< Yohana 8 >
1 Yesu hi ni gbunlu Zaitun.
Ma Jisọs rigooro nʼUgwu Oliv.
2 Ni mbubele a ka ban ye ni hekeli, indji wawu'u ba kaban ye niwu, aye kuson na si tsoro ba.
Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe.
3 Se bi nha ni Farisawa ba nji Iwa wandi ba vu asi tie ngyungyu, u ba yo ni tsutsu mba.
Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile.
4 U ba tre niwu, Malan, Iwa yi ba vu ahe ni mi si ti ngyungyu.
Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko.
5 Ni du Musa, a tre ki ta bi indji bi ki, Iwu u tre nigen ni tuma?”
Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?”
6 U ba tre naki ni ndu sa tre ni ndu ba fe ni ikpe wa ani kpa ndema tie meme (Ko latre), u Yesu sontu grji na si nha ni menme ni vren wo.
Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo. Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala.
7 U ba kamba na kri ti tutu bubu miyen, wa lukri ni ndide na hla bawu, “Indji ri ni mi biwa ato ana latre na, ka guci ta.
Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.”
8 A la sontu grji na nha ni vren woma.
Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe ọ na-ede nʼala.
9 Ba wo naki na lu shan rju ni yi yir ri ni ninkon, na ka Yesu don ni grjima, mba Iwa wa ba na yo ni tsutsu mba.
Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya.
10 Yesu lu kir dinde na miyen, “Iwa, bi wa ba nha wu ba he ni tse? Idiori na nhau na?
Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, “Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?”
11 Wa hla ba diori, (Ubangiji), “Yesu tre, imeme mina nhawu na, hi na la latre ganna.
Ọ sịrị, “O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ.”
12 Yesu tre niba ganri, andi, “I hi me yi mi kpan u gbungbulu, Indji iwa a hume ana tre ni bwuh na ama ani he ni kpan u re (iviri).”
Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”
13 Farisawa ba tre niwu, “U zi tre nitu ikpe wa wuto'a nmitu tume, ana njanji na.
Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.”
14 Yesu sa nibawu na hla, mi ti sheda tu mu me, ahi njanji, mi to iwurji wa mi rji ni wa mi hi'a, biyi kuko bina to wurji wa mi rji'a na, bina to wurji wa mi hi'a na.
Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga.
15 Bi tron u son tu, ime na tron to ni diori na.
Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe.
16 Ko mina tron ni diori me, itron mu mu'a a u njani nitu ana me kankrji mu na, ki he mbu Iti mu wa a ton me.
Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m.
17 Ee, Ana ki ni du wa ba nha mi tre bitsi, andi sheda indji hari a njanji.
E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’
18 Ahi me yi mi sheda itu mu, u Itimu iwa a ton me a sheda mu.”
Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.”
19 Ba miyen, “Iti me ahe ni tsen?” Yesu hla ni bawu bina tome na, me bika tre Itimu, bina to me, bina to Iti mu'a me.
Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.”
20 A hla tre biyi whirewhir ni bubu wa ba zi kpi wa si tsoro ba tre Rji ni mi hekeli, idiori na vu na nitu iton ma na tsira rina.
Okwu ndị a niile ka o kwuru nʼụlọnsọ ukwu ha, mgbe ọ na-akụzi ihe na mpaghara ụlọ ahụ ebe a na-adọba onyinye. Ma ọ dịghị onye ọbụla jidere ya nʼihi na oge ya erubeghị.
21 Na hla bawu bru, mi hi biwa bina to me na, bi kwu ni mi latre bi. bubu wa misi hi'a, bina ya hi na.
Ọzọ ọ gwara ha, “Aga m ahapụ unu, unu ga-achọ m, ma unu ga-anwụ nʼime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nʼebe m na-aga.”
22 Yahudawa ba tre, ani wutuma mu, na ni tre iwurji wa mi hi'a bina ya hi na?”
Nke a mere ka ndị Juu na-asị, “Ọ ga-egbu onwe ya? Ọ bụ ya mere o ji sị, ‘Ebe m na-aga unu apụghị ị bịa’?”
23 Yesu hla bawu biyi bi rji ni meme, u me mi rji ni shu. Bi he ni gbungbulu yi, ime mina rji ni yi ni gbungbulu yi na.
Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a.
24 Iki sa mi hla niyu bi kwu ni mi latre bi. Bitana kpayemmen ni soron bi andi a hi me na, bi kwu ni mi latre bi.
A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.”
25 U ba tre niwu, awu nha? “Yesu hla ba wu, ikpe mi hla rji ni mumla.
Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ.
26 Mi he ni kpi gbugbuwu wa mi hla ni yiwu, ni gbi ton ni yiwu ni tuma. Naki me, indji wa a ton ndu, andi u njanji, ikpi wa mi wo niwu'a a baki mi si hla ni gbungbulu ba.”
E nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu nʼikpe unu ikpe. Ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nʼihi nke a, ihe niile m nụrụ site nʼọnụ ya ka m gwara ụwa.”
27 Bana tona ndi asi tre nitu Iti'a.
Ọ bụ ihe banyere Nna ya ka ọ na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ya.
28 Yesu tre, bita zu Vren Ndji hi ni shu ri bi to ndi a hi me, ndi mi ti kpi ri ni tumu na. Na wa Iti tsoro me, naki mi si ikpi ni yiwu.
Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a.
29 Wawu wa a ton me ndu'a, ana ka me don kan grji mu na, ahe ni me nitu kpi wawu wa me ti'a ani kpa soron ma si.”
Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.”
30 Wa Yesu si hla bi mba, indji gbugbu'u ba kpa yemme ni wu.
Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya.
31 Yesu hla biyi ni Yahudawa biwa ba wo na kpayenmen niwu, “Bi ta kli ni mi tre mu ni njanji, bi almajere mu bi nanji.
Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m.
32 Bi to njanji, u njanji ni kpayi chuwo.”
Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”
33 U ba sa niwu, “Ki mir bi grji ba Ibrahim wa kina ti bre hu diori kan na, iwa tre ni genri, ba kpatachuwo?”
Ha zara ya, “Anyị bụ ụmụ Ebraham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọbụla. Olee otu i si na-asị na a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?”
34 Yesu hla bawu, “Njani, njanji, mi hla ni yiwu, indji wa ani latre, ahi gran latre.
Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie.
35 Igran, na son ni ko se ka se na, ata son se ka se. (aiōn )
Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi. (aiōn )
36 Naki, ivren nita kpa yi chuwo, u bi nawo wawu.
Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu.
37 Mi to bi, bi igrji Ibrahim, bi son bi wuma, nitu wa lan tre mu na he ni bubu son ni mi bina.
Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu.
38 Mi hla ikpe wa mi to ni Ti mu, biyi bi ti ikpe wa bi wo ni ba ti bi'a.
Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.”
39 U ba sa niwu, “Ibrahim mba a timbu, Yesu hla bawu, “Bina mir Ibrahim bina ti ikpe wa Ibrahim a ti'a.
Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ.
40 U, zizan bi son wume, indji wa a hla njani ni yiwu wa a wo rji ni Rji. Ibrahim na ti naki na.
Ma unu na-achọ igbu m, bụ onye gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ nʼebe Chineke nọ. Ebraham emeghị otu a.
41 Bi ti na Iti mbi, u ba hla niwu, “Bana grji ta ni mi gyugyu na, ki he ni Iti riri, Irji.”
Unu na-arụ ọrụ nna unu rụrụ.” Ha sịrị ya, “Anyị abụghị ụmụ a mụrụ site nʼịkwa iko; naanị Chineke ya onwe ya bụ otu Nna anyị nwere.”
42 Yesu hla bawu, “Irji ana Iti bi bi na son me, u mi rji ni Irji i mi he ni yi zizan, ana ni tumu mi ye na, a wawu yi ton me.
Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m.
43 Ahi genri sa bina ya to wo tre mu na? e bina wo tre mu na.
Gịnị mere unu adịghị aghọta ihe m na-ekwu? Ọ bụ na unu enweghị ike ịnabata okwu m.
44 Bi u Ti bi, Ibrji, bi son bi hu iza ma Iti bi, ani wu ndi rji ni mumla mu ana kri ni njanji na he ni wuna, anita ni hla ice, asi hla Iti ma (isoron ma) rji ni mu a indji u ce na Iti u ce ngari.
Unu bụ ụmụ nke nna unu ekwensu. Uche unu bụ imezu ihe nke nna unu na-achọ. Ọ bụ ogbu ọchụ site na mbụ. Ọ dịghị ejigide eziokwu nʼihi na eziokwu adịghị nʼime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọdịdị ya sịrị dị, nʼihi na ọ bụ onye ụgha bụrụkwa nna nke ụgha.
45 Wa mi si hla njanji ni yiwu u bi na kpa yenme ni kpe wa mi si hla na.
Ma nʼihi na m na-ekwu eziokwu, ọ bụ ya mere unu ekwenyeghị na m.
46 Ahi nha ni ri mbi a vu me ni latre? Mi ta hla njanji u bi ka na kpayemme na?
O nwere onye nʼime unu pụrụ ịtụ m mmehie m nʼihu? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere unu ekwenyeghị na m?
47 Indji wa a u Rji ani wo tre Rji, biyi bina wo tre Irji na, nitu wa bina u Rji na.
Onye ọbụla sitere na Chineke na-anụ ihe Chineke na-ekwu. Ihe kpatara unu adịghị anụ bụ maka unu abụghị ndị nke Chineke.”
48 Yahudawa ba sa niwu, natre, “Kina hla njanji na nitu wa ki hla andi u indji u Samariya ni he ni meme brji?”
Ndị Juu zara sị, “Anyị e kwughị eziokwu mgbe anyị sịrị na ị bụ onye Sameria, na mmụọ ọjọọ bikwa nʼime gị?”
49 Yesu sa bawu, “ime mi na he ni Ibrji na, mi to ninkon u Timu, biyi bina to ninkon mu na.”
Jisọs zaghachiri, “Mmụọ ọjọọ ọbụla adịghị nʼime m, kama ana m asọpụrụ Nna m, ma unu adịghị asọpụrụ m.
50 Mina wa to tu mu ti kperi u tu mu na, Indji ri he wa ani wa na ni gbi ton.
Anaghị m achọ otuto nke onwe m, kama ọ dị onye nke na-achọ ya. Ọ bụkwa ya bụ onye ikpe.
51 Njanji, njanji, mi hla ni yiwu, indji wa a hu tre mu, ana to kwu na.” (aiōn )
Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.” (aiōn )
52 U Yahudawa ba tre, zizan yi ki to u he ni brji. Ibrahim ni ana bawa ba kwu, iwu u tre, indji wa a hu tre me ana to kwu na.' (aiōn )
Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn )
53 Ee, u na zan Iti mbu Ibrahim ni ninkon na wa kwu, ka u zan? anabawa me ba kwu, u ban tu ndi u nha?”
Ị dị ukwuu karịa nna anyị Ebraham? Ọ nwụrụ, ma ndị amụma nwụkwara. Onye ka ị na-eche na ị bụ?”
54 Yesu sa, “Mita ban tumu ti kperi u tu mu, ani u migyen, ahi Iti mu mba ban ti kperi iwa bi tre ahi wawuyi a Irji bi.
Jisọs zara, “Ọ bụrụ na m etoo onwe m, otuto m bụ ihe efu, Nna m, onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu, bụ onye na-eto m.
55 Bi mebina tou na, ime mi tou, mi ta tre mina tou na, ka mi kati iriri ni yi me, indji u ce, se me, mi to ni ni hu tre ma.
Amaara m onye ọ bụ nʼagbanyeghị na unu amaghị ya. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m ga-asị na-amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya na-edebekwa okwu ya.
56 Iti bi Ibrahim a gir ni to ivi mu, a tou na gir.”
Nna unu Ebraham ṅụrịrị ọṅụ mgbe o chetara na ọ ga-ahụ ụbọchị m; ọ hụrụ ya ma ṅụrịakwa ọnụ.”
57 Yahudawa ba hla niwu, “Una ti hamsi rina, una to Ibrahim?”
Ndị Juu sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise ma ị hụla Ebraham?”
58 Yesu hla bawu, “Njanji, njanji, mi si hla ni yiwu, mi heri, ban grji Ibrahim.
Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, tupu amụọ Ebraham, mụ onwe m nọ ya.”
59 U ba vu tita ndi ba tau, u Yesu ri tuma, na rju ni mi hekeli'a.
Ya mere, ha tụtụlitere nkume ịtụ ya, ma Jisọs zoro onwe ya, sitekwa nʼụlọnsọ ukwuu ahụ pụọ.