< Luke 21 >

1 Yesu zu ya da toh indji bi nklen ba si sru baiko ba,
Ọ leliri anya elu hụ ka ndị ọgaranya si etinye onyinye ha nʼime igbe onyinye.
2 Wa a toh iwa u kbo ani tiya kpukpu me, wa ji bubu ba ye ka you ni kagi.
Ọ hụkwara otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ ka ọ bịara tinye naanị mkpụrụ ego kọpa abụọ.
3 A tre njanji mi hla yu'u, iwa u koh a zan yi.
Ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, nwanyị ogbenye a di ya nwụrụ etinyela ego karịa ndị ọzọ niile.
4 indji biyi ba yo ni mi gbugbu u ba. Naki iwa u koh ni miyah ma ayo wawu ikpe di a he niwu.
Nʼihi na ndị ọzọ niile nyere onyinye ha site nʼego mapụtaara ha nʼakụnụba ha, ma ya onwe ya sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o ji biri.”
5 Bari ba tre ni tu tra Irji, yada ba mla tie bi ni tita ni baiko, A tre.
Mgbe ụfọdụ na-ekwu okwu banyere otu e si were nkume mara mma na onyinye e chere nʼihu Chineke, chọọ ụlọnsọ ukwu ahụ mma, ọ sịrị,
6 Ikpi bi yi wa bi si toh, ivi ri ni ye wa tita ri na sun nitu ri na ba na grji ye ni meme'a na.
“Ma banyere ihe ndị a, oge na-abịa mgbe ihe ndị a niile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. Ọ dịghị otu nkume a ga-ahapụ nʼelu ibe ya, a ga-akwatusị ha niile.”
7 Ba mye, mala, kpi biyi ba ye ni tan? A ngye ni tsro ta inton wa kpi'a ba ti'a?
Ha jụrụ ya sị, “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-egosi na ha na-aga imezu?”
8 Yesu ka hla ni bawu, mla ya, na du indrjo ye gyru yi na, gbugbu ba ye ninde mu, da tre ndi ame yi me wawu, u inton a tie whewhre, na hu ba na.
Ọ sịrị, “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya,’ na-asịkwa na ‘Oge ahụ dị nso.’ Unu esokwala ha.
9 Inde bi woh ba taku da ni tsi bi kana klu sissri na, ni mumla se kpi bi yi ba ye, u kle, gbugblu na ye zizan na.
Mgbe ọbụla unu nụrụ akụkọ agha dị iche iche na ọgbaaghara, ka ụjọ ghara ịtụ unu, ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ mezuo, ma ọgwụgwụ oge erubeghị.”
10 Wa a hla ni bawu, gbugblu ni lu ni tu gbugblu, mulki ni lu nitu mulki.
Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze.
11 Meme u gbugblu yi ani grju kagon, iyon ni tie ni gbugblu wawu, lilo ni ka gbugblu'a wawu. Ikpi bari ba grji rji shu da no sissri.
A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nʼebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe dị egwu na ihe ịrịbama dị ukwuu site na mbara eluigwe.
12 Naki kpi biyi du ba ye, ba tsi yi da ti meme kpe ni yiwu, da zu yi ni tra Irji, ba vu yi sru ni brusuna, ba gbi yi hi ni ba chu, baba ngona, nitu inde mu.
“Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m.
13 Ani he ijou tre.
Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe.
14 Na ri mre kpi wa bi tre ni koshi na,
Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza.
15 Me mi no yi trre wa bi tre, di no imrre ndindi wa bi kra yi banaya krie ni yi na.
Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide.
16 Ba ti bi, mri vayi, mla bi baba kpukpa bi ba tiyi yah da wu bari bi.
Ọ bụladị ndị mụrụ unu, ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ikwu unu na ndị enyi unu, ha ga-arara unu nye nʼaka ndị ọchịchị, ndị ga-egbukwa ụfọdụ nʼime unu.
17 Ndji ba wawu bbawu ba kran yi ni tu inde mu.
Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m.
18 Naki ko futu riri ni tubi na joku na.
Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi.
19 Ni mi vu suron bi bi kpa re bi.
Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu.
20 I hi toh soja ba kru wurushelima you ni tsutsu, bika toh ndi joku ma tie whewhre.
“Mgbe unu hụrụ ka ndị agha gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nʼiyi eruola.
21 Biwa ba he ni Judiya du ba tsutsu hi ni gblu u bi wa ba he ni mi gbu ba ka don gbu'a u bi wa ba he ni ko rah gbu'a baka ba ri nimi gbu'a na.
Nʼoge ahụ ka ndị nọ na Judịa gbalaga nʼugwu, ka ndị nọ nʼime obodo si na ya pụta, ka ndị na-anọghị nʼobodo gharakwa ịba nʼime ya.
22 Bi yi ba vi u rju hla, du kpe wa ba han duba kle.
Nʼihi na oge a ga-abụ oge ịbọ ọbọ ka e mezuo ihe niile akwụkwọ nsọ kwuru.
23 Iyah ba bi wa ba hei ne, ni bi no mri sisan ni toh kima, iya nihe ni gbu'a ni nfu ni tu ndji ba.
Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ! A ga-enwe oke ihe mgbu nʼala a, iwe ga-adakwasịkwa ụmụ mmadụ.
24 Inji gban ni kaba hle, ba vu ba kma tie gran ni gbungblu, biwa bana toh Irji na ba chan Wurushelima ni zah, se ivi u bi wa bana toh Irji na nikle
Mma agha ga-egbu ha, mba niile ga-adọrọkwa ha nʼagha. Ndị mba ọzọ ga na-azọtọsị Jerusalem nʼụkwụ ruo mgbe oge nke ndị mba ọzọ ahụ zuru.
25 Igban ni tsro ni Irji, ni wha kpan baba tsitsen, ni meme. Iya ni shu ni gbungblu, ni wrji kpukpa don yi man ni ne.
“A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa.
26 Indji ba tie sissri da ta kukmo da ni gbie kpe wa basi ye ni gbungblu, gbengblen bi shu ba ta chu.
Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji.
27 U ba toh vren ndji ni ye ni mi kpalu ni gbengblen ni kikle daukaka ma.
Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii.
28 Inde kpi bi yi basi ye, lunde krikrie ni nzu tumbi. Du ndji wa ni ye kpa yi chuwo a ye whewhre.
Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.”
29 Yesu tre nda ka yiyi ni bawu, yah kunkro indhu baba mbru kunkro ba.
Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya.
30 Biyi ni tu bi bika toh ndi iga ati whewhre.
Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso.
31 Inde bi toh kpe biyi ba he na yi bi toh ndi iye Irji a tie whiwhre.
Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso.
32 Njanji mi hla ni yiwu, i zan bi bana kle na se kpi bi yi ba ye.
“Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo.
33 Shulu ni meme ba kle, ama itre ma na kle na.
Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
34 Sun ni ya cheme, na du suron mbi ni titan hi na so di wah du na he ni mre u tu mbina kana ye ka yi na troko na.
“Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya.
35 A ni ye ni tu ndji bi gbungblu wawu
Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa.
36 Sun ni wri di ta bre chachu du yi he ni gbengblen ndi nawo ni kpi bi wa ba ye'a, wa bi kri ni kbu Vren Indji
Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.”
37 Ni nton kima, a si hla tre ni bawu ni tra Irji, ka rju nichu da ka sun ni bubu ri wa ba you ndi Olivet.
Kwa ụbọchị, ọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma nʼuhuruchi, ọ na-arịgoro nʼelu Ugwu Oliv ị ga nọọ ọnọdụ abalị.
38 Indji ba rju gbugbun ni bubu ble ye ni woh wu ni tra Irji.
Ndị mmadụ niile na-abịakwute ya nʼisi ụtụtụ niile nʼụlọnsọ ukwu ịnụrụ okwu ya.

< Luke 21 >