< Ndu Manzaniba 6 >
1 Zizan ni vi biyi, wa mir ko bi hua, ba si ye ni bran Yahuda wa bi wo helenanci bi nji yiye nitu bi Ibrini yawaba, ahdi bana mla niya mmba be k'po ni zo wa ba yi bawu chachuna.
Nʼoge ahụ mgbe ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya bidoro ịmụba, ndị Juu na-asụ asụsụ Griik mere mkpesa megide ndị Juu na-asụ asụsụ Hibru nʼihi na a na-elefuru ndị inyom ha, ndị di ha nwụrụ anwụ anya na nri a na-eke kwa ụbọchị.
2 don ha'a ba yo kpaa mir ko ba nda tre ndi “Ana bi du ta ka tsro lan tre Irjhi chuwo ni k'ma ki ta ga biri na.
Nʼihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ ọgbakọ ndị niile na-eso ụzọ ya sị, “O zighị ezi na anyị ga-ahapụ ikwusa oziọma Chineke bido na-eke nri.
3 Nitu kima, bika chu, ndi tamgban ni mimbi, indhi wa ndi ba kpanyme ni ba u ba he ni rhuhu mba mre wuto ndindi, ni chuba yo ni ndu yi.
Ụmụnna anyị, sitenụ nʼetiti unu họpụta ndị ikom asaa ndị a na-agbara ezi ama na ha jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nʼaka.
4 Anita um mbu, ki kri nitu bre mba ndu tsro lan tre Irjhi.
Ebe anyị onwe anyị, ga-enyefe onwe anyị nʼọrụ ikpe ekpere, na ọrụ niile metụtara izisa oziọma.”
5 I tre mba a bi wo ni kpaandhi ba wawu. Niki ba chu Istifanus, ndhi wa a shu ni suron gbangban ni nkon Rjhi, mba ni Ruhu Tsatra, u Filibus, Prochorus, Nicanor, Timon, Pamenas, mba Nicolaus ndhi wu Antioch, wa a kpanyme n'dani hu Rjhi bibi wu Yahudawaba.
Mmadụ niile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke jupụtara nʼokwukwe na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, Prokorọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas na Nikolas, onye Antiọk na-eso ụzọ ofufe ndị Juu.
6 Bi wa ba kpanyme niwu'a ba nji ndhi biyi ye ni shishi ba manzaniba, u ba bre Rjhi nibawu nda sa wo ni tu mba.
Ha chere mmadụ ndị a nʼihu ndị ozi, ndị kpeere ha ekpere, bikwasịkwa ha aka nʼisi.
7 Niki u tre Rjhi a si bwu kagon U mir ko ni Urishilima ba si bran kpukpome. U Prist gbugbuu ba kpa trea nda hu ni gbengble suron.
Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe.
8 Zizan, Istifanus wa alheni mba gbengble ahe wu suron a si ti kikle kpi ni shishi ndhi ba.
Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ.
9 Ama Ndhi bari ba rhuki rhi ni haikali'a wa ba yo ndi Haikali wu bi wa ba chubachuwo, rhi ni Cyrenians mba Alexandrians, ni basi rhi ni Cilicia mba Asia. Ndhi biyi ba si a sen nyk ni Istifanus
Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu si nʼụlọ nzukọ nke ndị nweere onwe ha (dị ka e si akpọ ya), na nke ndị Sirini na Alegzandria nakwa ndị ọzọ sitere na mpaghara Silisia na Eshịa. Ha na Stivin malitere ịrụgharị ụka.
10 Ama bana to kri nda ti kpe zan iri hikima mba iri ruhu wa Istifanus tre'a na. Mle ba lunde le nyu bari ni du ba tre ndi.
Ma ha enweghị ike iguzogide amamihe na ike nke Mmụọ Nsọ nke o ji ekwu okwu.
11 ki wo Istifanus a sia tre lan wu mmre Musa mba Rjhi”.
Mgbe ahụ, ha ji ụzọ nzuzo kpalie ụfọdụ ndị ikom ka ha sị, “Anyị nụrụ ka ọ na-ekwujọ Mosis na Chineke.”
12 Ba chon ndhiba, ni datibe, bahabi nha (Scribes) mle ba wa Istifanus hi nda jiwu ye ni bi niko ni tra sonmba.
Ha kpasuru ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere ya jide ya, kpụrụ ya gaa na nnọkọ ụlọ ikpe.
13 Ba nji bi che du ba lha ndi ba wa to ni shishinda wa ni tonmba kpiwa ba bla sa niwu'a. Ba tre ndi iguyi na donme ni tre lan meme nitu tsatsra bubuyi mba doka Rjhi na.
Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide ya sị, “Oge niile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ebe a dị nsọ na iwu anyị.
14 Nikima, ki wo-u a tre ndi Yesu wu Na'zarat yi, ani zi bubuyi, nda k'ma njo Musa wa a yo nda ka nuta duta ki hu'a sran.
Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.”
15 Ko nha wa a son ni tra son bi ninko a sru shishi ni wu nda to shishima a k'ma rhu wu malaika.
Ndị niile nọ nʼụlọikpe ahụ legidere ya anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwu dị ka ihu mmụọ ozi.