< 1 Летописи 18 >
1 След това Давид порази филистимците и ги покори, и отне Гет и селата му от ръката на филистимците.
Mgbe nke a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia, mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Gat na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu site nʼaka ndị Filistia.
2 Порази и моавците; и моавците станаха Давидови слуги и плащаха данък.
Devid merikwara ndị Moab, ha ghọrọ ndị ohu ya, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.
3 Давид още порази совския цар Ададезер в Емат, като последният отиваше да утвърди властта си на реката Евфрат.
Devid merikwara Hadadeza eze Zoba, na nso Hamat, mgbe ọ na-aga iguzobe ogidi eji mara ya nʼakụkụ osimiri Yufretis.
4 Давид му отне хиляда колесници, седем хиляди конници и двадесет хиляди пешаци и Давид пресече жилите на всичките колеснични коне, само че запази от тях за сто колесници.
Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
5 И когато дамаските сирийци дойдоха за да помогнат на совския цар Ададезер, Давид порази от сирийците двадесет и две хиляди мъже.
Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.
6 Тогава Давид постави гарнизон в дамаска Сирия; и сирийците станаха Давидови слуги и плащаха данък. И Господ запазваше Давида където и да отиваше.
O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs, ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwara ya ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
7 И Давид взе златните щитове, които бяха върху слугите на Ададезера, та ги донесе в Ерусалим.
Devid chịkọtara ọta ọlaedo nke ndịisi agha Hadadeza na-ebu na Jerusalem.
8 И от Тиват и от Хун, Ададезериви градове, Давид взе твърде много мед, от която Соломон направи медното море, стълбовете и медните съдове.
Site na Tibhat nakwa Kun, bụ obodo ndị Hadadeza na-achị, Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu, nke Solomọn ji kpụọ Osimiri bronz ahụ, ogidi niile na ngwongwo ndị ọzọ niile nke e ji bronz kpụọ.
9 А ематският цар Той, когато чу, че Давид порази всичката сила на совския цар Ададезер,
Mgbe Tou eze Hamat nụrụ na Devid emeriela ndị agha niile nke Hadadeza, eze Zoba,
10 прати сина си Адорам при цар Давида за да го поздрави и да го благослови понеже се бил против Ададезера и го поразил, защото Ададезер често воюваше против Тоя. И Адорам донесе със себе си всякакви златни, сребърни и медни съдове;
o zipụrụ Hadoram nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee eze Devid nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Hadoram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaedo, nke ọlaọcha na nke bronz dị iche iche bịa.
11 па и тях цар Давид посвети на Господа, заедно със среброто и златото, което беше отнел от всичките народи, от Едом, от Моав, от амонците, от филистимците и от Амалика.
Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o mere ọlaọcha na ọlaedo o wetara na mba ndị a: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek.
12 При това, Ависей, Саруиният син, порази осемнадесет хиляди едомци в долината на солта.
Abishai nwa Zeruaya gburu puku ndị Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu.
13 И постави гарнизони в Едом, и всичките едомци се подчиниха на Давида. И Господ запазваше Давида където и да отиваше.
O wuru ogige ndị agha nʼEdọm, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
14 Така Давид царува над целия Израил, и съдеше всичките си люде и им раздаваше правда.
Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi.
15 А Иоав, Саруиният син беше над войската; а Иосафат, Ахилудовият син, летописец;
Joab nwa Zeruaya bụ onyeisi agha ya; Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta akụkọ.
16 а Садок, Ахитововият син и Авимелех, Авиатаровият син, свещеници; а Суса, секретар;
Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja. Shavsha bụ ode akwụkwọ eze.
17 а Ванаия, Иодаевият син, беше над херетците и фелетците; а Давидовите синове бяха първенци около царя.
Benaya nwa Jehoiada bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndịisi nʼọrụ eze.