< Захария 12 >

1 Господното слово наложено на мене за Израиля: - Така казва Господ, Който простря небето, И основа земята, И образува в човека духа му:
Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị banyere Izrel. Ọ bụ amụma. Onyenwe anyị, onye gbasapụrụ eluigwe niile, onye tọrọ ntọala ụwa, na onye kpụrụ mmụọ nke dị nʼime mmadụ, ekwupụtala, sị,
2 Ето, Аз правя Ерусалим омайна чаша На всичките околни племена; И това ще бъде и за Юда В обсадата против Ерусалим.
“Agaje m ime Jerusalem ka ọ bụrụ iko mmanya nke ga-aṅagharị ndị niile gbara ya gburugburu. Ha ga-agba Juda na Jerusalem gburugburu, nọbichie ụzọ ya niile.
3 В оня ден ще направя Ерусалим Утегчителен камък на всичките племена; Всички, които се натоварят с него, ще се смажат; И против него ще се съберат всичките народи на света.
Nʼụbọchị ahụ, mgbe mba niile nke ụwa chịkọtara onwe ha ọnụ imegide ya, aga m eme Jerusalem ka ọ ghọọrọ mba ndị ahụ niile nkume dị ukwuu nke a na-apụghị inugharị enugharị. Ndị niile ga-agbalị inugharị ya ga-emerụ onwe ha ahụ.
4 В оня ден, казва Господ, Ще поразя всеки кон с ужас, И ездача му с изумление; А като отворя очите Си над Юдовия дом, Ще поразя със слепота всеки кон на племената.
Nʼụbọchị ahụ, aga m etinye ụjọ nʼobi ịnyịnya niile, mee ka ndị na-agba ha ghọọ ndị ara,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m asaghe anya m lekwasị ụlọ Juda nke ọma, ma aga m eme ka ịnyịnya niile nke mba niile kpuo ìsì.
5 И Юдовите началници ще рекат в сърцето си: Ерусалимските жители са моя подпорка Чрез Господа на Силите, техния Бог.
Mgbe ahụ, ndị ndu Juda ga-ekwu nʼobi ha sị, ‘Ndị Jerusalem achọtala ike nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha.’
6 В оня ден ще направя Юдовите началници Като жарник с огън между дърва, И като запален факел всред снопове; Те ще погълнат всичките околни племена Отдясно и отляво, И Ерусалим пак ще се насели на своето си място, В Ерусалим.
“Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka ndị ndu Juda niile dịrị ka ite ọkụ, nke a dọnyere nʼebe a chịkọtara nkụ. Ha ga-adịkwa ka ọkụ na-enwu enwu, nke dị nʼetiti ukwu ọka. Ha ga-ere ọkụ nʼaka nri na nʼaka ekpe, rechapụ ndị niile bi gburugburu ha. Ma mmadụ ga-ejupụtakwa nʼime Jerusalem.
7 И Господ ще избави първо Юдовите шатри, За да не се възвеличи над Юда славата на Давидовия дом И славата на ерусалимските жители.
“Onyenwe anyị ga-ebu ụzọ zọpụta ebe obibi niile nke Juda, ime ka ugwu na nsọpụrụ nke ụlọ Devid, na nke ndị niile bi na Jerusalem ghara ịdị ukwuu karịa nke Juda.
8 В оня ден Господ ще защити ерусалимските жители, Слабите между тях в оня ден ще бъдат като Давида, И Давидовият дом като Бога, Като ангел Господен пред тях.
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-echebe ndị bi na Jerusalem, mee ka ọ bụladị ndị na-asọ ngọngọ nʼetiti ha dịrị ike dịka Devid. Ụlọ Devid ga-adịkwa ka Chineke, dịka Mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye na-eje nʼihu ha.
9 В оня ден Ще потърся да изтребя всичките народи, Които идат против Ерусалим;
Nʼụbọchị ahụ, aga m ebido ibibi mba ndị ahụ niile na-ebuso Jerusalem agha.
10 А на Давидовия дом И на ерусалимските жители Ще излея дух на благодат и на моление; И те ще погледнат на Мене, Когото прободоха; И ще плачат за Него Както плаче някой за едничкия си син, И ще скърбят горчиво за Него Както скърби някой за първородния си.
“Mgbe ahụ, aga m awụkwasị nʼụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem, mmụọ nke amara na nke arịrịọ amara. Ha ga-elegidekwa m anya, bụ onye ahụ ha mapuru ahụ. Ha ga-eru ụjụ nʼihi ya, dịka mmadụ si eru ụjụ nʼihi ọnwụ nke nwa a mụrụ naanị ya. Ha ga-ebekwa akwa ilu nke ukwuu dịka mmadụ sị ebe akwa maka nwa mbụ ya.
11 В оня ден ще има голямо жалеене в Ерусалим, Като жалеенето при Ададримон в полето Магедон.
Nʼụbọchị ahụ, akwa a ga-akwa na Jerusalem ga-adị ukwuu, dịka akwa nke Hadad Rimọn nʼobosara ala Megido.
12 Земята ще жалее, Всяко домочадие насаме: Домочадието на Давидовия дом насаме, И жените им насаме; Домочадието на Натановия дом насаме, И жените им насаме;
Ndị ala ahụ niile ga-eru ụjụ. Ikwu ọbụla ga-eru ụjụ nke ha, ha na ndị nwunye ha. Ikwu Devid na ndị nwunye ha, na ikwu Netan na ndị nwunye ha,
13 Домочадието на Левиевия дом насаме, И жените им насаме; Домочадието на Семея насаме, И жените им насаме;
na ikwu Livayị, na ndị nwunye ha, na ikwu Shimei na ndị nwunye ha,
14 Всичките останали домочадия, Всяко домочадие насаме, И жените им насаме.
na ikwu ndị ọzọ niile na ndị nwunye ha.

< Захария 12 >