< Romawa 11 >

1 Mi tre ndi Rji kama ni ndji mu? Ani to bre tie to kima. Ime mi ndji u Israila, ih'bu Ibrahim u grji Banyomi.
Mgbe ahụ a na m ajụ, ọ ga-abụ na Chineke ajụla ndị ya? Mba, nke a apụghị ime, nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye Izrel. Abụ m nwa nwa Ebraham, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta.
2 Irji na kama ni ndji ma waa he ni guci toh mba na. Ka bi toh kpye a lan tre'a hla nitu Iliya, wa a nji (kara) Israila hi ni Rji'a?
Chineke ajụbeghị ndị ya bụ ndị ọ họpụtara site na mmalite ihe niile. Ọ bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Ịlaịja, otu o siri rịọ Chineke arịrịọ megide ụmụ Izrel?
3 A tre di Bachi, ba wu annabawa me, da zi koh me me, Ahi me ni kankrji mu mi don. Naki basi wa ba wuh me.
“Onyenwe m, ha egbuchala ndị amụma gị niile, mebisiekwa ebe ịchụ aja gị niile, maọbụ naanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.”
4 Naki u Rji ka kasa u da tre gye? A tre di mi hei ni di dubu tagban wa mi zi ba nitu mu. Wa bana kudran ni Ba'al na.
Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? “E nwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nʼanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal.”
5 Ko naki me ni toh i ibru bari ba he ni ndindi.
Otu a ka ọ dịkwa nʼoge dị ugbu a, a họrọla mmadụ ole na ole site nʼamara ya.
6 U ani taa ni zizi, wa'a ana la ni ndu na. Ani tana tokima, u zizi nala hi zizina.
Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu.
7 Wa hi ngye? Ikpye wa Israila ba wa bana fe na, u bi a ba chu ba'a ba fe, imbru ba ba sen tu.
Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha.
8 Na ba han Rji no ba ibrji u meme wa bana toh shishi hei, aman bana toh na, iton hei aman bana wo na har ye ni vi kima.
Dịka e dere ya, “Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe. O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ, nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe; o mere nke a ruo taa.”
9 Dauda a tre di du teburin ba du kam ti rjirji u vu labe, ba troko, du kam ti tita u kub za ni kpye u rju hla ni ba.
Devid kwukwara, “Ka tebul ha ghọọrọ ha igbudu na ọnya, ha bụrụkwa ihe ịsọ ngọngọ na ntaramahụhụ nye ha.
10 Du shishi ba ti bwu duba na toh na, du gon ba ta dran chuchu.
Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ. Mee ka azụ ha bụrụ ihe arọjiri arọji ruo mgbe ebighị ebi.”
11 Mi tre ndu ba k'bu za da joku? Ndu kpye nakima la tie na. Nakima k'ma hi ni gon mba yi a ndu gbujbu ye ni bi ko hra ni ndu yo ba tie ngu.
Ajụjụ ọzọ m na-ajụ bụ nke a: Ọ ga-abụ na ha sụrụ ngọngọ ka ha daa ma ghara ibilite ọzọ? Ọ bụghị otu a! Kama nʼihi mmehie ha, nzọpụta rutere ndị mba ọzọ ka e sitekwa na nke a kpalie ekworo nʼime ụmụ Izrel.
12 Inde zizaa wa ba kam hi ni kogon, aji klen ye ni bi kora, ni hei kwatancin nikon ma ani hei, inde ba ye ni klekle?
Ma ọ bụrụ na mmehie ha wetara akụnụba nye ụwa, ọ bụrụkwa na ịbụ ogbenye ha wetara ngọzị nye ndị mba ọzọ, ọ bụ na ngọzị babigara ụba oke agaghị adị mgbe a ga-agụkọta ọnụọgụgụ ha niile?
13 Ziza'a mi si tre ni yi, biyi wa bi kora, naki ime i mi hiu ton du hi ni kora, misi wurwo ni mi du mu.
Ugbu a, unu ndị mba ọzọ, ka m na-agwa okwu. Ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ onyeozi nye ndị mba ọzọ, ana m enwe afọ ojuju nʼihi ije ozi m.
14 Ani bi dume you mri yah bi hwu, duta kpa bari ba chuwo.
Nʼihi na enwere m olileanya na, ma eleghị anya, apụrụ m isite nʼụzọ a kpasuo ekworo nʼime ụfọdụ ụmụnna m, ka e site nʼekworo ha zọpụta ụfọdụ nʼime ha.
15 Inde kaba, ani ji shu tu bi ni gbugbulu in kpa ba ani hei ni hei? Ani kamti vri ni mi kwu?
Ọ bụrụ na ọ bụ site nʼọjụjụ a jụrụ ha ka e siri mee ka ụwa dịrị na mma, gịnị ga-eme mgbe a nabatara ha? Ọ ga-adị ka i si nʼọnwụ bilie ọzọ, nwee ndụ ọzọ.
16 U klo bi mumla bata bi mumu'uma wa ba nymo tie gble ma ni bi ngame. U inja kukron bata tsratsra me, ba ilan ma ba ba he tokima.
Ebe ọ bụkwa na iberibe achịcha e jiri chụọ aja bụ ihe dị nsọ, mgbe ahụ, achịcha ahụ niile bụ ihe dị nsọ. Nʼihi na ọ bụrụ na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, otu a kwa, alaka ya ga-adịkwa nsọ.
17 U ilan bari u kukron bana nzi hlega, u biyi mba bina kukron Zaitun, wa ba fe nimi mba, u bina he ni gado bii ni ba, u bi ye ni mi nja zaitun a,
Ma a nyakapụrụ ụfọdụ alaka osisi a, werekwa unu bụ alaka osisi oliv ọhịa nyapagide nʼọnọdụ ha. Ya mere, unu esorola keta oke na ngọzị sitere na mgbọrọgwụ osisi oliv ahụ.
18 to, bika na gangban ni tu lan ba na. Bita gangban, ana bi yi mba ti njinja na, wa hi nja'a mba nji yi.
Ma unu ekwesighị ịnya isi na a dọkapụrụ alaka ndị ọzọ were unu dochie nʼọnọdụ ha. Ihe unu na-aghaghị ịmata bụ nke a: unu bụ naanị alaka dị nʼosisi. Ọ bụghị unu na-ebu mgbọrọgwụ osisi, kama ọ bụ mgbọrọgwụ osisi na-ebu unu.
19 U bi tre din “Ba nzi lan ba ni ndu ba fe me ni mima.
Ma eleghị anya unu nwere ike kwuo, “Ma a nyakapụrụ alaka ụfọdụ e nwee ohere ebe a ga-anyapagide anyị.”
20 Wa i a njanji, naki wa njanji ba na hei na, i ki sa i baka zi ba ni mi wo, bika kri gbagban ni mi njanji bi. Na ban tubi zan na ahei na, aman bika klu sissri.
Nke ahụ bụ eziokwu. Ma chetakwanụ na a nyakapụrụ ha nʼihi ekweghị ekwe ha, ma unu nọ naanị site nʼokwukwe. Ya mere anyala isi, kama na-atụ egwu.
21 Naki inde Rji na don wo u njanji na, to ana don yi na.
Nʼihi na ọ bụrụ na Chineke emereghị alaka nke osisi ahụ wapụtara nʼonwe ya ebere, ọ gaghị emekwara gị ebere.
22 Bika toh iri du bi tsanani u Rji. Niwo ri tsanani ni ye ni Yahudawa biwa ba joku. U ndindi u Rji ye ni yu'u, inde bi si zre nimi didima ba na zu yi na, aman inde bi kabi ba zu yi.
Ya mere, tulee obiọma na aka ike Chineke, aka ike nʼebe ndị dara ada nọ, ma obiọma nʼebe unu nọ, naanị mgbe unu na-anọgideghị nʼobi ebere ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-anyakapụkwa unu.
23 Nakima inde ba na guci ni mi njanji bana, ba vu ba sur ni mi kukron nakima Rji na iya la vu ba.
Ma ọ bụrụ na ha anọgideghị na-ekweghị ekwe, a ga-anyapagidekwa ha nʼihi na Chineke pụrụ ịnyapagide ha ọzọ.
24 Inde ba chu u rhu nimi kokron zaitun mi ji, har wa bi du ba ka'u kabi nimi kukron zaitun u wu'u wo u njanji.
Nʼihi na asị na e gbupụtara unu site nʼalaka osisi oliv ọhịa, nyapagide unu nʼosisi oliv ọma ahụ nʼụzọ na-abụghị usoro ndụ, gịnị kwanụ ga-egbochi ịnabata alaka ndị ya, bụ ndị si na ya, mee ka ha laghachi azụ nʼosisi oliv ahụ e si nyakapụ ha.
25 Mri yah mi ni son du yi ji hei ni mi bwu na, game ni gbugbulu i du yi na hei ni toh ni mi mre bi, gbugbulu hi sen tu ni Israila, har bi korta ba ri ni me.
Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe omimi a, ka unu ghara ịnya isi. Nnupu isi ụfọdụ ụmụ Izrel agaghị adịgide kama ọ ga-adị ruo nʼoge ọnụọgụgụ ndị mba ọzọ a ga-anabata zuru.
26 Ahei naki Israila ba wawu bau ba gbujub, nadi ba han. Ni mi Sihiyona wa ani kpa chuwo ani rjhu. Ani wur iri hle ni mi Yakubu,
Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya, “Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa.
27 Wa i ni kam ti chunyu mu ni ba, na di mi wur mi wur lahtre ba hle ga.
Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha, mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.”
28 Ni nhma bari ni tu bishara, ba bi kran ni bi, nitu kon ri, ni tu chu u Rji ba bi son ni tu bati.
Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha.
29 Na baye-baye ni you u Rji hana ya ka ba sran na.
Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke.
30 Biyi me ni sen bina ta hu tre Rji na, naki ziza'a bi kpa didi nitu lahtre ba.
Unu onwe unu ndị na-enupuru Chineke isi na mbụ, anatala ebere ya ugbu a, nʼihi nnupu isi ha.
31 Ni koh kima Yahudawa biyi ba kam ti bi sen tu, ni tu didi wa ba tsro ta, baba me ba kpa didi ziza'a.
Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu.
32 Naki Rji ka ko ngham nitu sen tu, don du tsro didi ni ko nghan. (eleēsē g1653)
Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya. (eleēsē g1653)
33 Ina misali juju ikle ni toh, ni toh iri u Rji. Hukunche-hukunche ma ba zan guci bichika, ikoh ma ba zan guci toh.
Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu! Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile, ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta.
34 Nakima, ahi nghan ni no Bachi i mre? a nghan ni ni tre?
“Onye maara uche Onyenwe anyị? Ma ọ bụ onye bụ onye ahụ na-enye ya ndụmọdụ?”
35 Naki a nghan guci no Rji kpie du han wu?
“Onye burula ụzọ nye Chineke ihe, nke ga-eme ka Chineke kwụghachi ya?”
36 Rji ni wa wu i, ni wawu i, hi ni u ikpie ba wawu. Niko ahi u ma isei ka kle. Ami. (aiōn g165)
Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen. (aiōn g165)

< Romawa 11 >