbapụta unu site nʼibi ndụ ọjọọ ahụ nna nna unu ha nyefere unu nʼaka
19 Koma munawomboledwa ndi magazi a mtengowapatali a Khristu, Mwana Wankhosa wopanda banga kapena chilema.
kama ọ bụ ọbara dị oke ọnụahịa nke Kraịst bụ nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ọrụsị.
20 Iye anasankhidwa lisanalengedwe dziko lapansi, koma waonetsedwa chifukwa cha inu pa nthawi ino yotsiriza.
A họpụtara ya tupu e kee ụwa. Kama, ọ bụ nʼọgwụgwụ oge ndị a ka e mere ka ọ pụta ìhè nʼihi unu.
21 Kudzera mwa Iye mumakhulupirira Mulungu, amene anamuukitsa kwa akufa namupatsa ulemerero. Nʼchifukwa chake chikhulupiriro ndi chiyembekezo chanu chili mwa Mulungu.
Ọ bụkwa site nʼaka ya ka unu ji bụrụ ndị kwere na Chineke, onye mere ka o si nʼọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, okwukwe unu na olileanya unu dị na Chineke.
22 Tsopano mwayeretsa mitima yanu pomvera choonadi, kuti muzikondana ndi abale anu, kukondana kwenikweni kochokera pansi pa mtima.
Ugbu a, ebe unu sitere nʼirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, nke mere na unu nwere ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị nʼebe ụmụnna unu nọ, sitenụ nʼobi unu na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nʼebe ọ dị ukwuu.
23 Popeza mwabadwanso, osati ndi mbewu imene imawonongeka, koma imene siwonongeka, ndiye kuti ndi Mawu a Mulungu amoyo ndi okhalitsa. (aiōn g165)
Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa. (aiōn g165)
24 Pakuti, “Anthu onse ali ngati udzu, ndipo ulemerero wawo uli ngati duwa la kuthengo. Udzu umafota ndipo duwa limathothoka,
Nʼihi na, “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,
25 koma mawu a Ambuye adzakhala mpaka muyaya.” Ndipo awa ndi mawu amene tinalalikira kwa inu. (aiōn g165)
ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu. (aiōn g165)

< 1 Petro 1 >