< 1 Mbiri 12 >
1 Nawa anthu amene anabwera kwa Davide ali ku Zikilagi pamene iye anathamangitsidwa ndi Sauli mwana wa Kisi (iwowo anali mʼgulu la asilikali amene ankamuthandiza pa nkhondo.
Ndị a bụ ndị ikom bịakwutere Devid na Ziklag, mgbe e si nʼihu Sọl nwa Kish chụpụ ya. (Ha so nʼime ndị ọka agha nyeere Devid aka ibu agha.
2 Iwo anali ndi mauta ndipo amadziwa kuponya mivi komanso miyala, ndipo amatha kuponyera dzanja lamanja kapena lamanzere. Iwo anali abale ake a Sauli ochokera ku fuko la Benjamini.
Ngwa agha ha bụ ụta, ha nwere ike iji aka nri maọbụ aka ekpe gbapụ àkụ maọbụ fee ebe; ndị a bụ ndị ikwu Sọl si nʼebo Benjamin.)
3 Mtsogoleri wawo anali Ahiyezeri ndi Yowasi ana a Semaya wa ku Gibeya; Yezieli ndi Peleti ana a Azimaveti; Beraka, Yehu wa ku Anatoti,
Onyeisi ha bụ Ahieza na Joash, bụ ụmụ Shema onye Gibea. Ndị ọzọ bụ, Jeziel na Pelet ụmụ Azmavet, Beraka, Jehu onye Anatot,
4 ndi Isimaiya wa ku Gibiyoni, munthu wamphamvu mʼgulu la anthu makumi atatu aja, yemwenso anali mtsogoleri wawo; Yeremiya, Yahazieli, Yohanani, Yozabadi wa ku Gederi,
Ishmaya onye Gibiọn, dimkpa nʼetiti iri mmadụ atọ ndị ahụ, onye bụ onyendu iri mmadụ atọ ahụ, Jeremaya, Jahaziel, Johanan, Jozabad onye Gedera,
5 Eluzai, Yerimoti, Bealiya, Semariya ndi Sefatiya Mharufi;
Eluzai, Jerimot, Bealia, Shemaraya, na Shefataya onye Haruf;
6 Elikana, Isiya, Azareli, Yowezeri ndi Yasobeamu a ku banja la Kora;
Elkena, Ishaya, Azarel, Joeza na Jashobeam, ndị Kora;
7 ndi Yowela ndi Zebadiya ana a Yerohamu wa ku Gedori.
Juela na Zebadaya ụmụ Jeroham onye Gedoa.
8 Asilikali ena a fuko la Gadi anathawira kwa Davide ku linga lake ku chipululu. Iwo anali asilikali olimba mtima, okonzekera nkhondo ndipo amadziwa kugwiritsa ntchito chishango ndi mkondo. Iwowo anali woopsa ngati mikango ndipo anali aliwiro ngati ngoma zamʼmapiri.
Ndị a bụkwa dike nʼagha sitere nʼebo Gad gbasoo Devid nʼebe e wusiri ike ya dị nʼọzara. Ha bụkwa ndị ọka nʼiji ùbe na ọta alụ agha. Ha dịkwa gara gara dịka ele nʼelu ugwu, ihu ha dịkwa ka ihu ọdụm.
9 Mtsogoleri wawo anali Ezeri, wotsatana naye anali Obadiya, wachitatu anali Eliabu,
Eza, bụ onyeisi ha. Ọbadaya bụ onye na-eso ya, tupu Eliab esoro.
10 wachinayi anali Misimana, Yeremiya anali wachisanu,
Onye nke anọ bụ Mishmana. Ndị ọzọ nʼusoro ha bụ, Jeremaya,
11 wachisanu ndi chimodzi anali Atai, Elieli anali wachisanu ndi chiwiri,
na Atai bụ nke isii, na Eliel bụ nke asaa,
12 wachisanu ndi chitatu anali Yohanani, Elizabadi anali wachisanu ndi chinayi,
na Johanan bụ nke asatọ, na Elzabad bụ nke itoolu,
13 wakhumi anali Yeremiya ndipo Makibanai anali wa 11.
na Jeremaya onye nke iri, nakwa Makbanai onye nke iri nʼotu.
14 Anthu a fuko la Gadi amenewa anali atsogoleri; angʼonoangʼono amalamulira anthu 100 pamene akuluakulu amalamulira anthu 1,000.
Ndị a, ndị sitere nʼebo Gad bụ ndịisi agha. Onye na-adịghị ike nʼime ha dị ike dịka narị ndị agha, ma onye dị ike nʼime ha dị ike dịka puku ndị agha.
15 Awa ndi amene anawoloka Yorodani mwezi woyamba pamene mtsinje unali utasefukira mbali zonse, ndipo anathamangitsa aliyense amene amakhala mʼchigwa, mbali ya kumadzulo ndi kummawa.
Ọ bụ ha gafere osimiri Jọdan nʼudu mmiri, mgbe Jọdan tofere akụkụ ya niile, chụsaa ndị niile bi na ndagwurugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.
16 Anthu ena a fuko la Benjamini ndi ena ochokera ku Yuda anabweranso kwa Davide pamene anali ku linga lake.
Ndị ọzọ sitekwara nʼebo Benjamin na Juda bịakwute Devid nʼebe ya e wusiri ike.
17 Davide anapita kukakumana nawo ndipo anati, “Ngati mwabwera kwa ine mwamtendere, kuti mundithandize, ndakonzeka kugwirizana nanu. Koma ngati mwabwera kudzandipereka kwa adani anga, ngakhale kuti sindinalakwe, Mulungu wa makolo anthu aone izi ndipo akuweruzeni.”
Mgbe ahụ, Devid pụrụ ịga zute ha, sị ha, “Ọ bụrụ na unu bịara nʼudo inyere m aka, ejikeere m ịnabata unu ka unu dịnyere m. Kama ọ bụrụkwanụ na unu bịara ịrara m nye nʼaka ndị iro m, ebe aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hụ ihe dị unu nʼobi kpee unu ikpe.”
18 Kenaka Mzimu anabwera pa Amasai, mtsogoleri wa anthu makumi atatu aja ndipo anati: “Inu Davide, ife ndife anu! Tili nanu limodzi, inu mwana wa Yese! Kupambana, Kupambana kwa inu, ndiponso kupambana kukhale kwa iwo amene akukuthandizani pakuti Mulungu wanu adzakuthandizani.” Kotero Davide anawalandira ndipo anawayika kukhala atsogoleri a magulu ake a ankhondo.
Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ dakwasịrị Amasai, onyendu iri ndị ikom atọ ahụ, mee ka ọ gwa Devid okwu sị ya, “Anyị bụ ndị gị, Devid! Anyị so gị nʼazụ, gị nwa Jesi! Udo, udo ga-abụ nke gị, udo ga-abụkwa nke ndị na-enyere gị aka, nʼihi na Chineke gị na-enyere gị aka.” Ya mere, Devid nabatara ha mee ha ndịisi agha na-apụnara ndị mmadụ ihe.
19 Anthu ena a fuko la Manase anathawira kwa Davide pamene anapita ndi Afilisti kukamenyana ndi Sauli. (Iye ndi anthu ake sanathandize Afilisti chifukwa, atsogoleri awo atakambirana, anamubweza Davide. Iwo anati, “Ife tidzawonongedwa ngati uyu adzabwerera kwa mbuye wake Sauli).”
Ụfọdụ nʼime ndị ebo Manase gbasooro Devid, mgbe ọ gara sonyere ndị Filistia nʼịlụso Sọl ọgụ. Ma ya na ndị agha ya enyereghị ndị Filistia aka, nʼihi na mgbe ndị Filistia gbachara izu, ndị ndu ndị Filistia zilagara ya. Ha kwuru sị, “Isi anyị ka anyị ga-atụfu ma ọ bụrụ na Devid ahapụ anyị nʼọgbọ agha gbakwuru nna ya ukwu bụ Sọl.”
20 Davide atapita ku Zikilagi, anthu a fuko la Manase amene anathawira kwa iye anali awa: Adina, Yozabadi, Yediaeli, Mikayeli, Yozabadi, Elihu ndi Ziletai; atsogoleri a magulu a anthu 1,000 a ku Manase.
Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase.
21 Iwowa anathandiza Davide kulimbana ndi magulu achifwamba, pakuti onsewa anali asilikali olimba mtima ndipo anali atsogoleri mʼgulu lake la ankhondo.
Ha nyeere Devid aka imegide ndị agha nkwata ahụ, nʼihi na ha niile bụ dike nʼagha, bụrụkwa ndịisi agha.
22 Tsiku ndi tsiku anthu amabwera kudzathandiza Davide, mpaka anakhala ndi gulu lalikulu la ankhondo, ngati gulu la ankhondo a Mulungu.
Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke.
23 Nachi chiwerengero cha magulu a anthu ankhondo amene anabwera kwa Davide ku Hebroni kudzapereka ufumu wa Sauli kwa iye, monga momwe ananenera Yehova:
Ndị a bụ ndị jikeere ibu agha, ndị chịkwa ngwa agha bịakwute Devid na Hebrọn, nʼihi na ha chọrọ ka ọ bịa bụrụ eze ha nʼọnọdụ Sọl, dịka Onyenwe anyị kwuru.
24 Anthu a fuko la Yuda onyamula chishango ndi mkondo analipo 6,800;
Ndị sitere nʼebo Juda, ndị bu ọta na ùbe ha dị puku isii na narị asatọ.
25 Anthu a fuko la Simeoni, asilikali okonzekera nkhondo analipo 7,100;
Ndị Simiọn a maara aha ha nʼibu agha dị puku asaa na otu narị.
26 Anthu a fuko la Levi analipo 4,600,
Ndị Livayị dị puku anọ na narị isii.,
27 mtsogoleri Yehoyada wa banja la Aaroni anabweranso ndi anthu 3,700,
tinye Jehoiada, onyendu nʼezinaụlọ Erọn na puku ndị ikom atọ na narị asaa,
28 ndi Zadoki, mnyamata wankhondo wolimba mtima, anabwera ndi akuluakulu 22 ochokera mʼbanja lake;
na Zadọk, nwokorobịa bụ dike na dimkpa nʼagha, onyendu ndịisi agha iri abụọ na abụọ ndị si nʼezinaụlọ ya.
29 Anthu a fuko la Benjamini, abale ake a Sauli analipo 3,000 ndipo ambiri anali ndi Sauli ku nyumba yake pa nthawiyi;
Ụmụ Benjamin, ndị ikwu Sọl, dị puku atọ, nʼihi na nʼoge a, ọtụtụ ha nọnyeere Sọl.
30 Anthu a fuko la Efereimu, asilikali olimba mtima, otchuka pa mabanja awo analipo 20,800;
Ụmụ Ifrem dị iri puku abụọ na narị asatọ, ndị dị ike nʼagha, ndị a makwaara aha ha nʼikwu ha.
31 Anthu a fuko latheka la Manase amene anawayitana kuti adzakhazikitse nawo ufumu wa Davide analipo 18,000;
Site nʼọkara ebo Manase, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ ka a họpụtara ịga inyere Devid aka ịbụ eze.
32 Anthu a fuko la Isakara amene ankazindikira nthawi ndipo amadziwa zimene Israeli ankayenera kuchita, analipo atsogoleri 200 pamodzi ndi abale awo onse amene amawatsogolera.
Ụmụ Isaka; narị ndịisi abụọ, na ndị ha na-edu. Ndịisi a bụ ndị nwere nghọta oge ha nọ nʼime ya marakwa ihe Izrel kwesiri ime nʼoge ahụ.
33 Anthu a fuko la Zebuloni, analipo 5,000. Iwowa anali asilikali odziwa bwino nkhondo, okhala ndi zida za mtundu uliwonse, okonzekera kudzathandiza Davide ndi mtima umodzi.
Ụmụ Zebụlọn dị iri puku ise. Ha enweghị obi abụọ ọbụla iso Devid. A zụkwara ha nʼiji ụdị ngwa agha ọbụla na-ebu agha.
34 Anthu a fuko la Nafutali, analipo atsogoleri 1,000 pamodzi ndi anthu 37,000 onyamula zishango ndi mikondo;
Ọnụọgụgụ ndị ndu ụmụ Naftalị dị otu puku, tinyere ndị agha dị puku iri atọ na asaa, ndị ji ùbe na ọta.
35 Anthu a fuko la Dani, okonzekera nkhondo analipo 28,600.
Ụmụ Dan dị iri puku abụọ na asatọ, na narị isii. Ha bụkwa ndị agha jikeere ibu agha.
36 Anthu a fuko la Aseri, asilikali odziwa bwino nkhondo, okonzekeradi nkhondo analipo 40,000;
Ụmụ Asha dị iri puku anọ. Ha bụ ndị ibu agha doro nnọọ anya.
37 Ndipo kuchokera kummawa kwa Yorodani, anthu a fuko la Rubeni, Gadi ndi theka la fuko la Manase, amene anali ndi zida za mtundu uliwonse analipo 120,000.
Sitekwa nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, site nʼebo Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase bi, ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku na iri abụọ, ndị ji ụdị ngwa agha ọbụla pụtara soro Devid. Ha bukwa ngwa agha ha pụta.
38 Onsewa anali anthu odziwa kumenya nkhondo amene anadzipereka ku magulu awo. Iwo anabwera ku Hebroni ali otsimikiza kudzamuyika Davide kukhala mfumu ya Aisraeli. Aisraeli ena onse anali ndi mtima umodzinso womuyika Davide kukhala mfumu.
Ndị a niile bụ ndị agha na-eje ozi nʼusoro ndị ji obi ha pụta. Ha nwekwara mkpebi mgbe ha si ebe ọbụla ha si pụta ịbịa Hebrọn ime Devid eze. Ndị Izrel niile jikwa otu obi pụta ime Devid eze Izrel.
39 Anthuwa anakhala ndi Davide masiku atatu akudya ndi kumwa pakuti mabanja awo anawapatsa zakudya.
Mgbe ha pụkwutere Devid, ha so ya rie, ṅụọ, abalị atọ. Ọ bụkwa ihe ndị ezinaụlọ ha kwadoro ha ji bịa ka ha riri.
40 Komanso anthu oyandikana nawo ochokera ku Isakara, Zebuloni ndi Nafutali anabweretsa zakudya pa abulu, ngamira, nyulu ndi ngʼombe. Panali ufa wambiri, makeke ankhuyu, ntchintchi za mphesa, vinyo, mafuta, ngʼombe, nkhosa ndi mbuzi, popeza munali chimwemwe mu Israeli.
Ndị Isaka, na Zebụlọn, na Naftalị si ebe dị anya bute nri. Ịnyịnya ibu, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya muul na ehi ka ha ji bute nri ndị a. Ọ bụkwa nri dị iche iche ka ha butere, dịka ụtụ ọka, na achịcha e ji mkpụrụ fiig mee, na achịcha ndị ọzọ dị iche, na mmanya, na mmanụ, na igwe ehi, na igwe atụrụ. Ha si otu a bute nri ndị a nʼihi na oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile.