< Mark 13 >

1 da yesu si zren rhe ni haikali iri ni mri ko ma bi huzama a tre ndi teacha ya tita ba baiko biyi ba biya
Mgbe o sitere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-apụ, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya siri ya, “Onye ozizi, ị hụkwara otu ụlọ a si maa mma. Lee ụdị nkume buru ibu e ji wuo ha.”
2 a hla ni wu wuto khikle mme biyi? ko tita rina kri ni tu kpanma hama ni zile na
Jisọs zara ha, “Ị hụrụ ụlọ ukwu ndị a? Oge na-abịa mgbe ọ na-adịghị nkume ga-atụkwasị nʼelu ibe ya, nʼihi na a ga-ala ha niile nʼiyi.”
3 da a son ni tu gbku olive wandi niya haikali a Bitrus, Yakubu, Yohana e Andrawus ba mye ni yib
Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, na ncherita ihu ụlọnsọ ukwu, Pita na Jemis, na Jọn na Andru bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị,
4 hlani tawu nita mba ikpi bi yi ba faru? age ba ni tsoro ta ndi kpe biyi ba ti wiewere wu whursu
“Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama izi na o ruola mgbe ha niile ga-emezu?”
5 yesu a lu kri si bla ni bawu mla ya nin du dior gyuryi na
Jisọs malitere ịgwa ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu.
6 gbugbwu ba ye ni ndume nda tre mi wawu yi nda gyur gbugbwu hi hle
Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ.
7 bita wo kuu ko tre huu na ti sisiri na kpi bimba ba ye ama ekli rhi hye ri
Mgbe unu nụrụ maka agha na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu. Ihe ndị a aghaghị ime ma oge ọgwụgwụ ihe niile erubeghị.
8 gbumgblu ba lu wa nhu ni gbungblu u bi chu ba kamba kpamba bi wo jub meme ni bubu kankan ni yon me ni hei be ba yi farlio yi nei na kri lega na ba vu yi hi lo da tsiyi ni tra wu bre irji mbi
Mba ga-ebili megide mba ibe ya. Alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ibe ya. Ala ọma jijiji na ụnwụ ga-adị nʼebe dị iche iche. Ihe ndị a bụ mmalite nke oke ihe mgbu.
9 ba gbronyihi duyi kri ni gaba gononi ba ba bi tuchu ni tu nde mu a duyi tsoro ba ikpe wandi me ti ni yiwua
“Unu aghaghị ịbụ ndị nọ na nche. A ga-enyefe unu nʼaka ndị na-achị achị, pịakwa unu ihe nʼụlọ ekpere. Nʼihi m, unu ga-eguzo nʼihu ndịisi ọchịchị na ndị eze dị ka ndị ama nye ha.
10 ama itre rji ni kuci hi kago ba ti vu yi hi lo bi kana ti sisir na tu kpe a di bi tre a na
Aghaghị ibu ụzọ kwusaa oziọma a nye mba niile.
11 niton ki ba na ye ikpe wa bi tre a ana bi yi bi tre na ruhu maitsarki ba ni tre
Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nʼụlọikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, kwuonụ naanị ihe batara unu nʼọnụ unu ikwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.
12 vayi ni lani vayi du wuu haka e ti ni tre ma mri ba lu kri ni tu ba yimba ni ba timba du ba luu ba
“Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya. Nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha.
13 ndi ba karnwu ni tu nde mu ama ndi wa a kri gbangban yi ni kle ani gbujbwu
Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m, ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
14 bi ta to meme gunki ba ni kri ni bubwu ana kamata na indi wandi asi bla vunvu yi ka mal ya da rimere be wandi ba he ni gran judea duba tsutsu hi ni tu ba gblu ba
“Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị(onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu
15 wandi a he ni yu tra du na grji ri niko diwawu ni ban kperi na
Onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ ya ghara ịrịdata maọbụ baa nʼime ụlọ ya iwepụta ihe ọbụla.
16 e wandi a he ni rhua do na kma ye ban nglo ma ni ko na
Ka onye ọbụla nọ nʼubi ghara ịlọghachi ịchịrị uwe ya.
17 imba bi mri ni nei ni biwa ba hei mir bi masisi ba hei ya ni vi ba ki
Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ.
18 bre trji du na hye ni ton sai na
Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nʼoge oke oyi.
19 vi baki baa ton wu khikle dan ton u ya wandi kina taba toh rji mumla wa irji a ti gbungblu wawuu ye zizan e khina la toh na
Nʼihi na oke mkpagbu nke ụbọchị ahụ ga-abụ nke na-adịbeghị na mbụ site na mgbe Chineke kere ụwa ruo ugbu a. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
20 irjhi nita na mer viba ruh na ba nma wandi ani nawo ni ta bi wa ana ju ba ye a do vi ba do ba na bra na
“Ọ bụrụ na Onyenwe anyị emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, ọ dịghị onye a ga-azọpụta. Ma nʼihi ndị ya, ndị ọ họpụtara, o meela ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ.
21 ko nha nita llha ni wu ndi ngye kristi he yi ko ngye a he mu na kpanyme na
Nʼoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee, ọ nọ nʼebe ahụ,’ unu ekwela.
22 krista bi che baba anabawa bi che ba ye ni alamu gbugbuwu da gyur ndi ko ni bi wandi irji chuba ye
Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.
23 mla kri mi hla kpi bi yi ni yiwu du yi guci ni ye mba
Ya mere, unu nọrọ na nche; nʼihi na agwala m unu ihe niile mgbe ha na-emebeghị.
24 baya ya wu ton kima irji na wu na ani ti buh iwua na kpana
“Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ, “‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya;
25 tsitse ba rhu rjoku rhi ni shulu u iko u shulu ni cu mle ba to
kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada, ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.’
26 vren ndi ni ye ni mi kpalu ni gbengble ni daraja
“Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube.
27 ani ton malaiku hi ni nfro nza bi gbungblu meme wu shulu do ba yoh bi ma wandi ana chuba ye
Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe.
28 to kpe wu mla ya to ni kunkro fig nto wandi vunvu ma ju wu to ndi esu ti weiweire ye
“Ugbu a, mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya dị nro malite iwepụta akwụkwọ ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso.
29 na ki me wuta to kpi biyi ba si zren to ye ma a weiweire ni nkontra
Nʼụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha bidoro ime, matanụ na ọ nọ nso, ọ nọkwa nʼọnụ ụzọ.
30 janji mi hla yiwu bi zan yi bana kle hamma ni to kpi biyi na
Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo.
31 shulu ba meme ba kle ama lantre mu na kle na
Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide.
32 nitu via ko ntoma ndoir ko maleka ni shulu ko vren bana to ha iti mehe a to
“Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, ọ bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya.
33 kri ni wri ni mla ya nitu wuna to iton a na chiche vu vu bi Greek bari ba yo tre toyi kri ni wri mla ya ni bre
Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya!
34 na ndi wa a hi zren a don koma nda don mri ko ma ta ya ko ko nha ni ndu mada mha bi ya ba a duba khi ni wri
Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche.
35 ni tu kima wu na to ka tiko ni kma ye ni ton rime na ka ni yallu tsutsu chu koka ni gbatup wu bwhumble ke ni mble
“Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ.
36 anita ye niko gbru me na ye too wa si krunana
Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nʼụra.
37 kpe andi mi lha ni wua mi hla ni ko nha mla ya mal kli
Ihe m gwara unu ka m na-agwakwa mmadụ niile. ‘Nọrọnụ na nche.’”

< Mark 13 >