< Romawa 6 >

1 Zizan ki tre ngye? Kita lah tre chachuu ni du ndindi kagon?
Gịnị ọzọkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-anọgide nʼime mmehie ka amara na-aba ụba?
2 Ana taba ti naki na. Ba ti ni he da tre ndi kita wa ki kwu nimi lah tre, kita cigaba sun nimi ma?
E e! O kwesighị! Olee otu anyị ga-esi na-adị ndụ nʼime mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị?
3 Bina toh ndi bi wa ba ngla ba nimi Almasihu Yesu ba ngla ba hra nimi kwu ma na?
Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ.
4 Ba rju ta ni'u, na ngla nimi kwu ma. Nakima ahe na Almasihu a lunde ni be nimi ninkon Iti Ma. Nakima i kita me ki zren nimi rayuwa i sa'a ma.
Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ.
5 Naki inde ki si he ni'u nimi kamani ikwu ma, i ki sun ni'u har ni kamani lunde ma.
Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ.
6 Naki a ki toh ndi ba kpa u ni kunkro, ichiche ndji u mbu i ni'u ma don duba wu kpa u lahtre. Wa i ahe don kina ta hi nimi bautar lahtre.
Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie.
7 Duk wa a kwu ba you ni matayin nitu ndindi nitu lahtre.
Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị.
8 Naki ki kwu ni Almasihu ndi kpa njanji, iki sun ni wu
Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ.
9 Ki he ni toh ndi ba nzu Almasihu rju ni be, nakima ana lah ikub ngana, ikwu na he ni gbengblen nitu na.
Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ.
10 Na ikwu wa a ti ni lahtre, ati kpu riri nitu wawuu. Nzren wa asi zren, asi zren niIrji.
Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke.
11 Nakima bi yi me, bika bah tumbi ni matsayin bi kwu ni lahtre, aman bi wa ba he vri ni Irji ni mi Almasihu Yesu.
Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
12 Naki bika na no lahtre gbengblen ni mi kpambi na har ndi woh tre ni sun kpa.
Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi.
13 Na vu gham kpa mbi no lahtre nitu ikpi u du wa njanji na he na. Naki bika no Irji tumbi ni vri ni kwu. Bika vu ngham kpambi no Irji nitu ikpi du u njanji.
Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.
14 Na no lahtre nkon ni tumbi na, bina he nimi doka na, naki nimi ndindi bi he.
Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara.
15 To se ngyeh kika ti lahtre don kina he nimi doka na, ama ni ndindi, ana taba he naki na.
Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị.
16 Bina toh ndi bi ban tumbi no nitu igran, ni wu bi gran? Wa i ahi najinji, inde bi gran ni lahtre, wa ani nji yi hi ni kwu, ko naki igran ni wo tre ni nji hi ni ndindi.
Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume?
17 Naki ma ingyiri a he ni Irji, don ni sen bina gran lahtre, ama bi yi biyaya nimi suron mbi irin koh koyarwa wa ba noyi.
Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na ọ bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu.
18 Ba kpa yi chuwo ni mi bautar lahtre, nda kma yi ti gran bi ndindi.
Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume.
19 Misi tre ni yi na ndji wa a ku nyere ni nanma kpa ni yin. Na yadda bika ban nghan kpambi ga ti rji na bi meme du, nakima zizan bika ban ngham kpambi ni tu gran ndindi.
Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ.
20 Naki ma itoh wa bi hi gran lahtre, bi yi wa ba kpa yi chuwo ni ndindi.
Mgbe unu bụ ohu mmehie, o nweghị ihe megidere unu ime ezi omume.
21 Ni toh kima ahi amfani ngye bi samu nitu ndu wa zizan'a bi si klu shan ba? Nakima sakamaki bi ya indu hi kwu.
Ma gịnị bụ uru unu nwetara nʼoge ahụ site nʼọrụ ahụ niile unu rụrụ, bụ ihe ndị ahụ na-eme ka ihere mee unu? Ihe ndị ahụ na-eduba nʼọnwụ.
22 Naki zizan wa ba kpa yi chuwo ni lahtre, nda kma yi ti gran Irji, amfani ma, wawu hi tsarkakewar mbi. Sakamanko ki hi ivri u se kakle. (aiōnios g166)
Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
23 Nakima sakamako lahtre hi kwu, ama kyauta Irji ahi ivri u se kakle nimi Almasihu Yesu. (aiōnios g166)
Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị. (aiōnios g166)

< Romawa 6 >