< Luke 12 >
1 Ni nton kima, indji dubu gbugbuwu ba rju ye shubi nitu bran mba ba hon ta chan kpamba. Alu kri tre ni guchi ni mri ko ma ndi, “Mla ya yist wu Farisawa, wandi ahi gyuru ndji nitu zren mba
Nʼoge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara, nke mere ka ha na-azọ ibe ha ụkwụ. O buuru ụzọ bido ịgwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya unu banyere ihe na-eko achịcha ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ ha.
2 Ba kpe wa ba kawu wandi ana rju kri ndende ni ra na, ba kpe wa ba kari wandi bana toh na.
Nʼihi na ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe.
3 Nitu kima, ikpi wa wu tre ni bwu ba wo ni kpan, i wuta tre kpe ni riri ni ton, nimi tra, ba dbu hla ni tu nkan.
Ihe ọbụla unu kwuru nʼọchịchịrị, a ga-anụ ya nʼihe, ihe ọbụla unu gbara nʼizu nʼime ụlọ ka a ga-ekwusa nʼelu ụlọ.
4 Mi hla ni yiwu, kpukpanmu, na tie sissri bi wa ba wu ikpa megyen, dana he ni kpe wa ba la tie na.
“Ana m agwa unu, ndị enyi m, unu atụla egwu maka ndị na-egbu anụ ahụ ma e mesịa, ha apụghị ime ihe ọzọ.
5 Ama, mi gbron ton mbi nitu wa be klu'u klu wandi anita wu, a he ni gbengble wu ta u yo ni lu shetan. Ee, Mi hla ni yiwu, klu'u. (Geenna )
Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu. (Geenna )
6 Bana leni chinche sparo ton nitu wlo bubo tra na? Ni kima me, Irji na kparisu ni iri mba na.
Ọ bụghị mkpụrụ ego abụọ ka a na-ere ụmụ nza ise? Ma o nweghị nke ọbụla nʼime ha Chineke chefuru.
7 Infutu wu tume me a bla ba pempe. Natie sissri na. Wu he ni ndu zan chinchen sparo gbugbuwu.
Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.
8 Mi hla ni yiwu ndji wa a kri nda tre ni tu mu ni shishi ndji, Vren Ndji ngame ni tre ni tuma ni shishi Maleku Irji,
“Ma asị m unu, na onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, onye ahụ ka Nwa nke Mmadụ ga-ekwupụta nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke.
9 Anita kama ni me ni shishi ndji, ba kama niwu ni shishi Maleku Irji.
Onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, a ga-agọnarịkwa ya nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke.
10 Ko nha wa a tre lan tre meme nitu Vren Ndji, bakpa wru hle niwu, ama wuta tra valala wu gbron gbrongrji, nitu Ruhu Tsatsra, bana wru hle niwu na.
Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya.
11 Bati ngrji wu ye ni shishi kikle bi mitra Sinagog, bi tie chu baba bi ninkon gbu, na du suron mbi rjoku nitu kpe wandi bi tre wa ani kpauyi chuwo na.
“Mgbe ha ga-akpọbata unu nʼihu ụlọ nzukọ, ndị ọchịchị na ndịisi, unu echegbula onwe unu otu unu ga-esi zaghachi, maọbụ ihe unu ga-aza, maọbụ ihe unu ga-ekwu.
12 Ruhu Tsatsra ni tsro yi ni nton kima, ikpe wa bi tre'a.
Nʼihi na Mmụọ Nsọ ga-ezi unu nʼoge awa ahụ, ihe unu kwesiri ikwu.”
13 Ndji rinimi ikpan ndji ba a tre niwu ndi, Ticha, hla ni vayi mu ni du ga gado mbu ni me.
Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o kenye m oke nʼihe nketa anyị.”
14 Yesu a hla wu ndi Ndji, anha yo me mi ga tre koh du mi ri nimi tre mbi?
Ọ sịrị ya, “Nwoke, onye mere m onye ikpe maọbụ onye ndozi okwu nʼetiti unu?”
15 A tre ni ba andi, mla toh ni na du son tu do honyi na, nitu mlason ndji ni vrhi ana nitu kri ni gbugbu ikpi wa a he ni wuna.
Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.”
16 Nikima, Yesu a tre parabul ni bawu ndi, “Irju ndji wu wo ri nu birhi gbugbuwu.
Ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu ọgaranya nwere ala mịrị nnọọ mkpụrụ dị ukwuu.
17 A son nda mla ya ni kpama nda tre ndi, 'Mi tie ni he, nitu mina he ni bubu wa mi zi biri wu wru mu na?'
O chere nʼime onwe ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme nʼihi na enweghị m ebe m ga-echekwa mkpụrụ m?’
18 A tre ndi, ngye kpe wa mi ti a yi. Mi zi ba wronmu ni mme bi rigrama, nike mi zi biri wu wrhu mu mba mbru ikpi mu wawu.
“Ya mere ọ sịrị, ‘Ihe m ga-eme bụ nke a, aga m akwatu ọba m, wuo nke ka ya ukwuu, bụ ebe m ga-echekwa mkpụrụ m na ihe ndị ọzọ.
19 Mi hla ni suron mu, “Suron, wu he ni kpi gbugbuwu wa wu mla zi wu ise gbugbu ni ko shishi. Kuson si rhi ni so, son piyame.'”
Ya mere aga m agwa mkpụrụobi m, “I nwere ọtụtụ ezi ihe ga-ezuru gị ọtụtụ afọ, nʼihi ya zuru ike, rie, ṅụọ ma nweekwa obi ụtọ.”’
20 Ee, Irji hla wu ndi, 'Ruhu ndji, ni chu wu luwa, ba kpa vrhi suron meluwa, i ikpi ba wu mla zi ba, wu don ni nha?'
“Ma Chineke gwara ya sị, ‘Onye nzuzu, nʼabalị a ka a ga-achọ mkpụrụobi gị nʼaka gị. Ihe niile ị kpakọtara nke onye ka ha ga-abụ?’
21 Kima he na bibi ndji bari, ba vu kpi si mla zi ni tu mba, nda k'ma tie bi kpla ni Irji.
“Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọbụla na-akpadoro naanị onwe ya akụ, ma ọ baghị ụba nʼebe Chineke nọ.”
22 Yesu a hla ni mri koh ma ndi, Mi hla yiwu, na dame ni tu me na, ikpe wa wuri, ko ni kpame, ikpe wa wu sru.
Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ya mere, asị m unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi.
23 Vri son a zan biri i kpa zan nklon wu sru.
Nʼihi na ndụ dị mkpa karịa ihe oriri, anụ ahụ dịkwa mkpa karịa uwe.
24 Ya kikle chinche ravins, bana chu ndana han na. Ba na he ni tra wu zi kpi ko wron na, ama Irji ni nuba irhi-mba. Wu na zan chinche ba ni anfani ni shishi Irji na?
Tuleenụ ugolọma. Ha adịghị akụ maọbụ ghọrọ mkpụrụ ọbụla. Ha enweghị ụlọakụ maọbụ ọba, ma Chineke na-azụ ha nri. Unu ọ dịghị oke ọnụahịa karịa anụ ufe ndị a.
25 Inha nimi-mbi, nitu son rhimre nitu kpe, ani du vi wu vri ma hon zan cubit?
Onye nʼime unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụ ya site nʼichegbu onwe ya?
26 Wuta na toh tie mri kpi toh wayi na, nitu ngye wu du suron me du na kuson si na?
Ebe unu na-apụghị ime ihe nta dị otu a, gịnị mere unu ji echegbu onwe unu banyere ihe ndị ọzọ?
27 Ya mri vunvu bi kpan mbi ni shishi to lilies, ni lu gbron mbu, bana tiya na, bana k'ma ya bubu na, ee, Solomon me ni nzu hon ma ana sru ikpi wu bi toh iri-mba na.
“Tuleenụ otu okoko ọhịa lili si eto. Ha adịghị arụ ọrụ ọbụla maọbụ tụọ ogho. Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a.
28 Irji nita nu ghiga wu wrhu, wandi luwa ahe, i mble ba kau taga ni lu, ani tie he ndana nu nklon wu sru na? Wu ndji wu kpanyime ni wu fime.
Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ pụghị i si otu a chọọ unu mma karịa? Unu ndị okwukwe nta.
29 Na yo shishi ni kpe wa wu rhi ndi sona, na du suron me hamma ni kukru na.
Ya mere, unu adọgbula onwe unu maka ihe unu ga-eri maọbụ ihe unu ga-aṅụ. Unu echegbukwala onwe unu.
30 Gbungblu wawu ba yo suron wa ikpi biki, i Timbi toh wu son kpi baki ngame
Nʼihi na ọ bụ ihe ndị a ka ndị mba nke ụwa na-achụso, ma Nna unu makwara na ha dị unu mkpa.
31 Wuka yo suron meni iko mulki Irji guchi, i ba vu kpibiyi nha niwu tuma.
Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
32 Na tie sissri na, ikran mri nitu Iti-mbu toh a bi ni du nuta ri ko mulki ma.
“Unu atụla egwu, igwe atụrụ nta, nʼihi na ọ tọrọ Nna unu ụtọ inye unu alaeze ahụ.
33 Le ni ikpi me ni nu sadaka. Wran ngomble ni kpa-mbi wa ana y'ba na - ikpe ndindi ni shulu wandi ana kle na, i ndji wu y'bi na ye whiewhiere na, i imra na kpa timeme na.
Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya.
34 Bubu wa ikpe ndindi me he'a, suron me ni he ngame.
Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.”
35 Lo kpa mla tie ni rjirji ni nchi, ni du ilu me si kpan,
“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu.
36 nna ndji biwa basi gben ti-kohmba du k'ma rjini ko gran, anita ye wrunko, baka bwu niwu gbagbla.
Dịnụ ka ndị ohu na-echere nlọghachi nke nna ha ukwu, onye gara oriri agbamakwụkwọ, bụ onye ha ga-emeghere ụzọ ngwangwa mgbe ọ lọtara kụọ aka.
37 Lulu he ni tu igran biwa tikomba niye to ba si gben yemma. Njanji, mi hla yiwu, ani mla kpama tie wu tindu nda du ba son nitu tabur, wa a ni lu tindu bawu.
Ndị ohu ahụ ga-abụ ndị a gọziri agọzi, bụ ndị onyenwe ha ga-ahụ na ha nọ na nche mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu na ọ ga-eke belịt ya nʼukwu ya, mekwa ka ha nọdụ ala na tebul iri ihe, ọ ga-abịakwa jere ha ozi.
38 Tikoh anita ye ni nh'ma wu ha ko nh'ma wu tra nda ye toh bi ki ni sisren si gben i lulu ni tu igran baki.
Ngọzị ga-adịrị ndị ohu ahụ onye nwe ha ga-ahụ ka ha nọ na njikere, ọ bụladị ma ọ lọghachiri nʼetiti abalị, maọbụ nʼezigbo isi ụtụtụ.
39 Ama bika toh, tikoh nita toh nton wa ndji wu y'bi ni ye'a, ana du rhi ni ko'a na.
Maranụ nke a: ọ bụrụ na onyenwe ụlọ maara oge awa onye ohi ga-eji abịa nʼụlọ ya, ọ gaghị ekwe ka onye ohi ahụ tiwaa ụlọ ya.
40 Son ni sro, wuna toh nton wa vren ndji ni yena.
Unu kwesiri ịnọ na njikere nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.”
41 Bitrus a tre, “Bachi wusi hla tre yi ni tawu megyen ka ni konha?”
Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị tụrụ ilu a nʼihi anyị, ka ọ bụ maka onye ọbụla?”
42 Bachi a sa ndi, “A hi nha ndji ndindi wa tikoma ni nu ndu ya mbru igran ma, ani mla ta nuba biri mba ni ntonma?
Ma Onyenwe anyị sịrị, “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ụmụodibo ya niile, ka ọ na-enye ha nri mgbe o kwesiri?
43 Lulu he ni tu igran wa tikoh niye toh si ti ndu wa bana nu anita k'ma ye.
Ngọzị na-adịrị ohu ahụ nke onyenwe ya ga-ahụ ka ọ na-arụ ọrụ ahụ mgbe ọ ga-alọghachi.
44 Njanji mi hla yiwu, ani yo ni tu ikpi koh ma wau.
Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme onye nke ahụ onyeisi nke ihe niile o nwere.
45 Igran a nita tre ni suron ma ndi, “Bachi mu ani ti grji ni ye, nda lu si tsi igran lilon baba mba biwa ba he ni wo ma, nda rhi nda so nda wha,
Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị nʼobi ya, ‘Onyenwe m na-anọ ọdụ ịlọta,’ ọ bụrụkwa na ọ malite itigbu ụmụodibo ndị ọzọ, bụ ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi, na iri ihe oriri, na ịṅụkwa ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya oke.
46 Bachi igran niye ni ivi wa ana tie mre na mba nton wa ana to na, anic'ba tie tsitsa nda ban yo ni bubu bi ka toti ndindi.
Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe.
47 Igran kima, nitu ana toh suron bachima ye, ama dana mla son nda tie kpi wa ani son na, ba tsiwu branbran.
“Ohu ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ma hapụ ịnọ na njikere, maọbụ ime ya, ka a ga-apịasi ụtarị ike.
48 I waa ana toh na ama nda tie ikpe wa du ba tsiwu a, ba tsiwu ifimeyi. Ndi wa banu ikpi bran bran, ni wo ma, ba kpa branbran. Wandi ba zi kpi gbugbuwu ni woma, ba mye ikpi wa azan kima.
Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ.
49 Mi ye nitu ye yo lu ni gbungblu mem, i mi son ndi ilu anina nu ye.
“A bịara m iwebata ọkụ nʼelu ụwa, ọ gaara adịrị m nọ mma ma ọ bụrụ na ọ malitelarị inwu!
50 Ama mi he ni baptisma wa batie nimu'a, suron mu ni lo nitu du ba kle kima.
Enwere m baptizim nke m na-aghaghị ime, ma aga m anọgide nʼoke ihe mgbu tutu e mezuo ya
51 Bi ya mi ye nji isi ye ni gbungblu meme? Ana toki na, mi hla yiwu, ahi iga.
Unu chere na m bịara iweta udo nʼụwa? Asị m unu mbaa, kama nkewa.
52 Rji ni zizan, hini shishi, ndi ton ba he niko, iga ni ri, ndi tra nitu ndi ha, i iha nitu tra.
Site ugbu a gawa, mmadụ ise si nʼotu ezinaụlọ ga-ekewa megide onwe ha, atọ megide abụọ, abụọ megide atọ.
53 Baga ni kpamba, iti mba vren wa ni ihi ma. Ihi wa vren ma mba iwa vren ma, i wa vren ni ihi lonma.
Ha ga-ekewa; nna megide nwa ya nwoke, nwa nwoke ga-emegidekwa nna ya, nne megide nwa ya nwanyị, nwa nwanyị megidekwa nne ya, nne di megide nwunye nwa ya, nwunye nwa megide nne di ya.”
54 Yesu asia hla ni kpa ndi ba, ngame ndi, “Bita toh kpa lu ni lunde rhi ni yalu, bika gbla tre ndji, tenlu ni ye wa ani he toki.
Ọ gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe unu hụrụ urukpu ojii ka ọ na-ebili nʼọdịda anyanwụ, unu na-eme ngwangwa sị, ‘Mmiri ga-ezo,’ ọ na-ezokwa.
55 Gyungwu nita ni fu ni rji ni kogbo, bi tre ndi, gbaji wu hwuma ni ye, wa ani ye toki.
Mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, Oke okpomọkụ ga-adị, ọ na-emekwa otu ahụ.
56 Bi gyru tu-mbi, bi to sran, tsro kpa ikpi nimemembani shulu, i ti tie nihe nina toh sran ikpi wa si zren zizan na.
Ndị ihu abụọ! Unu matara ịkọwa ihu ala na mbara eluigwe. Gịnị mere unu apụghị ịkọwa oge dị ugbu a?
57 Bi ti he mu nina gatre ni kpame na?
“Gịnị mere unu adịghị ekpebiri onwe unu ihe ziri ezi?
58 Wuta hi niwandia no son na, ni shishi ndji wu ga tre, bita rhi he ni nko, bika mla ti ni kpambi, nitu du na njiwu hi lo, ni du ndji wu ga tre kana vu nuwa ani, njiwu hi tro na.
Ọ bụrụ na gị na onye na-ebo gị ebubo esoro na-aga nʼihu ọkaikpe, gbalịsie ike ka gị na ya kpezie nʼụzọ, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-akpọpụ gị nʼihu onye ọkaikpe, ma eleghị anya ọkaikpe ahụ ga-arara gị nye nʼaka ọkaikpe ukwu, ọkaikpe ukwu ga-ararakwa gị nye nʼaka onye na-eje ozi nʼụlọikpe, bụ onye ga-etinye gị nʼụlọ mkpọrọ.
59 Mi hla niwu, wuna to wru na, se wu han kubu wa ba han pempyeme
Asị m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri ọ bụladị otu kobo nke ikpeazụ.”