< Yohana 7 >
1 Ni kogon kpi biyi Yesu zren kagon mi gbu Galili, ni tu wa ana son ri ni mi ingbu Yahudiya nitu Yahudawa ba mla ki si gben ndi ba wu'u.
Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya.
2 U igan idin u Yahudawa tewhire.
Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso,
3 U miri vayi ma ba hla niwu, “Lunde hi ni Yahudiya ni ndu almajeran me ndu ba to ikpi wa u si tre ba'a.
ya mere, ụmụnne ya ndị nwoke sịrị ya, “Si nʼebe a pụọ, gaa Judịa, ka ndị na-eso ụzọ gị nwe ike ịhụ ọrụ ị na-arụ.
4 Idiori, nati kperi ririna inde ani son ndu indji ndu ba to wawuu, nitu wa u tie ikpi biyi u tsoro tume ni rira ni ngbungbulu'a
Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.”
5 Nitu wa imri vayi ma me bana kpanyime niwu na.
Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya.
6 Yesu hla ni bawu, iton mu na tsira rina, ka iton bi ni he ni tan.
Jisọs sịrị ha, “Oge nke m erubeghị, ma oge nke unu nọ nʼebe a mgbe niile.
7 Gbungbulu'a ba na ya kamba niyi na, a kama ni me nitu wa mi hla ni bawu andi indu a hi memme.
Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ.
8 Bika lunde hi ni idin, ime mi na hi na iton mu tsira rina.
Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.”
9 Ni kogon iwa a hla ikpi biyi, a kuk'ri ni Galili.
Mgbe o kwusiri nke a, ọ nọgidere na Galili.
10 Ni kogon wa imiri vayi ma ba hi ni rira na.
Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo.
11 Nitu iwa Yahudawa ba si wa'u ni bubu indji'a, nani minye, a he ni ntsen?
Na mmemme ahụ ndị Juu nọ na-ele anya ma na-ajụgharị sị, “Olee ebe ọ nọ?”
12 Rju, rju itre ba he nituma gbugbu'u nimi kuson'a, bari mba tre a hi Indji ndindi, “Ahi Ndji u toh ti.” Bari mba ba tisan, andi an, an aye kpa soron ndji ni kasran.
E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.”
13 Ni naki me idiori na tre ni rira ni tumana nitu sisir Yahudawa.
Ma o nweghị onye ọbụla kwulitere okwu maka ya nʼihu ọha nʼihi egwu ndị Juu.
14 Niwa ba ri igan indji ka ri ni zuzma, u Yesu lu ri ye hekali na (fara) ni tsroroba.
Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe.
15 Yahudawa ba luni ti sisir na ni tre, “Ani he iguyi he ni bibi kpran gbugbu'u na yi? Iwa na hi ni magrata na.
Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, “Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?”
16 Yesu kasa ni bawu, “Itsroro mu'a ana umu na, a u Indji wa a ton me ye'a.”
Jisọs zara ha, “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m.
17 Indji wa ani son ti kpi iwa ani son'a ani ya to tsoro mu'a ko a rji ni Irji, ko mi tre u mu kimu.
Onye ọbụla na-achọ ime uche Chineke, ọ ga-achọpụta ma ozizi m ọ bụ nke m ma o sikwanụ na Chineke.
18 Ko inha wa ani tre u tuma, ani wa kpandema mu, ko ahi nha iwa awa kpande Indji iwa a ton me, Indji ki a wu njanji, ikpiri meme ma na he niwu na.
Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya.
19 Musa na nuyi ndu na? Ni naki iriri ni mi mbi ana hu ndu'a na. U ahi geri mba ni yoyui ni ndu yi wu me?
Mosis o nyeghị unu iwu? Ma o nweghị onye ọbụla nʼime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji achọ igbu m?”
20 Ison indji ba hla niwu, “U he ni brji. Ahi nha mba ni son wu'u?”
Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?”
21 Yesu hla bawu, mi ti indu iriri migen, u bi ti sisir wawu mbi.
Jisọs zara sị ha, “Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya.
22 Musa noyi ji (ana ri ni Musa na, a rji ni ba Ti-Iti, Tima), ni ivi u Asabar bi no indji iji.
Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu.
23 Indji nita kpa ji, ni ivi u asabar nitu, nduba na lahtre ni du Musa na, ahi ngeri mba noyi infu ni wa ndi mi chu lilo wawu rju ni indji wa a hi lo'a ni ivi asabar?
Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike?
24 Na tron ni ya shishi na, tron ni u njanji.”
Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”
25 Bari mba rji ni Urushelima ba tre, “Iwa ana indji iwa ki si wa ndi ki wu ana?
Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị Jerusalem bidoro na-asị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu?
26 To, a tre dedeme, u ba na tre kperi meniwu na. Ana bi na ni ndu bi chu ndi ba to a ndi i wayi a hi Kristi na, ka ana naki na?
Lee ka ọ nọ na-ekwu okwu nʼihu mmadụ niile ma o nwekwaghị onye na-agwa ya ihe ọbụla. Ọ pụtara na ndịisi amatala nʼeziokwu na ọ bụ Kraịst?
27 Naki, kito i wurji iwa a rji. Ni ton iwa Kristi ni ye, idiori ana to iwurji wa ani rji'a na.”
Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.”
28 Yesu tre ngbngban me ni mi heke li'a na ni tsoro ba na ni tre, “Bi to me ni to i wurji iwa mi rji. Mina ye ni tu muna, mi ye nitu indji wa a ton ye a hi njanji biyi bina to wu na.
Ma dị ka Jisọs na-ezi ihe nʼime ụlọnsọ ukwuu ahụ, o tiri mkpu sị, “Nʼezie, unu maara m, matakwa ebe m siri pụta. Anọghị m nʼebe a na nke onwe m, ma onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Unu amaghị ya.
29 Ime mi to mi rji ni wawuyi, a wawuyi ton me.”
Ma amara m ya, nʼihi na esitere m na ya bịa. Ọ bụkwa ya zitere m.”
30 Balu ni son vu u diori na ya bre wo niwu na iton na tsira rina.
Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị.
31 Indji gbugbu ni mi mba ba kpa nyeme niwu, u ba tre, “Yesu ni ta ye, ani ti zan wayi wa ndi ati ba yi?
Ma otu ọ dị, ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ kweere na ya. Ha sịrị, “Mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, ọ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị ndị a nwoke a rụrụla?”
32 Farisawa ba wo indji ba tre toto nitu Yesu, Malami bi nikon ni Farisawa ba ton bi gben ndu ba hi vu.
Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya.
33 Yesu tre, “Miri he ni yi za mi ni vi ton ni k'ban hi ni Indji wa a ton Me.
Jisọs sịrị, “Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m.
34 Bi wa me bi na to mena, bubu iwa mi hi'a, bina ya hina.
Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.”
35 Yahudawa ba lu ni miyen kpamba, ani tsen iguyi ni hi wa kina ya hi to'a na? Ko ani hi ni Helinawa ba si yar ani hi tsoro Helinawa?
Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe?
36 A hi lan birime a ni tre naki, bi wa me u bina to me na, iwurji me hi'a na, bina ya hi na?”
Kedụ ụdị okwu bụ nke a ọ na-ekwu sị, ‘Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m,’ na ‘Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru’?”
37 Ni vi u kekle'a, ki kle ivi u idin, Yesu lu kri kri na yar yin gbangban, na hla, “Indji wa lan ma nita ni tiwu wa ka ye nime na so.
Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri.
38 Indji wa a kpayenme ni me, ina wa itre Irji'a a la, ni mi ma iba u re (iviri) ba gukbon ni mi ne ma.”
Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya.”
39 A tre naki nitu Ruhu (Ibrji ndindi), ni biwa ba kpa yeme niwu'a iki ba kpa, bana nu Ruhu (ibrji) rina, nitu wa bana gbre Yesu san rina.
O kwuru nke a banyere Mmụọ ahụ ndị kwere na ya ga-anata. Tutu ruo oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ ahụ, nʼihi na e nyebeghị Jisọs otuto.
40 Bari ni mi son'a ba lan tre ba naki, na tre, gbigbi iwa yin a hi ana ebi yi.”
Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.”
41 Bari ba tre, iwayi a hi Almasihu.” U bari ba tre, “Almasihu ni rji ni Galili?
Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.” Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta?
42 Nda tre Irji hla Almasihu ni rji ni mi mla Dauda ni Batalami na, rji ni mi vi gbu wa Dauda rji?
Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?”
43 U ba ga kpa ni mi son nitu ma.
Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya.
44 Wa bari mba ba vu, idiori na yowo na.
Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka.
45 Niki bi gben'a ba kaban ye ni Firistoci bi nonkon'a ni Farisawa biwa ba tre, “Ahi ngyeri sa bina njiwu ye na?
Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?”
46 Bi gben ba tre, ko diori na ti bre tre nayi.
Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.”
47 Farisawa ba sa ni bawa, “Ba kpayi kasran?
Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu?
48 Ka iri ni mi chuba a kpanyeme niwu, ka ni mi Farisawa?
Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi?
49 Indji bi son yi ba na to tron na, ba ti meme ye.
E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.”
50 Nikodimus hla ni bawu, wawu wa a ye ni Yesu, ni ri ni mi Farisawa,
Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha,
51 Indu mbu tre ni ndu fu ton nidi ndi ri ni wo ikpe iwa a ti'a?
“Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?”
52 U ba minye, iwume u rji ni Galili? ban ya ni hla anibi wa ani ya rji Galili'a.
Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.”
53 Niki indji wawu ba lu shan hi ni ko'mba.
Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime ha lara nʼụlọ ya.