< Matiyu 19 >

1 Ahe ni wa Yesu a hla tre biyi kle a, wa a wlu ni Galili hi nklan u Yuhudiya ni ko gran inne urdu.
Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judịa, nke dị nʼofe osimiri Jọdan.
2 Gbugbu ndi baka hu, u wa a den ba.
Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nʼetiti ha nʼebe ahụ.
3 Farisawa baye tsrawu nda mye wu, A he tu nkon ndu lilon ga gran ni wa ma ni tu kpye?
Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya i nwalee ya, sị, “O ziri ezi nʼiwu na nwoke ga-agbara nwunye ya alụkwaghị m nʼihi ihe ọbụla?”
4 Yesu a saa nda tre din “Bani kra ndi wawu wa atie ba rji ni mumla a tie ba lilon mba wa na?
Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.
5 Wawu wa atie mba a tre ngame din 'A nitu tre yi mba lilon ni kaa tiema ni yima don nda kabi ni wama u baba harli ba ba kati kpa ri.
Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ.
6 Bana la harli ngana bahi kpa ririi. Tikima ikpye wa Rji kau kabia ndu ndjio ri gawu tie nkan na.
Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”
7 U baka hla niwu, U ni tu ngye mba Musa a hla ridu ta nno imbe u gagran ndi la zu wa?
Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mekwaranụ Mosis ji nye iwu si na nwoke ọbụla nwere ohere ide akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya?”
8 A hla ni bawu, “Ahe ni tu gbegbe sron mbi mba Musa a ndu yi zu mbambi, rji ni mumla ana he tokima na.
Ọ zara ha sị ha, “Ọ bụ nʼihi na unu bụ ndị mkpọchi obi, ya mere Mosis jiri hapụ unu ka unu gbaa nwunye unu alụkwaghị m; ma ọ dịghị otu a site na mbụ.
9 Mi hla yiwu, indi wa a zu wamaa, u wama he nitu wa lilon na, nda hi kagran ndji ri a tielatre u tie kan.
Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.”
10 Mrli koh ba baka hla ni Yesu din “Ani ta he towa ni tu lilon mba wama, ka anabi ndu ndji gran na”
Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwunye ma ọlị.”
11 U Yesu ka hla bawu, “Ana ndji wawuu ba kpa tre yi na, se biwa ba kpa nyme ni bawu ndu ba kpa.
Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile ga-anagide okwu a. Naanị ndị e nyere ike ime ya ga-anagide ya.
12 Bari ba he wa ba ngrji hama ni krju'a u indji bari ba ka kpamba tie bi krju'a kimba ni tu mulki u shulu. I wa ani to kpa itsro yi a.
Ma ụfọdụ ndị mmadụ ka a mụrụ ka ha bụrụ onozi, ndị ọzọ bụkwa ndị mmadụ ibe ha mere otu a. Ndị ọzọ dịkwa ndị jiri aka ha họrọ ibu onozinʼihi alaeze eluigwe. Onye pụrụ ịnara nke a, ya nara ya.”
13 Nikima baka nji kpran mrli bari ye ndu sawo nda tie aduwa ni bawu u mrli kolo maa baka zu ba.
Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba.
14 Yesu a hla, “Don kpran mrli ba ndi ni zu ba ni ye ni mena, e mulki u shulu ahi u bibi mba yi”
Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.”
15 A kawo ma sa ni tu mba nda wlu ni kima hi kpama.
O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ.
16 U indji ri aye ni Yesu nda tre, “Mala ayi ngye zizi wa ahi gbigbi ndu mi tiewu ni kpa son u kasese? (aiōnios g166)
Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” (aiōnios g166)
17 Yesu a tre din, “A ni tu ngye rli u mye me ikpye u zizi? Ahi ririyi megyen ahi zizi u ani ta ndi wu wa uri ni son kase, uka hu doka ba”
Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ banyere ihe bụ ezi ihe? Ọ dị naanị otu onye nke bụ ezi mmadụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịba nʼime ndụ ahụ, debe iwu niile e nyere.”
18 Igua ka hla wu “Doka bari me?” Yesu hla wu na y'ba wo na tie kan na, na y'bi na, na klri ni gon ndji nice na.
Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara ya, “‘Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha.
19 Wo tieme mba yime ndi son vayi me towa u son kpame a
Sọpụrụ nne gị na nna gị. Ọzọ, hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’”
20 U vrenze a hla niwu “Ikpyi bayi mi tie ba wawuu ye. Ahi ngye rli don mu?”
Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Edebezuchaala m iwu ndị a siterịị na mgbe m dị na nwata. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?”
21 Yesu a hiawu, U tina son ku nyren na uka hi vu kpyi me le ndi kpa klen a nnobi ya tokima u he ni kpyi ni shulu.
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.”
22 U wa vrenze'a wo kpye wa Yesu trea a k'ma hi kpama gbo dodo me ni tu wa ahe ni kpyi gbugbuwu.
Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ okwu a, ọ lara na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya.
23 Yesu ka treni mrli koh ma ba “Njanjimu mi hla ni yiwu ahe ni dii ndu ndji u wo ndu ri ni igbu chu u shulu.
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze eluigwe.
24 Mi hla yiwa ngarli, Ani he dii ni ndji u wo ndu ri ni gbu u chu shulu zan wa lakrumi ka ri ni ndo nnro”
Ọzọkwa, asị m unu, ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
25 Niwa mrli kohma ba wo tokima baka manji ma wakran nda tre “Wa nha mba ni j'bu?”
Okwu a o kwuru tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”
26 Yesu aya ba nda tre, “Ni ndji ana ti tu u ni Rji ikpi wawu mba wu ba tie tu”
Jisọs legidere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ.”
27 Nikiyi Bitru ka saa nda tre niwu “To kie ka ko ngyeri don ndi huu. A ngyeri mba ki he wu?”
Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile soro gị, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?”
28 Yesu a tre ni mba “Njanjimu mi hla yiwu ni ngyrji u saa ni nton wa Ivren Ndji ni son ni ruron ma u chua biyi wa bi hume a bi son ni ruron chu tso ndi tron igrji tso u Israila.
Jisọs zara sị ya, “Nʼezie agwa m unu, mgbe a ga-agbanwe ihe niile, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-anọkwasị nʼelu ocheeze ebube ya, nʼalaeze ahụ, nʼezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nʼocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.
29 Iwa aka ba koh, mrli vayi lilon, vayi mrli mba, itie, iyi, imrli, ka ba rju ni tu nde mu, ani kpa mla nkpu se wlon nda son kasese. (aiōnios g166)
Onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nne ya na nna ya, na ụmụntakịrị ya, maọbụ ala o nwere, soro m, ga-anata dị ka ụgwọ ọrụ okpukpu narị ihe ọ hapụrụ, natakwa alaeze. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
30 U gbugbu wu wa ba bi u mumla ba k'ma tie bi klekle u bi klekle a ba katiebi mumla.
Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”

< Matiyu 19 >