< Ndu Manzaniba 24 >
1 Niwa ivi ton aka hia, ninkon Prist Ananiyas, ni bi chiche, mba indji wu to tre ri, ni nde Tatulus, ba hi niki. Indji biyi ba nji kpe wa ba vu Bulus ni latre ye ni shishi gomna.
Mgbe ụbọchị ise gasịrị, onyeisi nchụaja bụ Ananayas na ụfọdụ ndị okenye ndị Juu na lọya ha aha ya bụ Tatulọs bịara. Ha dum pụtara ịgbagide Pọl ama nʼihu onye na-achị obodo.
2 Niwa Bulus a lu kri ni shishi gomna, Tatulus a lu si nhau nda tre ni gomna ndi, “Nitume ki he ni kikle sisron, mba to ko shishi me ani nji mla ti ndindi ni ye ni gbungblu mbu.
Mgbe a kpọbatara ya, Tatulọs pụtara guzo boo ya ebubo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka ị bụ. Nʼihi gị, mmadụ niile enwela udo ogologo mgbe. Ịdị nkọ nke uche gị emeela ka mgbanwe dị nʼobodo a.
3 Nitu ki, ni shuni ngyiri ki kpa wawu kpiwa wuti, kikle wa a bizan wawu, Felix.
Anyị ji ekele nke jupụtara nʼọṅụ na-anabata ihe ndị a nke ọma, nʼebe niile na nʼụzọ niile, gị Feliks, onye a na-asọpụrụ.
4 Nitu du mina ziu son gbame na, mi bre lo sron me ni du wo me wu nton fiime.
Achọghị m itufu oge gị. Ana m arịọ ka i were ndidi na obiọma nụrụ nkenke okwu anyị ji bịa.
5 Kiye to ndi indji yi he to nhran mba wa ani du Yahudawa wawuu kagon gbungblu meme duba ni lukri nitu bi koshishi mba. Ahi ninkon wu biwa ba rjuki nkan nda yo kpamba ndi Nazarin.
“Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị Juu nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu ndị Nazaret.
6 A ta son kpa hekalia ti rji, kima a duta vuu lo zi. / Nha vunvu bi sen bari ba kanha ndi, / Kita son ki gaatre nituma hu kpewa du mbu hla'a /
Ọ chọkwara imerụ ụlọnsọ anyị, ya mere anyị ji jide ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dịka omenaala anyị siri dị,
7 Nha bisen bari ba he ni nklan 7 mba mumla wu nklan 8, / 7 I Lysias, Ofisa, a ye ban u ni gbengble rju ni wo mbu, 8 nda yobi nha wu a duba ye ni wu. /
ọchịagha Lisias, bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị.
8 Niwa wuta mye Bulus nitu tutre biyi, wu mla to kime nitu kpi biyi wa ki si nhanwu a.
Ọ bụrụ na inyochaa ya, ị ga-enwe ike ịghọta ihe niile banyere ebubo anyị na-ebo ya.”
9 Yahudawa ba ngame ba zontu ni nhaw, ndani kpanyime ndi kpewa ba nhanu nituma ba njanji.
Ndị Juu kwadokwara okwu ya, na ihe niile e boro ya, bụ ihe mere eme.
10 I niwa gomna a tini wo du Bulus tre, Bulus a saa ndi, “Mi mla to ndi wu zi gaatre ni meme mbu wu se gbugbuwu, nitu ki mi ngyiri niwa mi ngla tumu niwu.
Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị.
11 Wu to kime ndi ana zan vi wlon don ha na rji niwa mi hon hi bre mba nzu Irji hon ni Urushelima.
Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na Jerusalem ife ofufe.
12 Niwa ba to me nimi hekali, mina sen nyu ni ndrjo na ndina kpa jbu ndji tsitu na, sinagog mba koka ni mi gbua na.
Ha ahụghị m ka mụ na onye ọbụla na-arụrịta ụka nʼụlọnsọ, maọbụ na o nwere ebe m kpatara ọgbaaghara nʼime ụlọ nzukọ, maọbụ ebe ọbụla nʼime obodo.
13 Bana mla tsro ndi ahi njanji kpe wa ba nhan me zizan nituma na.
Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m.
14 I me bwu nhran niwu ndi, nitu nkon wabayo ndi bi rhuki nkan, ni nkon kima yi mi hu Irji wu ba titi mbu, mi kpanyime ni kpi wawu ni kpi wa a kri tsra ni du mba wa ba anabawa ba nhaa.
Agaghị m agọ agọ nʼihu gị na m na-ekpere Chineke nke nna anyị ha, dịka onye na-eso Ụzọ ahụ ha na-akpọ otu. Ekwenyere m ihe niile dịka usoro nke iwu si dị, na nke e dere nʼakwụkwọ ndị amụma.
15 Mi he ni yo sron riri ni Rji to indji biyi, ndi tashme he, ni bi kri nkon ndindi mba ni bi meme sron.
Ma enwere m olileanya nʼebe Chineke nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị.
16 Niki mi nwo nyu ni na he ni meme mren ni shishi Irji mba Indji na.
Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu Chineke na nʼihu mmadụ niile.
17 Zizan, niwa se gbugbuwu ba ka hi, mi ye nu zaka mba ton ni meme mu.
“Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m Jerusalem iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ Chineke aja.
18 Niwa mi ti toki, Yahudawa bari, wa ba rhini Asiya, ba ye tome ni bubu ti gan wu ngla ni mi hekali, ana ni jbu indji ko ka ni mi kpagro wu tsitu na.
Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla.
19 Ani na zan du indji biyi duba he ni shishi me zizan nda nha me, bati na he ni kperi.
Ma enwere ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m.
20 Kaandi, du indji biyi me du ba hla kpe meme wa ba ye to nime, niwa mi kri ni shishi son bi ninkon Yahudawa,
Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye.
21 hama nitu kpe ririyi, wa mi kpagro hla niwa mi kri nimi mba, “A he nitu tashme rjini kwu wa mi kri ni tsra nituki ni shishime luwa.”
Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’”
22 Niki Felix, waana to bi nitu nkon'a, a nzu wo trea hi ko shishi. A tre ndi, “Lysias Komanda, anita grji ye rjini Urushelima, mi ya tre me toh.”
Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”
23 Niki a mmha sojoi (Centurion) ndi duba nji Bulus hi ri zi, nda duuta fon fu ngyngyu, nda na nzu kpukpan ma du ba ye zoo ni kpi wa ani son na.
O nyere ọchịagha ahụ iwu ka e debe ya nʼokpuru nlekọta ha. Ma ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa nyere ya aka gboo mkpa ya.
24 Hu gon vi bari, Felix a kma ye mba iwama Drusilla, wa ana bi Yahudawa, nda ton ba ka yo Bulus, i ba wo rhinuwu nitu kri gbangban sron ni Kristi Yesu.
Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Feliks na nwunye ya Drusila, bụ onye Juu bịara, ọ kpọrọ Pọl ka ọ gwa ha okwu banyere inwe okwukwe nʼime Jisọs Kraịst.
25 I niwa Bulus shlesiya niwu nitu Krista tsra, mla kpa nji, mba gaatre wu ye, Felix a ku ti sissri nda tre ndi, “Hi kpame zizan, Mita he ni nton ni ko shishi mi ton ba hi yowu.”
Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.”
26 Ni nton kima me ata yo sron ka Bulus ni nu nklen, niki a ta gbla you nda ye tre niwu.
Ọ na-atụkwa anya na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ ya site nʼoge ruo nʼoge ka ya na ya na-akparịta ụka.
27 Niwa ise ha baka hi, Porcius Festus a hon ni ruron gomna hugon Felix, i Felix a ta son kpa ya nyime ni Yahudawa ba, niki a don Bulus ni lo.
Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe ọ chọrọ inweta ihuọma nʼaka ndị Juu, Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ.