< Luke 16 >
1 Yesu hlani mri koh ma, (Almajirama) “A ndi igu ri he niwo (arziki) na he ni indji wa ani ya bi ndu ni wu'a, U ba ye hla ni wu indji iwo, andi igu ya bi ndu ma a ri woma ni hi kle.
Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọgaranya nwere otu onyeisi ọrụ nke e boro ebubo na ọ na-ala akụ ya nʼiyi.
2 Indji iwo'a a yo na miyen ahi nge mba mi wo? Ne lisafi ikpe wa u tie ni ya ndu'a u na la tie ndu, u ya indji ngana.
Ya mere ọ kpọrọ ya sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Gbakọọrọ m otu i si na-elekọta akụ m, nʼihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ onyeisi ọrụ ọzọ.’
3 Igu u ya indji ba (wakili) a ta mre, “Ahi nge mi ti, tun nde itie koh mu a vu me kpa ndu u ya? Mina he ni gbengble wami ya ron na, Ishan ni ti me mi na ya bre na.
“Onyeisi ọrụ ahụ sịrị onwe ya, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m ọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m ịrịọ arịrịọ.
4 Mi toh kpe u wa mi tie'a inde ba zu me ni ndu u ya indji (wakili), indji ba ka kpa me hi ni koh mba.
Amatala m ihe m ga-eme, nke a ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na a chụpụ m nʼọrụ nʼebe a, aga m enweta ndị ga-anabata m nʼụlọ ha.’
5 Ayo bi wa itie koh ma ni huba ihlah, a miyen u mumlan, 'Ahi bren itie koh mu ni hu?'
“Ya mere ọ kpọrọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ nʼotu nʼotu. Ọ jụrụ onye nke mbụ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji nna m ukwu?’
6 Andi uma a Garuwa Iyen Deri. Wa hla ni wu, kpa nvunvu u nha me, gbagbla nha hamsi nihi kuson kpa me ni ka don.
“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ puku karama mmanụ oliv ka m ji ụgwọ ya.’ “Onyeisi ọrụ ahụ gwara ya sị, ‘Ngwangwa, were akwụkwọ degharịa ya narị karama ise.’
7 Wa hla miyen ri, ibren ba hu? Wa tre, buhu alkama dari wa hla niwu, kpa nvunvu yi, ni nha tan mani
“Mgbe ahụ, ọ jụrụ onye nke abụọ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji?’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ narị akpa ọka wiiti.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ngwangwa degharịa ya iri akpa ọka wiiti asatọ.’
8 U tie koh ma kber igu lah tre san nitu wa a tie whiri, imlen imri bi, zizanyi ni indji mba, ba whiri zan imri bi kpan. (aiōn )
“Nna ya ukwu toro onyeisi ọrụ ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihi na ọ kpara agwa dị ka onye nwere uche. Nʼihi na ụmụ, nke ọgbọ a, ji akọnuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ìhè. (aiōn )
9 Mijhla ni yiwu tie kpan nitu he niwo wa ana bie na. Wa ye nna wo kle, u ba ka kpa yi hi ni koh wa bi son hi ni tuntur. (aiōnios )
Agwa m unu, jirinụ akụnụba nke ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ na mgbe ọ na-adịghịkwa akụ unu nwere, ha ga-anabata unu nʼụlọ obibi ha ebighị ebi. (aiōnios )
10 Indji wa ni tie njanji ni kpi tsitsa ma, A ni ti njanji ni rhi grama, u indji wa ana tie njanji ni kpi vi tsitsa mana, ana tie njanji ni kpi rigra ma na.
“Onye ọbụla kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, ga-ekwesikwa ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu. Onye na-ekwesikwaghị ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, agaghịkwa ekwesi ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu.
11 Inde u na tie bi ni wo wa ana u njanji na, u nhan ni kpa nyewme ni wu ni wo u njanji?
Ọ bụrụ na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ mmehie nke ụwa, onye ga-enyekwa ezi akụ nʼaka unu na ntụkwasị obi idebe?
12 Toh wu na ni tie njanji ni nji kpi u bari na, anha ni no wu inkleh u me?
Ọ bụrụkwa na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ onye ọzọ, onye ga-enye unu ihe nke bụ nke unu?
13 Ba indji wa ani ya biu tie ko hari, ni mi nton riri, se ka kpa ri na kari don, koh ka kpari tsri na kpari nyime. U na ya hu Irji mba inklen na.
“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ, sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.”
14 Farisawa bi wa ba son inklen kpukpome'a ba wo tre naki wawu na nzah.
Mgbe ndị Farisii, bụ ndị hụrụ ego nʼanya nụrụ ihe ndị a, ha jiri ya mee ihe ọchị.
15 Wa hla bawu, 'Biyi bi ban tu mbi ni shishi ndi ni kperi, ama Irji toh mi suron mbi. Ikpi wa ndi ba kpanyime niwu wawu, ahi kpi u shan ni Irji.
Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke.
16 Attaura ni Litafi Anabawa ba he si ye ni ye Yohana rji ni nton ki ye zizan yi, ba tsikpa bubu bla tre Irji, indji wa wu ba ri ti tu ni gbengblen ni yo tu mba niwu.
“Iwu na ndị amụma nọ na-achị ruo oge Jọn bịara. Site nʼoge ahụ, a na-ekwusa oziọma nke alaeze Chineke, onye ọbụla na-ejikwa ike na-abanye nʼime ya.
17 A hi fie me ni shulu mba ni meme ndu ba su e tu ni wa, iten riri u Attaura ndi joku migen.
Ọ dị mfe ka eluigwe na ụwa gabiga karịa na a ga-ewepụ otu kpọm, site nʼihe niile dị nʼiwu.
18 Indji wa a ga gran ma ni Iwa-ma na kpa iwa ri a zina a si tie, ni nidji wa a kpa iwa wailon ma zu a hi zina a si ti.
“Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụlakwa lụrụ nwanyị di ya jụrụ na-eme mmehie ịkwa iko.
19 Indji iwo ri a shur kpimabi tie le nani zren zren ma ko ni nton ri meh.
“Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe odo odo na ezi akwa ọcha, na-erikwa nri dị mma ụbọchị niile.
20 U indji u bre ri ba yo ni Lazaru ba nji ye ka yo ni nkotra koh ma, ni kpukpa inkpa-n ni kpa,
Nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, otu nwoke onye ogbenye nke ọnya juru ahụ ya na-edina nʼebe ahụ. Aha ya bụ Lazarọs.
21 Wa ni son rhi birhi wa a kuble ni tu tebru, u yawu ba ye nle kpa-n.
Ọ na-agụsị ya agụụ ike iri iberibe nri si na tebul ọgaranya ahụ daa nʼala. Ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nʼahụ.
22 Wa ye tsra ni nton wa indji u bre a ye kyu, u Maleku ba ye ban hi ni nhma ko wa Ibrahim he. U ndji u wo'a (arziki) a kyu u ba ban ka rju.
“Mgbe onye ogbenye ahụ nwụrụ, ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nʼebe Ebraham nọ. Onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya.
23 wa ka ri ni koh lu, wa zun shishi hi ni shu, na toh Ibrahim gbugban mu ba sun mba Lazarus ni ngbala ko wa Ibrahim he. (Hadēs )
Nʼọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nʼoke ihe mgbu, ọ hụrụ Ebraham ka ọ nọ nʼebe dị anya, hụkwa Lazarọs nʼakụkụ ya. (Hadēs )
24 Wa yra yi yo, Itie mu Ibrahim, toh me ni lo suron ni ton Lazarus, ndu ka vren wo ma son ni mma, na chu kpi yo ni mu ni lbe ndu jubu gbugbran mu.
Ọ kpọkuru Ebraham sị ya, ‘Nna m Ebraham, meere m ebere nʼihi na anọ m nʼoke ihe mgbu nʼime ọkụ a. Biko zienụ Lazarọs ka ọ denye mkpịsịaka ntakịrị ya na mmiri bịa mejụọ ire m.’
25 Ibrahim tre vuvren, Rimre ni sun me ni gbungblu, u rhi ro wo me ni kpa kpi bi bie ma, u Lazarus si tiya, u zizan mba ba ndu si toh roma ni wa, Iwu mba u si tiya.
“Ma Ebraham sịrị ya, ‘Nwa m, chetakwa na ị nara ezi ihe gị mgbe ị dị ndụ, ebe Lazarọs nara ihe ọjọọ. Ma ugbu a, a na-akasị ya obi nʼebe a ma gị onwe gị nọkwa nʼahụhụ.
26 U naki me ba shi juju ni tsitsu bi vron me, ni ndu bi wa ba sun zagran ye niyi ba ka na yana, kuma biwa ba he ni yi ko mba ba ka na zagran ye nita na.
A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nʼihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike isite nʼebe a bịa nʼebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nʼebe ahụ unu nọ bịa nʼebe a.’
27 U indji i wo tre, mi bre wu, Itie mu Ibrahim, u ka ton hi ni koh itie mu, u ngrji'a -
“Ọ sịrị, ‘Ya mere, arịọ m gị nna, ziganụ ya nʼụlọ nna m,
28 Mi he ni mri vayi mri-lon iton, ndu hi hron ba ni ndu ba na ye ni bubu yi na.
nʼihi na enwere m ụmụnne nwoke ise. Ka ọ dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịbịa nʼebe a mmekpa ahụ dị.’
29 Ibrahim hla niwu, ba he ni Musa ni anabawa, ndu ba wo ba.
“Ebraham sịrị, ‘Ha nwere Mosis na ndị amụma, ha gee ha ntị.’
30 U indji i wo, a sa niwu andi, A'a Itie mu Ibrahim, indrjo ri ni ta rji ni mi bi kyu ka hla ni bawa, ba k'ma suron mba no Irji.
“Ma o kwuru, ‘Nna Ebraham, nke ahụ agaghị ezu! A sị na otu onye ga-esi nʼala ndị nwụrụ anwụ gakwuru ha, ha ga-echegharị.’
31 U Ibrahim hla niwu, inde bana wo Musa ni anabawa bana, ko indji wa a kyu lunde na ka hla ni ba wu bana wo wu na.
“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụrụ na ha egeghị Mosis na ndị amụma ntị, ha agaghị ekwenye ma a sịkwarị na mmadụ esi nʼọnwụ bilie.’”