< 1 Mbiri 15 >

1 Davide atadzimangira nyumba zina mu Mzinda wa Davide, iye anakonza malo a Bokosi la Mulungu ndipo analimangira tenti.
Mgbe Devid wuchara ụlọ obibi ya nʼobodo Devid, o doziri ebe a ga-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ọ mara ụlọ ikwu maka ya.
2 Pamenepo Davide anati, “Palibe wina ati anyamule Bokosi la Mulungu koma Alevi chifukwa Yehova anawasankha kuti azinyamula Bokosi la Yehova ndi kumatumikira pamaso pake nthawi zonse.”
Devid kwuru sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ebu igbe Chineke karịakwa ndị Livayị, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara ha ibu igbe Onyenwe anyị na ije ozi nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”
3 Davide anasonkhanitsa Aisraeli onse mu Yerusalemu kuti abweretse Bokosi la Yehova ku malo amene analikonzera.
Ya mere, Devid kpọkọtara ndị Izrel niile, na Jerusalem ibubata igbe Onyenwe anyị nʼebe ahụ ọ kwadoro na a ga-adọsa ya.
4 Iye anayitanitsa pamodzi zidzukulu za Aaroni ndi Alevi:
Ọ kpọkọtara ụmụ Erọn na ndị Livayị:
5 kuchokera ku banja la Kohati, mtsogoleri Urieli ndi abale ake 120.
Ndị Kohat na ụmụnna ha dị otu narị na iri abụọ. Uriel bụ onyeisi ha.
6 Kuchokera ku banja la Merari, mtsogoleri Asaya ndi abale ake 220;
Ụmụ Merari na ụmụnna ha dị narị abụọ na iri abụọ. Asaya bụ onyeisi ha.
7 kuchokera ku banja la Geresomu, mtsogoleri Yoweli ndi abale ake 130;
Ụmụ Geshọm na ụmụnna ha dị otu narị na iri atọ. Juel bụ onyeisi ha.
8 kuchokera ku banja la Elizafani, mtsogoleri Semaya ndi abale ake 200;
Ụmụ Elizafan na ụmụnna ha dị narị abụọ. Shemaya bụ onyeisi ha.
9 kuchokera ku banja la Hebroni, mtsogoleri Elieli ndi abale ake 80;
Ụmụ Hebrọn na ụmụnna ha dị iri asatọ. Eliel bụ onyeisi ha.
10 kuchokera ku banja la Uzieli, mtsogoleri Aminadabu ndi abale ake 112.
Ụmụ Uziel na ụmụnna ha dị otu narị na iri na abụọ. Aminadab bụ onyeisi ha.
11 Kenaka Davide anayitanitsa ansembe Zadoki ndi Abiatara, ndi Alevi awa, Urieli, Asaya, Yoweli, Semaya, Elieli ndi Aminadabu.
Devid kpọrọ Zadọk na Abịata, ndị nchụaja na Uriel, Asaya, Juel, Shemaya, Eliel, na Aminadab ndị Livayị sị ha,
12 Iye anawawuza kuti, “Inu ndinu atsogoleri a mabanja a Alevi ndipo inu ndi abale anu Alevi mudziyeretse nokha ndi kubweretsa Bokosi la Yehova Mulungu wa Israeli ku malo amene ine ndalikonzera.
“Unu bụ ndịisi ezinaụlọ dị iche iche, nʼebo Livayị. Doonụ onwe unu nsọ unu na ụmụnna unu ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel nʼebe a m doziri nʼihi ya.
13 Popeza kuti inu Alevi simunalinyamule poyamba paja, Yehova Mulungu wathu anatikantha. Sitinafunse momwe tikanachitira monga mmene Iyeyo anafotokozera.”
Na mbụ, Onyenwe anyị Chineke tara anyị ahụhụ nʼihi na anyị esoghị omenaala ime ka unu bụ ndị Livayị buru ya. Anyị ajụtaghị ya ase otu a ga-esi bulata ya nʼụzọ o kwesiri.”
14 Kotero ansembe ndi Alevi anadziyeretsa ndi cholinga chakuti akatenge Bokosi la Yehova Mulungu wa Israeli.
Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị mezuru omenaala ido onwe ha nsọ maka ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel ahụ.
15 Ndipo Alevi ananyamula Bokosi la Mulungu pa mapewa awo pa mitengo yake yonyamulira monga momwe Mose analamulira molingana ndi mawu a Yehova.
Ndị Livayị jiri osisi ogologo buru igbe Chineke ahụ nʼisi ubu aka ha dịka Mosis nyere nʼiwu nʼusoro dịka okwu Onyenwe anyị si dị.
16 Davide anawuza atsogoleri a Alevi kuti asankhe abale awo kuti akhale oyimba nyimbo zachisangalalo, zoyimba ndi zida: azeze, apangwe ndi ziwaya za malipenga.
Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene.
17 Kotero Alevi anasankha Hemani mwana wa Yoweli; ndipo mwa abale ake anasankha Asafu mwana wa Berekiya; ndipo mwa ana a Merari, abale awo, anasankha Etani mwana wa Kusaya;
Ndị Livayị họpụtara Heman nwa Juel; ma site nʼetiti ụmụnna Juel ha họpụtara Asaf, nwa Berekaya. Sitekwa nʼetiti ụmụnna ha ndị Merari ha họpụtara Etan nwa Kushaya,
18 ndipo pamodzi ndi iwowa abale awo otsatana nawo: Zekariya, Yaazieli, Semiramoti, Yehieli, Uni, Eliabu, Benaya, Maaseya, Matitiya, Elifelehu, Mikineya, Obedi-Edomu ndi Yeiyeli, alonda a pa chipata.
tinyere ndị a, ha họpụtara ụmụnna ha ndị a, ndị na-esote ha nʼọkwa: Zekaraya, Jaaziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Benaya, Maaseia, Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm na Jeiel bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
19 Anthu oyimba aja Hemani, Asafu ndi Etani ndiwo ankayimba ziwaya za malipenga zamkuwa;
Heman, Asaf na Etan ka a họpụtara maka ịkụ ogene bronz.
20 Zekariya, Azieli, Semiramoti, Yehieli, Uni, Eliabu, Maaseya ndi Benaya ankayimba azeze a liwu lokwera;
Zekaraya na Aziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Maaseia na Benaya bụ ndị na-akpọ ụbọ akwara dịka usoro abụ alamot, si dị
21 ndipo Matitiya, Elifelehu, Mikineya, Obedi-Edomu, Yeiyeli ndi Azaziya ankayimba apangwe a liwu lotsika.
Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm, Jeiel na Azazaya bụkwa ndị na-akpọ une dịka usoro abụ Sheminit si dị.
22 Kenaniya, mtsogoleri wa Alevi anali woyangʼanira mayimbidwe; uwu ndiye unali udindo wake pakuti anali waluso pa zimenezi.
Onyeisi ndị na-abụ abụ a họpụtara bụ Kenaniya, onye bụkwa onyeisi ndị Livayị. A họpụtara ya nʼihi na ọ bụ onye nwere nghọta banyere abụ.
23 Berekiya ndi Elikana anali olondera pa khomo la bokosilo.
Berekaya na Elkena bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị.
24 Ansembe awa; Sebaniya, Yehosafati, Netaneli, Amasai, Zekariya, Benaya ndi Eliezara ndiwo ankayimba malipenga patsogolo pa Bokosi la Mulungu. Obedi-Edomu ndi Yehiya analinso alonda a pa khomo la bokosilo.
Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amasai, Zekaraya, Benaya na Elieza, ndị bụ ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Obed-Edọm na Jehaya ga-esokwa ndị ga-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị nche.
25 Choncho Davide pamodzi ndi akuluakulu a Israeli ndiponso asilikali olamulira magulu a anthu 1,000, anapita kukatenga Bokosi la Chipangano la Yehova ku nyumba ya Obedi-Edomu akukondwera.
Devid na ndị okenye Izrel, na ndịisi agha na-achị puku ndị agha, ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ.
26 Popeza Mulungu anathandiza Alevi amene ananyamula Bokosi la Chipangano la Yehova, anapereka nsembe ngʼombe zazimuna zisanu ndi ziwiri ndiponso nkhosa zazimuna zisanu ndi ziwiri.
Nʼihi na Chineke nyeere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị aka, ọ bụ oke ehi asaa na ebule asaa ka a chụrụ nʼaja.
27 Ndipo Davide anali atavala mkanjo wa nsalu yofewa yosalala, monga anavalira Alevi onse amene ananyamula bokosi pamodzi anthu oyimba, ndiponso Kenaniya, amene anali woyangʼanira magulu oyimba. Davide anavalanso efodi ya nsalu yofewa yosalala.
Ọ bụ ezi akwa ọcha ka e ji kee Devid ekike, dịka ndị Livayị niile bụ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na ndị ọbụ abụ, na Kenaniya, bụ onyeisi otu ndị na-abụ abụ yi akwa ọcha nʼahụ ha. Devid yikwa uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ.
28 Kotero Aisraeli onse anabweretsa Bokosi la Chipangano la Yehova ndi mfuwu, ndiponso akuyimba zitoliro zanyanga zankhosa zazimuna, malipenga ndi maseche ndiponso akuyimba azeze ndi apangwe.
Ya mere, ndị Izrel niile ji iti mkpu, na-ịfụ opi mpi ebule na-ịfụ opi ike, ịkpọ ụbọ akwara, ịkụ ogene na une, bulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
29 Bokosi la Chipangano la Yehova likulowa mu Mzinda wa Davide, Mikala mwana wamkazi wa Sauli ankaona ali pa zenera. Ndipo ataona Mfumu Davide ikuvina ndi kukondwera, iye ananyoza Davideyo mu mtima mwake.
Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal nwa Sọl, lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-ayọrị egwu na-aṅụrị ọṅụ, o ledara ya anya nʼime obi ya.

< 1 Mbiri 15 >