< Matiyu 26 >

1 Niwa Yesu a tre ni tu kpyi biyi kle wawuua, a hla ni mrli koh ma ba,
Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị,
2 Bi toh ndi ivi ha bati vu y'ba u vi u gan Rugran niye u ba vu Ivren Ndji nno ba kpan ni tu gran nhma kukron a”
“Dị ka unu maara nke ọma, Mmemme Ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼoge ahụ, a ga-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye ka a kpọgide ya nʼobe.”
3 Ba firist bi ninkon ba ni bi ninkon ndji ba, ba shubi ni koh chu firist wa ba yo wu ndi Kaifas.
Nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị okenye zukọtara nʼụlọeze otu onyeisi nchụaja a na-akpọ Kaịfas.
4 Ba sronmu ni yay'bi ni nkon wa ba vu yesu wuu'a.
Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide Jisọs na nzuzo gbuo ya.
5 U ba tre ndi, “Ana ni nton gan Rugran na ni ndu tsi na ka wlu na”
Ha kwekọrịta sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme ka ọgbaaghara hapụ ịdị nʼetiti ndị mmadụ.”
6 Ni nton wa Yesu he ni Betani ni koh Sima u kpurua,
Mgbe Jisọs nọ na Betani, nʼụlọ Saimọn onye ekpenta,
7 a si rli birli, u wari ka rihi ni kpala ba nye u tie le nda kasru ni tuma.
otu nwanyị bu karama alabasta nke mmanụ otite isi ụtọ dị oke ọnụahịa dị nʼime ya, bịakwutere ya, nke ọ wụsara ya nʼisi dị ka ọ na-anọdụ ala nʼeri nri.
8 U wa mrli koh ma ba toh'a, ba vra nfu nda tre, “Ani tu ngye mba a nji nye yi si tie meme.
Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha sịrị, “Olee ụdị ịla nʼiyi dị nke a!
9 Ba ndi na le niwu nda kpa gbugbu nkle nno bi ya”.
A gaara erepụta mmanụ a ego dị ukwuu were ego e retara ya nyere ndị ogbenye aka.”
10 U Yesu wa a toh mre mba a tre ni ba “Ni tu ngye bi yan wayi kpa? E a tie kpye ndindima ni mu.
Ebe Jisọs matara ihe ha na-atamu nʼobi ha, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji esogbu nwanyị a? O merela m ihe dị mma.
11 Bizi he ni bi ya cacuwu u me bina zi he ni me na.
Unu na ndị ogbenye ga-anọ oge niile, ma ọ bụghị mụ na unu ga-anọ mgbe niile.
12 Wa a sru nyeyi ni kpamila a tie u rjumu.
Nʼihi na site nʼịwụ m mmanụ otite a nʼahụ, o doziela m maka olili.
13 Njanjimu mi hla yiwu ni wrji wa ba d'bu itre zizi yi'a ni ngbungblua wawuu ba hla kpye wa iwa tie nda taka ma”
Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla ezisara oziọma a nʼụwa niile, a ga na-echeta nwanyị a nʼihi ihe ọma a o meere m.”
14 U ri nimi tso ba wa ba yowu ndi Yahuda Iskaroti kayi ni bi ninkon firist ba
Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja.
15 nda tre, “Bi ne ngye mindi vuu nno yi?” Ba tsra shekels u dran se'tra nnowu.
Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ.
16 Rji ni nton kima azi wa nkon wa ani vu nno ba'
Site nʼoge ahụ na-aga, ọ chọrọ ohere ịrara ya nye nʼaka ha.
17 Ni vi u mumla u gan rugran mrli koh ba ba' yeni Yesu nda tre, “Ni mameyi mba u son ki mla rli u gan rugran tie?”
Nʼụbọchị mbụ nke mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe gị maka oriri Ngabiga?”
18 A hla “Hi ni ndji ri ni mi gbu ndi hla wu, mala tre “Inton tie whiewhiere. Mi tie gan rugran ni koh me ni mrli koh mu”.
Ọ zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga nʼụlọ gị.’”
19 Mrli koh ba ba' tie towa Yesu a hla bawu'a nda mla rli Rugran tie.
Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka Jisọs gwara ha, doziekwa oriri Ngabiga ahụ nʼebe ahụ.
20 Wa yalu tie a, a son nda rli ni mrli koh ma tso'a.
Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ.
21 Wa ba ki rli'a, a tre “Njanjimu me hla ni yi wu iri mbi ni le'nime”
Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”
22 Ba'ka yi ni sron, nda ni mye wuni yiyri, “Ani tie bre meyi ba' Baci?”
Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?”
23 A saa “Wawu wa ayo woma si rli ni me ni kongo'a ahi wawuu yi ni le ni me.
Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye.
24 Ivren Ndji ni hi towa ba nha ni tuma. Iya ndji wani woma ba le ni Vren Ndji'a! A ndi na bi ndu bana ngrji wuna”
Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”
25 Yahuda, wa ani le ni wu'a tre, “A hi me?” A hla niwu, “U hla ki me”.
Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.”
26 Ba si rli, Yesu ka ban bredi nda tie lulu nda mrewu. Aka nno mrli koh ba nda tre ka tan. Iwayi hi kpamu”
Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe achịcha ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ nke a rie, nʼihi na nke a bụ anụ ahụ m.”
27 A ban kofi'a nda ngri nda ko nno ba nda tre, so wawu mbi wu.
Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a.
28 Iwayi hi yimu u shirji wa ba kau hlega ndu ba wru latre gbugbu ndji hle.
Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie.
29 Mi hla yiwu mina la'so ma (inabi) yi ngana se viwa mi sowu sisa niyi ni ngbuchu u tie mu”
Ana m agwa unu, na-agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, tutu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nʼụzọ dị iche nʼalaeze Nna m.”
30 W ba yo se'a ba rju hi ni ngblu u ze tun.
Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
31 U Yesu hla bawu, “Wawu mbi wu bi joku ni tu mu ni cuyi, niwa ba nha 'Mi wru wa ani nji gran ba, u nt'ma bi gran ba shangblan.
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nʼabalị taa, unu niile ga-agbahapụ naanị m. Nʼihi na e dere ya, sị: “‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, atụrụ nke igwe atụrụ ahụ ga-agbasasịkwa.’
32 U mi ta ye wlunde mi hi Galili guci yiwu”
Ma mgbe e mere ka m si nʼọnwụ bilite, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.”
33 U Bitru hla wu “U bata ni joku wawumba wu ni tie me, ime de mi tie bre joku”
Pita sịrị, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị gbalaga, agaghị m ahapụ gị.”
34 Yesu hla wu, “Njanjimu mi hla wu, ni mi cuyi u kpatron tie kputra ndi wu toh me rli u gba ka tubu.
Jisọs sịrị, “Nʼezie agwa m gị, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
35 Bitru a hla ni wu, “Ani ta wa mi khwu ni wu'a mi na kpau tron” Ba mbru mrli koh ba ba tre kpye rirji me.
Ma Pita kwuru sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ, agaghị m agọnarị gị.” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ndị ahụ niile na-eso ụzọ ya kwuru.
36 Ni nton kima, Yesu ahi bi ni ba ni wrji wa ba yowu ndi Getsemani nda hla ni mrli koh maa “Kuson wa u me mi ni wa mu' ndi tie aduwa”
Mgbe Jisọs bịara nʼogige ahụ a na-akpọ Getsameni, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa nʼihu nke nta kpee ekpere.”
37 A nji Bitru ni mrli nlon Zabadi harli niwu nda si yi ni sron.
Ọ kpọọrọ Pita tinyere onwe ya, na ụmụ Zebedi abụọ. Ọ malitere inwe obi mwute nʼime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri.
38 A hla bawu, “Idri mu ni lome kpukpo me to mi khwu. Ki wa ndi gben ni me”
Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nʼebe a soro m na-eche nche.”
39 A c'bi hi tsame, nda ku ni shishi nda tie aduwa. A tre, “Itie mu ani ta tie tu, ndu kofi yi y'ba me yo. Nakima ana mre muna nduhi mre me.
Ọ gara nʼihu nke nta daa, kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”
40 A ye ni mrli koh ba nda toh basi kruna, nda hla ni Bitru, “A ngye, bina gben ni me u wru nton ri me na?
Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa?
41 Gben ndi tie aduwa ndu yi na joku ni tsra na Isron'a ni son u kpa tie whie me”
Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa. Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.”
42 A hi kpama kpu uha nda tie aduwa. a tre, “Itie mu iwa ni ta na y'ba hi na ndi gbigbi mi so wu mre me'a ka tie”
Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.”
43 A ye ngarli nda toh basi kruna, u shishi mba ba ron.
Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ.
44 Ala ka ba don ngarli nda hi ka tie aduwa inkpu u tra nda la tre to wa a tre'a.
Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ.
45 U Yesu a ye ni mrli koh ba nda tre ni bawu, “B i rli kruna, ndi ki kpami mengyen? To inton tie whiewhiere u ba le ni Vren Ndji ni wo bi latre.
Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie.
46 Wlu, kie ndi hi. To, waa ani le' ni me'a ahe whiewhiere ni me”
Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!”
47 A he si tre, Yahuda iri nimi tsoba kaye Ijbu ndji ba hu rji ni ba'cu firist ni bininkon u ndjiba. Ba nji ba njingban ni ba kpala (ngbonhon).
Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha.
48 Indji wa ni le ni Yesu'a a tsro ba ngban nda hla “Indji wa me nha gboble ni wu'a, a wawuyi” Bika vuu.
Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!”
49 A gbla hi ni Yesu nda tre “Mi ci, mala!” nda nha gboble ni wu.
Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
50 Yesu a hla niwu “Kpanmu, tie kpye wa u ye tie'a” U ba ye sawo mba ni tu Yesu nda vuu.
Jisọs gwara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ bịara nso jide Jisọs, sekpụrụ ya nʼike.
51 U ri wa ana he ni Yesu'a ka n'ma woma rju, nda cu inji ngban nda sren ton vrenkoh u chu firist cuu taga.
Otu onye nʼime ndị ha na Jisọs nọ, setịrị aka ya, mịpụta mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya.
52 U Yesu hla wu, “Ka njingban me yo ni hra ma, e bi wa ba nzu ngban ani nji ngban ba khwu.
Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya, nʼihi na mmadụ ọbụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya ga-anwụ site na mma.
53 Ka u ya mina toh yo tie mu ndu ton malaiku zan j'bu tso.
I cheghị na m pụrụ ịrịọ Nna m ka o zitere m ihe karịrị usuu ndị mmụọ ozi iri na abụọ nʼotu ntabi anya?
54 U ba tie ni he ndu tre u embe ba ndu tsra din a gbigbi ndu wa tie toyi.
Ma olee otu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-esi mezuo, nke kwuru na ọ ghaghị ịdị otu a?”
55 Ni nton yi Yesu a hla ni j'bu ndji ba “Bi ye vu me ni nji ngban ni ngbonhon na mi ndji y'bi? cacuwu mi son ndi tsro ni hekali u bi na vu me na.
Nʼoge awa ahụ, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ sị, “Unu pụtara chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi? Anọrọla m ziekwa ihe nʼụlọnsọ kwa ụbọchị, ma unu ejideghị m.
56 Ikpyi bayi wawuu ba tie ndu nha bi Totsu'a ye tsra” Nikima, mrli koh ba ba'ka tsutsu kau don.
Ma ihe ndị a na-eme ka ihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo.” Nʼoge ihe ndị a niile na-eme, ndị na-eso ụzọ ya niile hapụrụ ya gbalaga.
57 Biwa ba vu Yesu'a ba njiwu hi ni kaifas ninkon firist, u bi nha ni bi ninkon ba kia.
Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nʼụlọ Kaịfas, onyeisi nchụaja. Ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zukọtara nʼebe ahụ.
58 U Bitru kasi hu gbugbanmu hi ni koh ninkon u firist ba. A ri hi mi nda ka kuson ni bi gbyen ba nda ikpye'a ba ti'a.
Pita sogidere Jisọs nʼazụ site nʼebe dị anya. O rutere nʼobi onyeisi nchụaja, baa nʼime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwe ike ịhụ otu ihe a ga-esi bie.
59 Ninkon u firist ba ni (majalisa) basi wa kpye u ce wa ba hla ni tu Yesu nda vu wuu.
Ndịisi nchụaja, na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ahụ nọ na-achọ ama ụgha megide Jisọs, ka ha hụ ụzọ ha ga-esi gbuo ya.
60 Bana vu ni kpyeri na, ko ni wa indji gbugbuwu ba rju nda tie ce. U indji harli bari ba rju
Ma ọ dịghị nke ha chọtara, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara. Nʼikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara
61 nda tre, “Indji yi tre mi toh zi hekali Rji yi ndi mewu ni vi tra”
kwuo sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọnsọ ukwu nke Chineke, wughachikwa ya nʼụbọchị atọ.’”
62 Ninkon u firist ba ka wlunde nda tre ni wu, “U na he kpye wa u saa na? Ahi ngye mba basi tre ni tu me?”
Onyeisi nchụaja biliri ọtọ kwuo sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị bụ ama ndị a a na-agba megide gị?”
63 U Yesu ka krli ni ngbangbi. Injii ninkon u firist a tre, “mi yo wu ni nde Rji u (sisren) hla ni tawu ka wuyi u Kristi Ivren Rji.”
Ma Jisọs ekwughị ihe ọbụla. Onyeisi nchụaja gwara ya sị, Eji m aha Chineke dị ndụ nye gị iwu, sị gị, “gwa anyị, ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke?”
64 Yesu saa ni wu, “U hla kime ye. U mi hla wu, rji zizanyi u toh Vren Ndji a son ni wo rli u ngbengblen nasi ye ni tu kpa u shulu”
Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke Onye dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
65 Ninton kima injii ninkon u firist a y'ba ba nklon ma nda tre, “A tre latre!” u kie wa ngye ngarli? Tomba zizanyi kie wo latre'a.
Mgbe ahụ onyeisi nchụaja dọwara uwe ya, kwuo sị, “O kwuola arụ! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara nkwulu ya?
66 Ahi ngye imre mbi? Ba saa nda tre “A mla u khwu”
Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha zara sị ya, “O kwesiri ka ọ nwụọ!”
67 Ninton kima, baka sru nten sruu ni shishi nda tsiwu nda kpan wu ni kprji wo mba,
Mgbe ahụ, ha gbụsara ya ọnụ mmiri asọ nʼihu, tiekwa ya aka. Ndị ọzọ maara ya ụra,
68 nda tre, hla tsu na tawu, uwu Kristi. Ahi nha mba Kpanwu?”
sị ya, “Buoro anyị amụma, gị, Kraịst. Onye tiri gị ihe?”
69 Bitru a son ni korah bubu u bla tre a, u vrenwa ri, igran kaye ni wu nda tre, “Iwu ngame u he ni Yesu ni Galili”.
Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.”
70 A kpatron ni shishi mba wawuu nda tre, “mina toh kpye wa u si tr'a na”
Ma ọ gọrọ nʼihu ha niile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.”
71 Niwa a rju hi ni nyu nkontra, ivren wa ri, igran a toh nda tre ni wa ba he ni kima, “Iguyi ana he ni Yesu u Nazaret”.
Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkọrọ.”
72 Wa'ka' kpatron nikima ngarli, nda shirji tia, a tre, “Mina toh Indji mba na!”
Ọzọkwa, o weere ịṅụ iyi gọọ, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.”
73 Inton'a y'ba tsame u waa ba klri-krli a baka ye ni Bitru nda hla niwu, “cucu uri mba ngame, ilme a mba nhrawu.
Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nʼezie, ịbụ otu nʼime ha, nʼihi na asụsụ gị agbaala gị ama.”
74 Wa a ri la'nyu nda ni shirji nda ni tre, “Mina toh Indji mba na” U gba a ti gbla tubu.
Ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi sị, “Amaghị m nwoke a.” Mgbe ahụkwa oke ọkpa kwara akwa.
75 Bitru ka taka itre wa Yesu a hlaa, “U tie san mu ikpu tra rli u'gba ka tubu” A rju hi ni kahlan nda kayoi kpukpo me”
Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru sị, “Tupu oke ọkpa akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O si nʼebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu.

< Matiyu 26 >