< Matiyu 10 >

1 Yesu ayo Mrli koh ma wlon don harli a nda nno ba ngbengblen u ju me'me brji, ni u den lilo ba blawowu.
Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche.
2 Zizanyi ngye nde mrli koh ma bahe toyi. U mumla, Sima, wa ba yowu ndi Bitru, u vayi ma Andoro, u Yakubu ivren Zabadi, mba vayima Yahaya,
Nke a bụ aha ndị ozi iri na abụọ ahụ: Saimọn (onye a na-akpọkwa Pita) na Andru nwanne Saimọn; Jemis nwa Zebedi, na Jọn nwanne ya.
3 Filibus, u Bartalamawus, u Toma, ni Matiwu wa ata kpa ban a u Yakubu ivren Halfa, u Taddawus;
Filip na Batalomi; Tọmọs na Matiu onye ọna ụtụ; Jemis nwa Alfiọs, na Tadiọs.
4 Sima indi u suron, u Yahuda Iskarioti wa a le ni Yesu'a.
Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye nʼaka ndị gburu ya.
5 Ahi wlo don ha biyi mba Yesu a ton ba nda hla ni bawu, “Nahi nibiwa bana Israilawa na ni gbu bi Samariyawa na.
Ndị ikom iri na abụọ ndị a ka Jisọs nyere ikike zipụ. Maara ha ọkwa sị ha: “Unu agala nʼebe ndị mba ọzọ, maọbụ nʼebe ndị Sameria nọ.
6 Hi ni nt'ma u koh Israila wa ba kado'a megyen.
Kama jekwurunụ ụmụ Izrel, ndị bụ atụrụ furu efu.
7 Bita zren sihi bika ta hla tre Rji, ndi tre, 'mulki shulu tie wiewiere.'
Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’
8 Den bi lilo, ta' k'mo shine, bi kpurju, mla batie tsratsra ndi ju me'me' brji rju. Bi kpa magyen, biyi me bika nno megyen.
Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.
9 Na nji ba' zinariya, azurfa, u dra nimi kpo mbi na.
“Mgbe unu na-aga, unu anatala ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ ọla ọbụla tinye nʼime belịt unu.
10 Na nji mbu u zren na ka inklon ha' ka lagbom ka kpa'la' na, e' indi u ndu ahe nkon u la'ma.
Unu ejikwala akpa maka njem unu, maọbụ uwe abụọ, maọbụ akpụkpọụkwụ, maọbụ mkpanaka. Nʼihi na onye ọrụ kwesiri ihe e ji azụ ya.
11 Igbu wa bi ria, rligra ma ka tsitsima, bika wa indi u totie ndi son kima mla nton wa bi wlua.
Ma obodo ọbụla maọbụ ogbe ọbụla unu bara nʼime ya, chọọnụ ụfọdụ ndị kwesiri nsọpụrụ bi nʼobodo ahụ. Nọgidekwanụ nʼụlọ ha ruo mgbe unu ga-ahapụ obodo ahụ.
12 Bita' ni' ri ni koh bika ciu.
Mgbe unu na-abanye nʼụlọ ahụ, keleenụ ndị bi na ya sị, udo dịrị unu.
13 Ikoh'a nita ikoh waani son sia, isi mbi ni hu ba. Ani ta ha'ma, isi mbi ni k'ma ye yiwu.
Ọ bụrụ na ndị nọ nʼụlọ ahụ anabata unu, meenụ ka udo unu bịakwasị nʼụlọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha anabataghị unu, ka udo unu lọghachikwute unu.
14 Biwa ba'ta kamba ni kpayi ka ni woyi, bita ni don gbu'a ka koh'a, bika kpon wru u za'mbi hle bawu.
Ọ bụrụ na onye ọbụla anabataghị unu, maọbụ jụ ịnụrụ okwu unu, mgbe unu na-ahapụ ụlọ ahụ maọbụ obodo ahụ kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu.
15 Njanjimu, me hla yiwu, ni vi u Rji, ba sutie ni ndi bi Sodom mba Gomora zan gbu biki.
Nʼeziokwu, ọ ga-adịrị obodo ahụ njọ nʼụbọchị ikpe karịa obodo Sọdọm na Gọmọra.
16 Tomba, mi tonyi ni hi na ntama ni tsutsu tsi,' nayi, bika wierli too won ndi na bi tie me'me' na too nghu.
“Ana m ezipu unu dị ka atụrụ nʼetiti agụ. Ya mere, nweenụ uche dịka agwọ. Burunu ndị a na-apụghị ịta ụta dịka nduru.
17 Tie srensren ni ndi! Ba njiyi hi bi ninkon u tra Rji u ba tsiyi ni gbugban.
Kpachapụnụ anya. Nʼihi na a ga-enyefe unu nʼaka nzukọ ndị ụlọ ikpe, pịaakwa unu ihe nʼụlọ ekpere ha.
18 Ba njiyi hi ba gona ni ba chu ni tu mu ni ndu ba ni biwa ba Israilawa na toh me.
A ga-ekpe unu ikpe nʼihu ndị na-achị achị na nʼihu ndị eze nʼihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. E, nke a ga-enye unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị mba ọzọ.
19 Bati vuyi nno ba, bikana tamre ndi ahi ngye ka anihe mi tre na. Ba nno kpu'a u tre'a ni nton kima.
Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, maọbụ otu unu ga-esi kwuo ya. Nʼihi na a ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nʼoge ahụ.
20 Ana hiwu ba u tre na, ahi Brji u tieme mba nitre rju zu nyu mbi.
Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nʼonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nʼeluigwe ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.
21 Vayi ni nno vayima wu', atie ivren ma ngame. Imrli ba wlu tie meme ni batie mba nda ndu ba wu ba.
“Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya, nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha.
22 Konha ni kranyi nitu ndemu. U wa avu sron hi kle nton'a, ani gbujbu.
Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
23 Bata tieyi dii ni mi gbu, tsutsu hi niwa a wie niwu'a. Njanjimu me hle yiwu, bina zren hle gbu Israila na rli ivren ndi kaye.
Mgbe ọbụla ndị mmadụ sogburu unu nʼotu obodo gbalaganụ nʼobodo ọzọ. Nʼezie, asị m unu, unu agaghị agazucha obodo niile nke Izrel tupu Nwa nke Mmadụ alọghachi.
24 Mrli koh bana nna' tie koh mba na, vigran na zan bacima na.
“Nwata akwụkwọ adịghị akarị onye nkuzi ya. Ohu adịghị akarịkwa nna ya ukwu.
25 A mla ndu vren koh ndu he na tiekoh ma u gran kahe to bacima. U bati yoh indi u koh nda hi Ba'alzabu, kaba kpande bi koh ki tie me'me' ndandime!
O zuorela onye na-eso ụzọ onye nkuzi ka ọ dị ka onye nkuzi ya, na ohu ahụ ka ọ dị ka onyenwe ya. Ọ bụrụ na a kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebub, a ga-esi aṅaa ghara ịkpọ ndị ezinaụlọ ya ihe karịrị nke a?
26 Tokiyi bikana tie sisri mba na, e ikpie'a ba kawu a ba bwuu, u wa ahe riirii'a ba hla wu rju rah.
“Ya mere unu atụla ha egwu. O nweghị ihe ọbụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, maọbụ ihe e zoro ezo nke a na-agaghị eme ka ọ pụta ìhè.
27 Ikpiea me hla yiwu ni bwua, hla wu ni kplende rji, u kpie wa ba tre yiwu ni ton'a, d'buu ni tutra.
Ihe m na-agwa unu ugbu a na nzuzo, kọsaanụ ya mgbe chi bọrọ. Ihe m ji nwayọọ mee ka ọ baa unu na ntị, nọdụnụ nʼelu ụlọ kwusaa ya.
28 Na klu sisri bi wu kpandi na, wa bana toh wu dri na. Klu wa ani toh wa kpa'a nda tru dri'a yo ni kpaca lu. (Geenna g1067)
Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
29 Bana le mrli cincen harli nitu vi kubuna? Iri mba mitie bre joku hama ni y'me tie mbi.
Ọ bụghị otu kobo ka a na-ere ụmụ nza abụọ? Ma otu nʼime ha agaghị ada nʼala ma ọ bụrụ na Nna unu bi nʼeluigwe amaghị.
30 'E' futu mbi me a toh blawo.
Ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ka a maara ọnụọgụgụ ha.
31 Na klu sisri na. Itimbi nna u cincen gbugbuwu.
Ya mere, unu atụla egwu. Unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.
32 Ahe nakiyi ndi ko nha wa a ny'me nime ni k'bu ndai, me y'me niwu ni k'bu tie mu wa ahe shulu'a.
“Ya mere, onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, ka mụ onwe m ga-ekwupụta nʼihu Nna m bi nʼeluigwe.
33 Ama iwaa ana nyme ni me ni shishi ndina me ngame mina nyme ni wu ni shishi timu wa a he ni shulu na
Ma onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, mụ onwe m ga-agọnarịkwa ya nʼihu Nna m bi nʼeluigwe.
34 “Na yamba ndi mi nji si ye ngbungblu yina. Mina nji si ye nno na ahi takobi.
“Unu echekwala na m bịara iweta udo nʼụwa. Abịaghị m iweta udo, kama ọ bụ iwebata mma agha.
35 Meye vu tu ndi wru ni tiema, u vrenwa ni yima, u wa ni yima.
Abịara m ime, “‘Ka nwoke megide nna ya, ka nwa nwanyị megide nne ya, ka nwunye nwa megide nne di ya,
36 Bi kran ndi bahe bi koma.
ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinaụlọ ya.’
37 Twa a son tiema ka yima nna me'a, ana mla wa ani umuna. U wa a son vren ma ka vrenwa ma nna me, ana mla wa ani umu'a na.
“Ọ bụrụ na ị hụrụ nne gị maọbụ nna gị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, maọbụ nwa gị nwanyị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m.
38 Wa ana ban gran kukron ma nda hume na, ana mla wa ani umu na.
Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, ekwesighị ị bụ onye nke m.
39 I wa ani hra tuma'a ani nado, uwa ani nno tuma, ani fe wu.
Onye ọbụla chọtara ndụ ya ga-etufu ya, ma onye ọbụla tufuru ndụ ya maka m, ga-achọtakwa ya.
40 Wa a kpayia, a kpame ngame.
“Ndị niile nabatara unu na-anabata m. Mgbe ha nabatara m, ọ bụkwa Onye ahụ zitere m ka ha na-anabata.
41 Wa a kpame a, akpa wa a ton me'a. Wa akpa anebi a, ani kpa dii u anebi. U wa akpa u tie zizia ni tu wa ahi indi u zizi, ani kpa diima na ndi u zizi me.
Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nʼihi na ọ bụ onye amụma, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata onye ezi omume nʼihi ezi omume ya, unu ga-esorokwa ya nata ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume.
42 Wa a nno ri ni mi mrli bi tsitsa biyi, ka a ndi mma ni vi kofi me, nituwa vren kohmu'a, nkponjimu, me hla yiwa ana hon dii mana”.
Ọ bụrụ na onye ọbụla ekunye otu nʼime ndị a na-eso ụzọ m mmiri oyi ka ọ ṅụọ, nʼihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, nʼezie, asị m unu, ọ ghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.”

< Matiyu 10 >