< Luke 9 >
1 A'yo wulon don ha ba ye bubu ri na nno ba gbengble ni ikoh u wa ba zu brji, na chu lilo rju ni bi lilo.
Mgbe ọ kpọkọtara ndị ozi iri na abụọ ahụ, o nyere ha ike na ịchị isi nʼebe mmụọ ọjọọ niile nọ na ịgwọ ọrịa dị iche iche.
2 Na ton ba hi ndu ba hi na hi bla tre Irji, na chu lilo rju ni bi lilo.
O nyere ha ikike, zipụ ha ikwusa alaeze Chineke na ịgwọ ndị nrịa nrịa.
3 Nna hla bawu, nadi ndu ba na ban ikpe rirme nji u bi hi ni zren na; na ban kpalah na, na ban gopelena, na ban bi rina, na nji inklen na, ni na nji inkolom ri u siran na.
Ọ gwara ha sị, “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, maọbụ mkpanaka maọbụ akpa, maọbụ achịcha maọbụ ego maọbụ uwe abụọ.
4 Ko ni ko irime bi ri ni mi bika son zu nikima ni ka lu zu niki hi kpambi.
Ụlọ ọbụla unu banyere, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ.
5 Bubu wa ba na kpa yina, u bika lunde ni gbu ki, ni k'bon wru zah mbi hle ni bawu ndu k'ri gban (Alama) ni bawa ni kah wo'a.
Ma ebe ọbụla a na-anabataghị unu, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ nʼobodo ahụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.”
6 U ba lunde shan ni nkanka hi ni gbu'gbu na ni bla tre Irji na ni ju lilo ni rju.
Ha gara nʼobodo nta niile na-ekwusa oziọma na-agwọkwa ndị ọrịa nʼebe niile.
7 U ba he u Hiridus, Ichu, a wo kpe wa a si zren wawu'a. Wa ti sissri ni wa a wo bari ba si tre andi Yahaya wa ani tie Batisma a la ye ni rema.
Mgbe Herọd onye ọchịchị nụrụ akụkọ banyere ihe niile merenụ, ọ gbagwojuru ya anya nʼihi na ụfọdụ mmadụ na-asị, na Jọn omee baptizim esitela na ndị nwụrụ anwụ bilie.
8 Ba ri ba tre nda ahi Anabi Iliya, ba rju ye ni re u ba ri ba tre nda ahi iri nimi Anabawa bi sen ba a la rju ye ni re.
Ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ebe ndị ọzọ na-asị na otu nʼime ndị amụma ochie apụtakwala ndụ ọzọ.
9 Hiridus tre andi ana Yahaya ne, don wawu nna chutu ma ye, u zizan ahi nha mba mi si wo bibi tre yi nitu ma? Rji niki wa soma wa nkon wa ani toh Yesu.
Ma Herọd sịrị, “Mụ onwe bipụrụ isi Jọn. Onye bụkwa onye a nke m na-anụ ihe banyere ya?” Ọ gụrụ ya agụụ ịhụ ya.
10 U bi hla tre Irji ba rji ni zren mba ye na ye hla ni Yesu ikpe wa ba ka ti'a wawu. Niki u wa vuba u ba hi ni mi gbu Betsaida.
Mgbe ndị ozi a lọtara, ha kọọrọ ya ihe niile ha mere. Ọ kpọọrọ ha gaa nʼobodo a na-akpọ Betsaida ebe ha ga-anọ naanị ha.
11 Da jubu ndji'a ba wo wu rji wa Yesu hi, na hu zah ma hi niki wa kpa ba na hla tre Bachi ni tre u son nkon Irji ni klekle'a na no bi wa ba si wa sikpa'a si.
Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.
12 U Almajere ba ba toh yalu ni tie nan myen ndi ko ani kpanyeme ni ndu ndji bi wa ba ye ndu ba lu ri mi gbu wa ba he ni hwehwre ni rju yi na fe bubu kru ni kpe wa ba rhi. Don kina he hwehwre ni gbu na.
Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, “Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara.”
13 I wa hla, ni bawu ndu ba no ba kpe-wa ba rhi. U ba tre andi ki he ni gble bredi iton migyen ni lambe hari se de ki ka hi le biri ye ni bawa wa bari'a.
Ọ zara ha sị, “Unu nye ha nri ka ha rie.” Ha zaghachiri ya sị, “Anyị nwere naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma ọ bụghị na anyị ga aga zụọra mmadụ ndị a niile nri.”
14 (U ba kei indji dubu ton.) Wa ndu Almajere (mri koh ma) ndu ba hla ni bawu ni ndu ba kuson ni wuwlon k'bu-titton ni k'klen wawu.
Ndị nọ nʼebe ahụ ruru puku ndị nwoke ise. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Meenụ ka ha nọdụ ala nʼigwe nʼigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.”
15 U ba ti tohki, u indji ba kuson.
Ha mere otu ahụ, mee ka ha niile nọdụ ala.
16 U wa ban bredi'a ni lambe hari'a na nzuttu hi ni shulu, na ti lulu yo bawu na genba ti zizah, na ka no mri koh ma (Almajere) ni ndu ba gaba.
O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ.
17 U ba ri wrji wa wu mba wu na ni mbru ma, u mri koh ma (Almajere) ba vu mbru ma shuti shu ni sisen Ise-ri.
Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ.
18 Ni viri Yesu si bre Bachi ni kankrji ma, u mri koh ma (Almajere) ba ye niwu, wa myen ba, “A hi nha indji ba yo me?”
Otu ụbọchị mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka igwe mmadụ na-asị na m bụ?”
19 U ba hla niwu, “Bari ba tre, Yahaya wa ani tie batisma, bari kuma ba tre ndi Anebi Iliya, hra bari ba tre ndi ahi ri ni mi Anabawa bi sisen mu wa iri mba aka k'ma ye ni re.”
Ha zara sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ sị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa, sị na ị bụ otu nʼime ndị amụma ochie ahụ si nʼọnwụ bilie.”
20 Wa mye ba, “U bi yi na, bi yo me ndi nha?” Bitrus sa niwu ndi, “U Almisihu wa u rji ni Bachi Irji.
Ma ọ jụrụ ha, “Unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst nke Chineke.”
21 Yesu hron ba suse ni ndu ba na jla ni ndrjo naki rina.
Ma ọ dọrọ ha aka na ntị, nyesiekwa ha iwu ike ka ha ghara ịgwa onye ọbụla nke a,
22 Na hla ni bawu, A gbigbi ivren ndji ni sha ya nitu kpie gbugbu; bi ninkon ba kamba niwu ni Piristoci, ni bi nhan, nda la wuu, nivi u tra ba ta'wu shme.
na-asị, “Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche. Ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya. Aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.”
23 Na hla ni bawu wawu mba, nli indi wa ani son hu me gbigbi me ndu kama ni tuma, na ban nkunkron u wa ba kagran ni viri san ma (Giciye) na hume ko ni nton rime.
Mgbe ahụ ọ sịkwara ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m nʼazụ, ọ ghaghị ịjụ onwe ya ma buru obe ya kwa ụbọchị na-eso m.
24 Indji wa a tre ndi wawu ni kpa tuma chuwo'a, ana nawo na, ama indji wa a ka tuma no nitu mu'a, ani kpa tuma chuwo kima.
Nʼihi na onye ọbụla chọrọ ịzọpụta ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla nke tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-azọpụta ya.
25 Lada indji a hi nge, wa ani fe gbungblu'a wawa, da na fe re na?
Uru gịnị ka mmadụ nwere ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya, maọbụ bụrụ onye a napụrụ ndụ ya?
26 Indji wa ni ti shan hla tre mu, Ivren ndji me ni tie shan ma ni nton wa ani k'ma ye ni k'bu Ma ni k'bu Itti ma ni u Maleku njanji.
Onye ọbụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa Nwa nke Mmadụ mgbe ọ ga-abịa nʼebube ya, na nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.
27 Misi hla ni yiwu iwa yi a gbigbi, nimi mbi wa bi klewa bari mbi bana qu na, se ba toh Irji (Mulki).
“Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke.”
28 Yesu tre klama bi yi, na ban Bitrus mba Yahaya ni Yakubu, na hon hi nitu ngbulu ni hi bre Bachi ni mu.
Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ọ kpọọrọ Pita na Jọn na Jemis gaa nʼelu ugwu ikpe ekpere.
29 Wa ahe ni mi si bre, u shishima ka siran, U inklon ma a kpan tie kink'lan re me na zan ni ri.
Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere, ụdịdị ihu ya gbanwere. Uwe ya bidoro ịchaa ọcha nke ukwuu.
30 Hihari me indji hari, ba si tre ni Yesu, ba Musa mba Iliya.
Nʼotu ntabi anya, ha hụrụ ndị ikom abụọ ka ha na ya na-ekwu okwu. Ha bụ Mosis na Ịlaịja.
31 U ba rju kagon mba ni nikon u Bachi. U ba tre ni Yesu ni tu hi kpama wa a te whre u ye tsar ni Wurushelima.
Ha pụtara nʼebube eluigwe dị ukwu na-ekwu banyere nlaghachi ya, nke ọ na-aga imezu na Jerusalem.
32 Bitrus ni Almajire wa ba he baba ba kle si kru nna na k'mo, da ba lunde, nan ba toh ikpan ma ni ndji hari ba kri niwu.
Pita na ndị ya na ha nọ na-arahụ ụra. Mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube ya na ndị ikom abụọ ya na ha nọ na-ekwurịta okwu.
33 Wa ba lu ni bri Yesu na hi kpa-mba, Bitrus tre andi ttie ko mu, abi ni tawu wa ki he niwa, ani bi ndu ta me-tra tie tra; iri ni wu, iri ni Musa u iri ni Iliya. (Ana toh kpe wa a si tre'a na.
Mgbe ha na-ahapụ ya, Pita sịrị Jisọs, “Nna anyị ukwu, ọ ga-adị mma ka anyị nọrọ ebe a ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ, otu ga-abụ nke gị, otu ga-abụ nke Mosis, otu ga-abụkwa nke Ịlaịja.” Ọ mataghị ihe ọ na-ekwu.
34 Wa he nimi tre, u kpalu a lu ka ba, u ba tie sissri ni wa ba lu ri ni kpa lu'a.
Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Egwu tụkwara ha dị ka ha na-aba nʼigwe ojii ahụ.
35 U ba wo lantre rji ni kpalu'a, ni tre ndi, iwa yi mba ahi vren Mu wa me chu'a wo wu.
Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara; geenụ ya ntị.”
36 U lantre ban chuwo tre ni kpalu'a, Yesu he ni kankrji ma. U ba son ni ngbangbi ba na hla kperi ni ndrjo ni vi bi kii wa ba toh na.
Mgbe olu ahụ kwusiri okwu, ha chọpụtara na Jisọs nọ naanị ya. Ndị na-eso ụzọ ya kpuchiri ọnụ ha, debe ihe niile nʼobi ha, ọ dịkwaghị onye ọbụla ha gwara ihe ha hụrụ.
37 Ni vi rima wa ba grji rji ni ngbulu ye, u gbugbu indji ba ye niwu.
Nʼechi ya, mgbe ha si nʼugwu ahụ rịdata, oke igwe mmadụ bịara zute ya.
38 Hihari me, U ri ni mi indji ba a tre ngban me, Mala bubo me, k'ma ya vren mu, ahi vren mu iriri mi gen.
Otu nwoke si nʼetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu tie mkpu sị, “Onye ozizi, arịọ m gị ka i lee nwa m nwoke anya, nʼihi na naanị ya bụ nwa m nwere.
39 Meme brji ni hon ni wu tu na yo ku-k'mo, na jijiga niwu na gben glele na yo futen shu yiu. Ni ker ri a ban chuwo ani timba ana fie fie mana idan a ban chuwo.
Mmụọ ọjọọ na-ejide ya mee ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-atụda ya nʼala, na-ese ya ese, na-adọkwa ya adọ mee ka ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ. Ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ya kama ọ na-echihịasị ya ahụ.
40 Mi bre mi ri koh me (Almajere) ni dun ba zu meme brji rju ni wu ni kpa, u bana ya na
Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike.”
41 Yesu tre andi biyi bi tsren g'gran ni ka kpa nyeme ni k'ma bi ni tan mi ua vu suron ni son ni yi? “Nji vren me ye wa yi.”
Jisọs zara sị, “Leenụ ọgbọ rụrụ arụ, nke na-enweghị okwukwe! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ, ruokwa olee mgbe ka m ga-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwa gị nwoke ahụ nʼebe a!”
42 U vren lu ni hi meme brji wru yo k'bon ni menme u Yesu zu meme brji na chu lilo rju niwu na ka no tie ma
Mgbe ọ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwadara ya nʼala sesie ya ike, ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. Ọ gwọrọ nwata ahụ kpọnyekwa ya nna ya.
43 U ba tie sissriwawu mba, wa ba toh gbengble u Irji wa a tie na hla ni Almajere ma,
Ebube ukwu nke Chineke tụrụ ha nʼanya. Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ ọ rụrụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya,
44 “Bi ka ndu tre yi ri ni yiwu ni ton su se: Ivren Indji mba ka no ba ni wo indji.”
“Geenụ ntị nke ọma banyere ihe m chọrọ ịgwa unu. A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ.”
45 U bana toh itu tre na, a ri ni bawu, ni ndu ba toh tu kpi a si tre na, naki me ba tie sissri nda miyen itu tre me na.
Ma ha aghọtaghị okwu a. E zonarịrị ya nʼebe ha nọ ka ha ghara ịghọta ya. Egwu tụkwara ha ịjụ ya ihe ọ pụtara.
46 Ba lu ni gbi suron ni kpa mba, andi a nhan zan ma ninkon'a.
Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha banyere onye karịrị ibe ya ukwuu.
47 Yesu toh kpe wa a he ni suron mba, na ban kpran vren ye tsi ni kpa ma ko san.
Ebe Jisọs ma ihe ha na-eche, ọ kpọtara otu nwantakịrị mee ka o guzo nʼakụkụ ya.
48 Na hla bawu, ndu ndji wa a kpa vren klenken yi, ni mi inde mu'a a kpame, indji wa a kpame, a kpa indji wa a ton me. Indji wa a vi zizanma ni yi'a a wa wuyi a ninkon ni mi mbi.
Ọ gwara ha sị, “Onye ọbụla nabatara nwata a nʼaha m, nabatara m. Onye ọ bụlakwa nabatara m, nabatara onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nʼetiti unu bụ onye kachasị ukwuu.”
49 Yahaya yo a ndi ninkon mbu, ki toh indji ri niwa mu si ju brji ni ndji ni nde me wana nihu ta ni mi mbu na.
Jọn a zaa sị, “Nna anyị ukwu, anyị hụrụ otu onye ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị anyị, anyị gbochiri ya.”
50 Yesu tre na zuuna, indji wa ana yo ko shi na ahi u me.
Jisọs sịrị ya, “Unu egbochila ya. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.”
51 U vi chibi ye whiwhre wa ba ban hon hi ni shu, wa yo suron ma ndi wa wu ni hi Wurushelima.
Mgbe oge o ji alaghachi na-abịaru nso, o chere ihu ya ịga Jerusalem.
52 Wa ton Manzani duba guchi hi niwu, u ba ka ri ni gbu Samariya wa be m'lan ko nge tie niwu ki.
O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa;
53 U indji ba niki bana kpa ni wo ha na, don ba toh a yo suron u hi ni Wurishelima.
ma ha jụrụ ịnabata ya nʼihi na o chere ihu ịga Jerusalem.
54 Wa Imri koh ma (Almajire) Yakubu mba Yohana ba toh naki, nda tre, “Bachi, U son ndu ta ton ilu rji ni shulu dun gon ba?”
Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?”
55 Wa k'ma ya ba nda zuba.
Ọ tụgharịrị bara ha mba.
56 U ba tsi ka hi ni gbu ri kan.
Ma ha pụrụ banye nʼobodo nta ọzọ.
57 Wa ba he ni mi si hi ni gon, u ndrjo a tre niwu, “Mi huwu hi ni wawu wrji wa usi hi.”
Mgbe ha nọ na-aga ije a, otu nwoke sịrị ya, “Aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.”
58 Yesu hla ni wu andi, n'nma bi miji ba he ni juju wa ba ri ni mi, u nchinchen ni shu ba he ni koh mba, u Me Vren Ndji mina he ni wrji u ka tu yo na.
Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ, ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe ọ na-atụkwasị isi.”
59 Wa a hla yo ri andi “Hu me.” U ndji'a hla ndi, “Bachi, Mi bre'u dun mi guchi hi rju itti mu ri.”
Ọ gwara onye ọzọ sị, “Soro m.” Ma ọ sịrị ya. Onyenwe anyị, “Biko, nye m ohere ka m gaa buru ụzọ lie nna m.”
60 U wa hla niwu, “Bri k'mo ndu ba rju k'mo ba kimba. Ama niwu hi gbugban mu ni hi hla tre Irji kagon gbungblu.
Ma ọ sịrị ya, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha. Ma gị gaa kwusaa alaeze nke Chineke.”
61 U indji mu kan tre mi hu, Bachi, a ma ndu mi hi hla ndji mi hi ni bawu ni koh mu.
Ma onye ọzọkwa, sịrị ya, “Aga m eso gị, Onyenwe m, ma kwere ka m buru ụzọ gaa sị ndị ezinaụlọ m nọdụnụ nke ọma.”
62 Yesu hla niwu, “Andi Indji wa a kawo vu zan ni soma yarrhan da hla ka ya gon indji mba ku nyre wa ani toh koh Irji.
Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla jidere aka nʼọgụ anụ ụlọ na-adọkpụ ma na-ele anya nʼazụ ekwesighị alaeze Chineke.”