< Ndu Manzaniba 3 >
1 Niki Bitrus mba yohanna basiya hon ni hi ni tra Rji ninton wu bre, mton wu tiya.
Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie.
2 Ba zontu ni ndhi ri, wa a chon kple rhini nine yimma, ba banu bibanmu ye zi ni kikle nkontra hekali wa ba yondi, “wu bi”. Ba ta kau zi niki chachu ni du ta bre biwa ba si rinimi hekalia.
Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma.
3 Niwa a to Bitrus mba Yohana Basia rini hi nimi hekalia a bre ba du ba nuu kpe.
Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ.
4 Bitrus a yo shishi nda gba a me mba Yohana niki, nda tre ndi, “ya ta”.
Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.”
5 Ndi wa chon kple'a nzu shishi nda yaba ni yo suron da ni kpakpe ni womba.
O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye.
6 Ama Bitrus tre ndi “mina he ni silva mba Zinariya na, ikpe wa mihe niwu, mi nu. Ni nde Yesu Kristi wu Nazarat, lu zren”
Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.”
7 Bitrus a tiwo vu u ni woma wu ko rhi da nzu u lunde, mle iza mba toza ma ba sen ququ.
O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike.
8 Gurugu mba a duo lunde kri nda ni zren; nda rhi hu ba Bitrus mba Yohana hinimi haikalia, ni zren da za ndani yose wu gbre Irjhi san
Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.
9 Ndhi ba wawumbawu ba too si zren ndani yose u gbre Rji san.
Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke,
10 Ba ya nda to ahi gu wa atason ndani bre nkle ni kikle nkontra haikali wa ba yondi nkontra wu bi a sisiri ni mre a shubawu ni suron nitu kpe wa ba to ni igu'a.
ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya.
11 Niwa a si hu za Bitrus mba Yohana, ndhi ba ba tsutsu hi riba ni nkalhang nyunko wa ba yo hihiwu Sulemanu a ndani bwu nyu yo ni wuo nitu kikle kpe wa a he nitu ma'a.
Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn.
12 Niwa Bitrus a to toki, a sa ni ndhi ba ndi. “Biyi Ndi lilon bi Israila, a ngye du yi ni bwunyu ni yo ni wuho? Nitu nagye bi sru shishi nita, rhuto kitaayi ki du gua lu zren ni gbengblen mbu koka ni gbugblu mbu
Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije?
13 Irjhi wu Ibrahim, mba wu Ishaku, ni wu Yakubu, Irjhi wu ba timbu, wawuyi a gbre veren ma Yesu san. Wa wuyi bina vuu lo di kaambi ni wu ni shishi Pilate, wa a ta son shu chuwo'a.
Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa.
14 Bi kanmbi ni Tsatra mba wa a hamma ni atre, ni mye du ba chundhi wa a wuu ndi mu chuwo niyiwu.
Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ.
15 Bi wuu wa ivri rhurhi niwu, wandi jrjhi a nzu lunde baya qu-e kita ki bi wa kito ni shishimbu.
Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a.
16 Nitu kpanyme ni suron riri ni ndema; ndema a du guyi, wa bisi ya ni to ou, a lu kri ni gbengblen ma. kpanyme ma ni Yesu a nu si kpa ni shishi mbi wawu.
Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.
17 Zizan, mir vayi mi to ndi, bi na tona biyi baba bininko mbi, ekpe wa bi tio.
“Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu kpara agwa na-amaghị ama, dịka ndị ndu unu sikwara kpaa.
18 Ama kpe wa Irjhi ana lhazi ni nyu anabawama, ndi kristi ni ti ya, kima a ye ku tou ki.
Ma Chineke siri otu a mezuo ihe o kwuru site nʼọnụ ndị amụma niile na Kraịst ya aghaghị ịhụ ahụhụ.
19 Kima gon nu latre di du ba wru latre mbe hlega.
Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu,
20 Niton wa bi he tare ni Baci wa a ni ton kristi wa a mla yo ni yiwu Yesu.
ka enyekwa unu ntute nke ime mmụọ nke sitere nʼihu Onyenwe anyị, ma zitekwara unu Kraịst ahụ, bụ onye ahọpụtara nye unu, nke bụ Jisọs.
21 Wa wuyi shulu ni kpa har hi ni nton wa kpi ba k'ma ye ti ndidi Irjhi a tre nisen, ni nyu tsatra anabawa ma'a. (aiōn )
Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ. (aiōn )
22 Musa a hla ndi. “Baci Irjhi ni nzu anabi grji kama too me nimi mir vayimbi. Bi woowu ni kpi wa ani tre yiwu nitu mba.
Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu.
23 Andi ko nah wa a kama bubu wotre anabi kima, ba gbron ba lhe penpenme ni mi mbru ndhi
Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’
24 A toki, anabawa ba wawu rhi ni samuila nibi ye ni kogonba, ba tre nda d'bu lha vi biyi.
“Nʼezie ndị amụma niile site na Samuel na ndị ọzọ so ya nʼazụ, bukwara amụma banyere ụbọchị ndị a.
25 Bi mi anabawa mba ni shirjhi wa Irjhi a tiniba bacimbi, niwa a lha ni Ibrahim ndi, “Ni zuriya me nnedhi ni gbungblu wawu ba kpa lulu.”
Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’
26 Ni wa Irjhi a nzu ndi wunduma a tonye niyi guci, nitu du yo lulu niyiwu, ni du konhambi k'ma gon nu meme drimbi.
Mgbe Chineke kpọlitere onyeozi ya, o buuru ụzọ zitere unu ya, ka ọ gọzie unu site nʼime ka onye ọbụla nʼime unu chegharịa site nʼụzọ ọjọọ ya.”