< Ndu Manzaniba 21 >

1 Niwa ki hi don ba ni vu zren hu nkon mma, ki hu tri me hi ni gbu Cos, e ni bi wa aka hua ni gbu Rhodes, mba rhini ki hi ni gbu patra.
Mgbe anyị hapụsịrị ha, anyị nyapụrụ ụgbọ anyị bịaruo Kos. Nʼechi ya, anyị rutere Rods. Anyị sitere nʼebe ahụ jeruo Patara.
2 Niwa ki to jirgima wa a ta ru hini Funisiya, ki ri huba dran hi.
Mgbe anyị hụrụ ụgbọ mmiri na-aga Fonisia, anyị banyere nʼime ya kwọpụ.
3 Hu wa ki nzu shishi to Cyprus, ki kawdon ni wo mrha wu kpran jirgia, ki dran hi ni Syria, ndi ka kukri ni Tyre, bubu wa kikle jirgi a ta ju kpi wa anjia.
Mgbe anyị kwọruru ụgbọ anyị ebe anyị nwere ike ịhụ Saiprọs, anyị siri nʼaka ekpe ya gafee, ruo Siria. Anyị rutere nʼọnụ mmiri Taịa, ebe ụgbọ mmiri ga-akwapụ ibu dị nʼime ya.
4 Hu wa ki to mri ko bihuba, ki kii ni ki wu vi tangban. Hu kpere sron brji, basi yo tre ni Bulus du na hi Urushelima na.
Mgbe anyị chọtara ndị na-eso ụzọ ahụ, anyị nọnyere ha abalị asaa. Ha gwara Pọl site nʼike nke Mmụọ Nsọ, ka ọ ghara ịga Jerusalem.
5 Niwa ivimbu niki a kle, ki donba ni kunkon mbu, i wawumbu, baba mbamba ni mri mba ba huta zren rjuni gbu'a. Niki ki kukwu ngbarju ni nyu kpe tre ma'a ni bre Irji,
Mgbe anyị nọzuru ụbọchị anyị, anyị hapụrụ ha, bilie ije. Ha na nwunye ha na ụmụ ha so dupu ruo mgbe anyị si nʼobodo ahụ pụọ. Anyị na ha gburu ikpere nʼala nʼọnụ mmiri kpee ekpere.
6 ni tre ndi se vi ri niki ki rini jirgi'a, i ba kma hi komba.
Mgbe ahụ, anyị kelere onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesịa, anyị banyere nʼime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nʼụlọ ha.
7 Niwa ki kle zren mbu rji ni Tyre, ki ye ni Ptolemais. Niki chi mri vayi ba ni son niba wu vi ri.
Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nʼebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nʼime obodo a, nọnyere ha naanị otu ụbọchị.
8 Nivi wa a hu kima ki hi ni Kaisariya. Ki ri ni ko Filibus, ndji wu zren ni bla tre Irji, wa ana iri nimi tangban ba, ndi ka son niwu.
Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute Sizaria. Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ.
9 Inji yi a he ni mri mba nza wa bana to lilon na, i bata nran kpi bi ye ni ko shishi.
O nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma.
10 Niwa ki kii niki wu vi fon bran, indji ri wa ri to koshishi, ni nde Agabus, grji ye rhi ni Judiya.
Mgbe anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, ka otu onye amụma a na-akpọ Agabọs, si Judịa bata.
11 A ye nita nda ban rjirji trii Bulus. Niki a lo za mba woma ni rjirji trii'a nda tre ndi, “Ikpe wa Brji Tsatsra ni tre'a, toki Yahudawa bi Urushelima ba lo indji wu rjirji trii yi, i ba vuu yo ni wo Bikora.”
Ọ bịakwutere anyị, chilite belịt Pọl na-eke nʼukwu, kee onwe ya nʼụkwụ na aka sị, “Dịka Mmụọ Nsọ kwuru, ‘otu a ka ndị ndu ndị Juu ga-eke onye nwe ihe a agbụ na Jerusalem. Ha ga-ararakwa ya nye nʼaka ndị mba ọzọ.’”
12 Niwa ki wo kpi biyi, kita baba indji wa ba ki ni ki, ki krubre Bulus ni du na hi ni Urushelima na.
Mgbe anyị nụrụ nke a, anyị na ndị niile nọ nʼebe ahụ rịọrọ Pọl ka ọ ghara ịga Jerusalem.
13 Niki Bulus a sa bawu ndi, “Bisi ti ngye, kpa gro nini yra me sron? Mi kpanyime ndi du ba na lo me negen na, mba du me kwu ngame ni Urushelima nitu nde Bachi Yesu.”
Ma Pọl zaghachiri, “Gịnị ka unu na-eme, ọ bụ akwa ka unu na-ebe, na-eme ka obi gbawaa m? Nʼihi na ọ bụghị naanị na m dị njikere ka e kee m agbụ, kama ejikekwara m iwere ndụ m nye na Jerusalem nʼihi aha Onyenwe anyị Jisọs.”
14 Nitu wa Bulus na kma sron ni bre mba na, ki son ngbangbi ni lu tre ndi, “Du kpe wa Irji kpanyime niwu du he toki.”
Ebe ọ na-ekweghị ege anyị ntị, anyị kwụsịrị ma sị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.”
15 Hu vi biyi, ki vu ba mbu zren mbu ni hi ni Urushelima.
Mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, anyị jikere bilie ịga Jerusalem.
16 Mri ko bi hu bari wa ba rhini Kasariya ba huta ngame. Ba nji indji ri wu nde Mnason, indji wu Cyprus, nha ni kpamba, wa ana he ni mi bi mri ko bi hu, wa ki hi ki niwu.
Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ ndị nọ na Sizaria, duuru anyị gaa, ha kpọruru anyị nʼụlọ Mnasin, onye Saiprọs ebe anyị ga-anọ dịka ọbịa, onye sitere na mbụ bụrụ onye na-eso ụzọ ahụ.
17 Niwa ki ye ri ni Urushelima, mri vayi ba ba kpata ni wo ha ni ngyiri.
Mgbe anyị rutere Jerusalem, ndị ụmụnna jiri obi ụtọ nabata anyị.
18 Nivi wa a ka hu ki, Bulus a njita hi ni ko Yakubu, i bi chiche ba bana he niki.
Nʼụbọchị nke so ya, anyị na Pọl gara ileta Jemis, ndị okenye niile nọkwa nʼebe ahụ.
19 Niwa a chi ba, a vu bla ni yiyri kpi wa Irji a ti nimi Bikora ni nkon ndu wa a ti'a.
Mgbe o kelechara ha, ọ kọọrọ ha nʼotu nʼotu, ihe niile Chineke rụrụ nʼetiti ndị mba ọzọ site nʼije ozi ya.
20 Niwa bawo kima ba gbre san ni Irji, nda hlawu ndi, “Wu to, vayi, ka indji dubu bren ni mi Yahudawa ba ba kpanyime. Ba yo sron kri gbangban ndi ba hu du a.
Mgbe ha nụchara nke a, ha nyere Chineke otuto. Emesịa, ha sịrị Pọl, “Leenụ nwanna, otu ọtụtụ puku ndị Juu si bụrụ ndị kwere ekwe, ha niile ka ihe banyere iwu a na-anụ ọkụ nʼobi.
21 Ba hla bawu nitu me, ndi wu tsro Yahudawa wa baki nimi Bikora'a du ba ka Musa don, mba ndi wu hla bawu dubu na yoyi ni mri mba, mba du bana zren nitu nkon ba tii na.
A kọọrọla ha ihe banyere gị, na ị na-ezi ndị Juu bi nʼetiti ndị mba ọzọ ka ha hapụ ịgbasokwa iwu Mosis, na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu maọbụ bie ndụ nʼusoro omenaala anyị.
22 Ki ti ni he? Njanji ba wo ndi wu ye.
Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? O doro anya na ha ga-amata na ị bịara nʼebe a.
23 Nitu ki, wuka ti kpe wa ki hla niwu. Ki he ni indji nza wa ba chu nyu.
Ya bụ, jisie ike mee ihe anyị ga-agwa gị ugbu a. Anyị nwere mmadụ anọ nʼebe a, ndị nọ na nkwa ha kwere Chineke.
24 Vuu indji ba ni ngla kpame niba, ni han nklen ni tumba, ni du ba kron nfutu mba. Ko nha ni to ndi kpe wa ba bla nitu me a hi che. Ba to ndi iwu ngame wu son tsra, nini hu du'a.
Soro ha mee omenaala ahụ nke ndị nọ na nkwa ji edo onwe ha ọcha. Kwụọrọ ha ụgwọ maka ịkpụcha isi ha. I mee otu a, mmadụ niile ga-amata na eziokwu adịghị nʼihe ndị a niile e kwuru maka gị, kama na gị onwe gị na-agazi ma na-edebekwa iwu.
25 I nitu Bikora wa ba kpanyime'a, ki nha nitu krimbu ndi duba chu kpamba ti nkan ni kpi wa ba ton ni kpi bi brji, ni iyi, ni kpe ba wuu ni nkon nduto, mba ni ti fa'a.”
Ma nʼebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ha kwụsị iri ihe ọbụla a chụrụ nʼaja nye arụsị, na iri ọbara, maọbụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.”
26 Niki Bulus a vuu indji ba, i ni vi wa aka hu'a, a ngla kpama bi ni babaa. Niki ba ri hi ni mi hekali, yo tre ni zi ndi vi wu nglakpa ani ye he toki, i ba nu beko nitu yiyri mba.
Pọl kpọọrọ ndị ikom anọ ndị ahụ tinyere onwe ya, nʼụbọchị so ya mee ka ya na ha dị ọcha. Mgbe ahụ, ọ banyere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, maka ikwupụta ụbọchị ole mmemme ịdị ọcha ahụ ga-anọ tupu e mechaa ya, nakwa mgbe ịchụ aja nʼihi ha nʼotu nʼotu ga-abụ.
27 Niwa vi tangban ba ba ye kle, Yahudawa bari rhini Asiya, ni ku shishi ni bulus ni mi hekalia, chon kpaandji ba nfu, nda yo wo nitu ma.
Ma mgbe ọ fọdụrụ nwa oge nta ka ụbọchị asaa ahụ gwụchaa, ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ha tikuru igwe mmadụ ma kpaliekwa ha. Ha jidere ya,
28 Ba sia kpa gro ndi, “Indji bi Israila, zo ta. Indji yi yi ni tsro ndji wawu kagon, kpi wa ahi nkan ni kri mba, ni dua, mba ni bubu yi. Hama kima me, a nji indji bi Greek bari ye ni mi hekali nda kpa bubu tsatsra yi ti meme.”
na-eti mkpu, “Ndị ikom Izrel, nyerenụ anyị aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nʼebe niile na-ezi ozizi megidere ndị nke anyị, iwu anyị nakwa ebe a. Ma nke kachasị nke, ọ merụọkwala ụlọnsọ a site nʼịkpọbata ndị Griik nʼime ya.”
29 Nitu bana to Trofimus, gu wu Afisus niwu nimi gbua, nda yo ndi Bulus a nji ba ri ni mi hekali.
(Nʼihi na ha ebula ụzọ hụ ya na Trofimọs onye Efesọs nʼime obodo, ha chere na Pọl kpọbatara ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ.)
30 Igbu'a wawu a chu nzan, i indji ba ba yo tsu ka vu Bulus. Ba gbiwu rju ni hekalia, nda kaa nkon ba gbagbla.
Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile.
31 Niwa ba ta son wuu, tu tre a ye ri ni ton kapti wu bi gben ndji Urushelima wawu ni kri gro tsishishi.
Mgbe ha na-achọ igbu ya, ozi ruru ọchịagha ntị na Jerusalem niile nọ nʼọgbaaghara.
32 Niki a tsi kri vu bi lokpa baba bi ya ndji deri ri, nda tsutsu grji nimi jbu indji ba. Niwa indji ba ba to ninkon kaptin mba bi lokpa ba, ba donme ni tsi Bulus.
Otu mgbe ahụ o duuru ụfọdụ ndịisi agha ya na ndị agha ya mee ngwangwa bịaruo nʼebe ha nọ. Mgbe ha hụrụ ndị agha ka ha na-abịa, ha kwụsịrị iti Pọl ihe.
33 Niki ninkon kapti a zren hi ka vu Bulus, nda mmha yo ndi du ba lowu ni sraka ha. Niki a mye ka a hi nha mba a hi ngye wa a tia.
Ọchịagha ahụ bịara jide ya, nye iwu ka e were ụdọ igwe abụọ kee ya agbụ, ọ jụkwara onye ọ bụ na ihe o mere.
34 Bari nimi jbu indji ba ba kpagro kperi i bari kpe nkan. Niwa kaptia ana mla to tu tre'a na, nitu hanton mba, a yo ba du ba nji Bulus hi ni bubu wa ba mla ziri.
Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu na-ekwu otu ihe, ebe ụfọdụ na-eti na-ekwu ihe ọzọ. Mgbe ọ na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na ọgbaaghara ahụ, o nyere iwu ka e duru ya gaa nʼogige ndị agha.
35 Niwa a zren ye ni bubu ban za grji'a, bi lokpa a ba banwu nitu nfu jbu indji ba.
Mgbe o rutere na mgbagolite ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, ndị agha bulitere ya elu nʼihi ọgbaaghara igwe ndị mmadụ dị ukwuu.
36 Nitu jbu indji ba ba sia huba nda ni kpagro ndi, “Niwu hi.”
Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu, “Wepụnụ ya! Wepụnụ ya!”
37 Niwa bataa nji Bulus ye ni bubu wu mlazia, a tre ni ninkon kaptia, ndi “Wu kpanyime ni du mi hla kpe niwu?” Kaptia a tre ndi, “Wu tre lan Greek?
Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nʼime ogige ahụ, ọ sịrị ọchịagha ahụ, “Ị ga-ekwe ka m gwa gị okwu?” Ọ sịrị, “I maara asụ asụsụ ndị Griik?
38 Ana wuyi igu masra wa alu kpagbu tsi nda gbron indji dubu nza u bi wuundi rju hi ni miji'a na?”
Ọ pụtara na ị bụghị onye Ijipt ahụ malitere ọgbaaghara ma duuru puku ndị ogbu mmadụ anọ gbalaa nʼọzara?”
39 Bulus a tre ndi, Mi ndi Yahudawa, rji ni gbu Tarsus ni Cilicia. Mina vren meme wu gbu wa a hi fii me na. Mi bre, du me tre ni indji ba.
Pọl sịrị, “Abụ m onye Juu si Tasọs, obodo dị na Silisia, nwa afọ oke obodo amara aha ya. Biko, kwee ka m gwa ndị mmadụ okwu.”
40 Niwa kaptin a nu kpanyime'a, Bulus a lu kri ni bubu ban zaa nda ti wo ni indji ba. Niwa bubua a ti gbi me, a tre niba ni lan Ibraniyawa ba. A tre nde,
Mgbe o nyere ya ikike, Pọl guzooro nʼihe nrigo nke ọnụ ụzọ ahụ fee aka ya ime ka ha nọọ duu. Mgbe ha nọdụrụ nwayọọ, ọ gwara ha okwu nʼasụsụ Hibru sị,

< Ndu Manzaniba 21 >