< 1 Mbiri 3 >

1 Ana aamuna a Davide amene anabadwira ku Hebroni anali awa: Woyamba anali Amnoni, amayi ake anali Ahinoamu wa ku Yezireeli; wachiwiri anali Danieli, amayi ake anali Abigayeli wa ku Karimeli;
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Devid, ndị amụụrụ ya mgbe ọ nọ na Hebrọn. Ọkpara ya bụ Amnọn, nke Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ. Nwa ya nke abụọ bụ Daniel, onye nne ya bụ Abigel onye Kamel.
2 wachitatu anali Abisalomu, mwana wa Maaka mwana wa Talimai mfumu ya Gesuri; wachinayi anali Adoniya amayi ake anali Hagiti;
Nke atọ bụ Absalọm, nwa Maaka, nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua. Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit
3 wachisanu anali Sefatiya, amayi ake anali Abitali; wachisanu ndi chimodzi anali Itireamu, amayi ake anali Egila.
Nke ise bụ Shefataya, nwa Abital. Nke isii bụ Itream, nke nwunye ya bụ Egla mụrụ.
4 Ana asanu ndi mmodzi awa a Davide anabadwira ku Hebroni kumene analamulirako zaka zisanu ndi ziwiri ndi miyezi isanu ndi umodzi. Davide analamuliranso mu Yerusalemu kwa zaka 33,
Ụmụ ndị ikom isii ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn, ebe ọ nọ chịa dịka eze afọ asaa na ọnwa isii. Devid chịrị na Jerusalem iri afọ atọ na atọ.
5 ndipo ana amene anabadwira ku Yerusalemuko anali awa: Samua, Sobabu, Natani ndi Solomoni. Ana anayi awa anali a Batisuwa mwana wa Amieli.
Ndị a bụkwa ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan na Solomọn. Mmadụ anọ ndị a bụ ndị Batsheba nwa nwanyị Amiel mụrụ.
6 Anaberekanso Ibihari, Elisua, Elipeleti,
Ndị ọzọ bụkwa Ibha, Elishua, Elifelet,
7 Noga, Nefegi, Yafiya,
Noga, Nefeg, Jafia,
8 Elisama, Eliada ndi Elifeleti, onse analipo asanu ndi anayi.
Elishama, Eliada na Elifelet. Ha niile dị itoolu nʼọnụọgụgụ.
9 Onsewa anali ana a Davide, osawerengera ana a azikazi. Ndipo mlongo wawo anali Tamara.
Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Devid, na-agụnyeghị ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara. Tama bụ nwanne ha nwanyị.
10 Mwana wa Solomoni anali Rehabiamu, Rehabiamu anabereka Abiya, Abiya anabereka Asa, Asa anabereka Yehosafati,
Ndị a bụ ụmụ Solomọn: Rehoboam, na Abija, na Asa, na Jehoshafat,
11 Yehosafati anabereka Yehoramu, Yehoramu anabereka Ahaziya, Ahaziya anabereka Yowasi,
na Joram, na Ahazaya, na Joash,
12 Yowasi anabereka Amaziya, Amaziya anabereka Azariya, Azariya anabereka Yotamu,
na Amazaya, na Azaraya, na Jotam,
13 Yotamu anabereka Ahazi, Ahazi anabereka Hezekiya, Hezekiya anabereka Manase,
na Ehaz, na Hezekaya, na Manase,
14 Manase anabereka Amoni, Amoni anabereka Yosiya.
na Amọn, na Josaya.
15 Ana a Yosiya anali awa: Yohanani mwana wake woyamba, Yehoyakimu mwana wake wachiwiri, Zedekiya mwana wake wachitatu, Salumu mwana wake wachinayi.
Ụmụ ndị ikom Josaya: Johanan nwa mbụ ya, na Jehoiakim nwa ya nke abụọ, na Zedekaya nwa ya nke atọ, na Shalum nwa ya nke anọ.
16 Ana a Yehoyakimu: Yekoniya ndi Zedekiya mwana wake.
Ụmụ Jehoiakim bụ ndị a, Jehoiakin nwa ya, na Zedekaya.
17 Zidzukulu za Yekoniya wa mʼndende zinali izi: mwana wake Silatieli,
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Jehoiakin, eze ahụ a dọtara nʼagha: Shealtiel, nwa ya,
18 Malikiramu, Pedaya, Senazara, Yekamiya, Hosama ndi Nedabiya.
Malkiram, Pedaya, Shenaza, Jekamaya, Hoshama na Nedabaya.
19 Ana a Pedaya anali awa: Zerubabeli ndi Simei. Ana a Zerubabeli anali awa: Mesulamu ndi Hananiya. Mlongo wawo anali Selomiti.
Ụmụ ndị ikom Pedaya bụ Zerubabel na Shimei. Ụmụ ndị ikom Zerubabel bụ ndị a: Meshulam na Hananaya. Shelomit bụ nwanne ha nwanyị.
20 Panalinso ana ena asanu awa: Hasubu, Oheli, Berekiya, Hasabiya ndi Yusabu-Hesedi.
E nwekwara ndị ikom ise ọzọ aha ha bụ Hashuba, Ohel, Berekaya, Hasadaya na Jushab-Hesed.
21 Zidzukulu za Hananiya zinali izi: Pelatiya ndi Yesaiya, ndiponso ana a Refaya, ana a Arinani, ana a Obadiya ndi ana a Sekaniya.
Ụmụ Hananaya mụrụ bụ Pelataya na Jeshaya. Jeshaya mụrụ Refaya; Refaya mụrụ Anan na Ọbadaya, Ọbadaya mụrụ Shekanaya.
22 Zidzukulu za Sekaniya zinali izi: Semaya ndi ana ake: Hatusi, Igala, Bariya, Neariya ndi Safati. Onse anali asanu ndi mmodzi.
Ụmụ Shekanaya bụ ndị a: Shemaya na ụmụ ya ndị ikom: Hatush, Igal, Bariya, Nearaya na Shafat. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ.
23 Ana a Neariya anali awa: Eliyoenai, Hezekiya ndi Azirikamu. Onse anali atatu.
Ụmụ Nearaya bụ ndị a, Elioenai, Hezekaya na Azrikam. Ha dị atọ nʼọnụọgụgụ.
24 Ana a Eliyoenai: Hodaviya, Eliyasibu, Pelaya, Akubu, Yohanani, Delaya ndi Anani, onse anali asanu ndi awiri.
Ndị Elioenai mụrụ bụ ndị a: Hodavaya, Eliashib, Pelaya, Akub, Johanan, Delaya na Ananị. Ha niile dị asaa nʼọnụọgụgụ.

< 1 Mbiri 3 >