< Ndu Manzaniba 20 >

1 Niwa gro wu a kle'a, Bulus a ton ba ka yo mri ko bi hu'a nda nron ba du ba ki gbangban, nda tre ndi duba mla ki nda kuunko hi ni Macedonia.
Mgbe ọgbaaghara ndị a kwụsịrị, Pọl kpọkwara ndị na-eso ụzọ ahụ, gbaa ha ume, gwa ha ka ha nọdụ nke ọma, ọ pụrụ gawa Masidonia.
2 Niwa a zren zu ni gbungblu bi koki nda gbre ba ni lantre gbugbuwu, a ye rini Greece.
Mgbe ọ gagharịchara nʼakụkụ ala ahụ niile, werekwa okwu nkasiobi gbaa ndị ụmụnna ume, ọ bịaruru ala Griis.
3 Hu gon kima a son ti wha tre niki. Yahudawa ba ba mla nkon meme ti nitu ma, niwa a ta dran hun koma hi ni Syria; nitu ki a kma sran ka zu ni Macedonia.
Ọ nọrọ ọnwa atọ nʼebe ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na ndị Juu agbaala ajọ izu megide ya dịka ọ na-ejikere iso ụgbọ mmiri gaa Siria, o kpebiri ka ya si ụzọ Masidonia laghachi.
4 Kpan zren ma ba wa baka rini Asia, bana sopater ivren Pyrrhus wa a rhini Berea, Aristakus mba Sekondus, hamba bana bi Tasalonika wa ba kpanyime, Gaius wu Derbe, Timoti, mba Tychicus mba Trophimus wa a rhi ni Asia.
Sopata onye Boria bụ ọkpara Pirọs, na Arịstakọs, na Sekundus ndị si na Tesalonaịka, na Gaiọs onye Debi na Timoti, na Taịkikọs na Trofimọs, ndị Eshịa sokwa ya na-aga ije a.
5 Ndji biyi bana guchi hi nitawu nda ka sia gbenta ni Troas.
Ndị a bu ụzọ gawa, na-eche anyị na Troas.
6 Ki dran rhuni Philippi niwa ivi bi bredi wa ana fuulu, a kle, mba ni vi u ton ki ye tsra niba ni Troas. Niki ki son u vi tangban.
Mgbe Mmemme Ngabiga ahụ gwụsịrị, anyị banyere ụgbọ mmiri rute Filipai bịakwute ha na Troas nʼụbọchị nke ise. Anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị asaa.
7 Ni vi mumla u Sati ki, niwa kina zontu niki nzi bredi, Bulus a tre ni biwa ba kpanyime'a. A ta son don ba ni viwu hu kima, nitu ki a tre gbron nkon hi ni tsutsuchu.
Nʼụbọchị mbụ nʼizu ụka, mgbe anyị zukọrọ ịnyawa achịcha, Pọl gwara ha okwu, ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nʼetiti abalị.
8 Ilu fitila gbugbuu bana he ni tra u koshu, bubu wa kina zontu ki.
Ọtụtụ oriọna dịkwa nʼime ọnụụlọ ahụ dị nʼụlọ elu ebe anyị zukọrọ.
9 Ni windo'a, vren nze ri ni nde Eutychus a son, e inna a kri koonvu. Niwa bulus a tre la gbron nkon nha, vren nze yi, wa a risi kruna, a kurjoku rjini tuko u tra i baka baun kmomu.
Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ.
10 Bulus a grji hi, kukru tsra kpama nituma nda maanji ye ni kpama. Mle nda tre, “Du sron mbi na ti meme zan toyi na, a he ni sisren.”
Pọl rituru nʼala selite ya elu jikụọ ya. Ọ sịrị ndị gbakọrọ nʼebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.”
11 Niki a kma hon hi ni tra u koshu'a nda ka nzi bredi tan. Hu gon wa ala si tre ni ba wu gbro nton ka tsra ni bwu mble, a rju kaba don.
Ọ laghachikwara nʼụlọ elu ahụ, mgbe ọ nyawachara achịcha ma riekwa, o kwugidere okwu tutu chi abọọ, ọ hapụrụ ha bilie ije ya.
12 Ba nji vren nze'a kma ye ni sisren ma e sron mba a kusi.
Ha kulitere nwokorobịa ahụ na ndụ nke mere ka ọṅụ jupụta ha nʼobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu.
13 Kita ngame ki zren guchi ni Bulus nitu jirgi ma, ki dran hi ni Assos, bubu wa kina banzi ki ban Bulus yonji nita. Ana toki me wawu kima ana son ti, nitu ana ya ndi ani hu nkon u meme hi.
Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ.
14 Niwa a zontu nita ni Assos, ki baun yo ni mi jirgi'a ni hi ni Mitylene.
Mgbe o zutere anyị nʼAsọs, anyị buru ya nʼụgbọ gaa Mitilen.
15 Niki ki dran rhini kima ka ri ni vi wa aka hua, ni bubu wa ata ya nklan meme wu Chios. Ni vi wa ala hu'a, kika yo za ni nklan meme wu Samos, e vi wa aka hu kima, ki ye ri ni kikle gbu Miletus.
Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nʼụbọchị nke so ya, anyị gafere rute Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs.
16 Nitu Bulus ana banzi ndi ani dran vu Ephesus yba, nitu du wawu na wo nton ni Asia na; a ta sima hi ri ni Urushelima nitu hi tsra ni vi Pentecost, anita bi tiwu toki.
Nʼoge a, Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nʼEfesọs ka ọ ghara itufu oge nʼEshịa, nʼihi na ọ na-eme ngwangwa irute Jerusalem nʼụbọchị mmemme Pentikọọsụ, ma ọ bụrụ ihe ọ pụrụ ime.
17 Rjini Miletus a ton ndji hi ni Ephesus duba ka yo bi ninkon ekklisiya ye wu.
Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya.
18 Niwa ba ye'a, a hla bawu ndi, “Bi yi kimbi bito, rhini vi mumla wa mi yo za ni Asia, niwa chachu mi zi wunton niyi.
Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a.
19 Mi zi ti ndu Bachi hama ni nzutu mba ni Mashishi, mba ni tsra iya wa ye ni me nitu zon nyu meme wu Yahudawa ba.
Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m.
20 Bito nitu wa mi na kamu ni dbu bla ni yiwu ko ngye wa ani zoyi na, mba wa mi tsro yi ni shishi ndji wawu mba huyi niko niko,
Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha.
21 ni ni vu ni nran ni Yahudawa baba bi Greek nitu kma sron hi ni Irji mba kri ni gbangban sron ni Bachi mbu Yesu.
E kwusaala m nye ma ndị Juu ma ndị Griik okwu nchegharị nʼebe Chineke nọ, na okwukwe nʼebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.
22 Zizan ya, mi si hi ni Urushelima, ni gbron Ruhu, nina to kpe wa ani ti nimu niki na,
“Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dịka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nʼebe ahụ.
23 hamma wa Ruhu Tsatsra a bwu bla nimu ndi ni gbu kankan wa mi ria, wlo cbo wu lo mba iya ni gben me.
Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama nʼebe ọbụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nʼebe ahụ.
24 E me mina ban kpa ivri sisren mu to hi kpe wu tumu na, nitu du mi kle itsu mba ndu wa mi kpa rjini Bachi Yesu, ni du mi bwu nran tre ndindi wa Irji nme wo kpata hama duta ki han kpe.
Ma akpọghị m ndụ m ihe ọbụla. Karịa naanị ka m gbazuo ọsọ m ma jezuokwa ozi ahụ m natara nʼaka Onyenwe anyị Jisọs, nke bụ ịkọwa banyere oziọma nke amara Chineke.
25 Zizan ya, Mito ndi wawu mbi, wa nimi mbi mi zren si dbu hla nitu ikoson Irji, bina la to shishi mu na.
“Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọbụla nʼime unu, bụ ndị m jegharịrị nʼetiti ha na-ezisara ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ.
26 Nitu kima, mi bwu ni bla yiwu vi wu luwa iyi ndrjo na he ni tumu na.
Ya mere, ana m agwasị unu ike, taa, na abụ m onye aka ya dị ọcha nʼebe ọbara onye ọbụla nʼime unu dị.
27 Nitu mina ka kpe don ni dbu bla wawu kpe wa Irji ni son niyi na.
Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.
28 Nitu kima, bika mla zren ni kpambi, mba ni ba wawu ntma wa Ruhu Tsatsra a yoyi du yi yaba niwu'a. Mla zren ni krju ekklisiya Irji, wa a le ba ni iyi ma. / Nitu du he ndi / ni iyi ma / nha vunvu bi sen bari ba yo ndi / ni iyi wu vren ma
Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya.
29 Mi toh ndi, mita hi kpamu, meme yawhu bari ni mi mbi ba ye nda na kpa ntma ba chuwo na.
Nʼihi na amaara m na mgbe m lachara, agụ jọgburu onwe ya ga-abata nʼetiti unu nke na-agaghị emere igwe atụrụ ebere.
30 Mi to ndi nimi mbi me, ndji bari ba nzulu nda tre kpe bi gbran rhen nitu du ba gbron mriko bihu bari hi ni kpan mba.
Ụfọdụ nʼime unu ga-ebili tụgharịa eziokwu ahụ ịhụ ka ha si otu a dọrọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ nye onwe ha.
31 Nitu ki bika mla kri. Bika ti mren ndi wu se tra mina don me ni nron yi yiyyri mbi ni mashishi ni chu mba ni irhi.
Ya mere, na-echenụ nche! Chetakwanụ na nʼime afọ atọ m nọrọ nʼetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri na-adụ unu ọdụ.
32 Zizan mi yoyi ni wo Irji mba ni lan tre u wa a kpata, wandi ani to me yi nda nuyi gado nimi biwa ba ngla ba ti tsatsra'a.
“Ugbu a ana m etife unu nʼaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nʼaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu ume na inyekwa unu akụnụba ọ kwadobeere ndị ahụ e doro nsọ.
33 Mina ti ngu yo sron nitu azurfa, zinariya ko nklon ndrjo na.
Ọ dịghị mgbe ọbụla agụụ ịdọtara onwe m ọlaọcha maọbụ ọlaedo maọbụ uwe nke onye ọbụla ji gụọ m.
34 Biyi me bi to ndi iwo mu biyi ba tindu ne kpiwa mi son mba kpison wu bi wa ba he ni me'a.
Ọ bakwaghị uru ịgwa unu na ọ bụ aka m rụpụtara ọrụ gbooro m mkpa niile, na nke gbokwara mkpa ndị ahụ mụ na ha so.
35 Ni kpi wawuu, mi bwu nkon tsro yi nitu wa bi zo bi wa bana he ni gbengblen na, ni tindu, mba niwa bi timre ni lantre Bachi Yesu, lan tre wa wawu kima a tre: A zan bi lulu du hu nu ni du hu kpa,”
Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’”
36 Hu gon tre ma ni nkon yi, a kukwu mgbarju nda bre Irji ni ba wawu mba.
Mgbe o kwusiri okwu ndị a, o soro ha niile gbuo ikpere nʼala kpekwa ekpere.
37 Ba kuuyi bran nda mankpa Bulus nji nda chiwu bi bi wu sron nyime.
Ha bere akwa nke ukwuu, makụọ Pọl, sutukwa ya ọnụ.
38 Sron mba a ti meme zan nitu wa a tre ndi bana la to shishima ngana. Mle ba huu ka yo ni nkon ni jirgi ma'a.
O wutere ha karịa na o kwuru na ha agaghị ahụ ya anya ọzọ. Emesịa, ha duru ya ruo ebe ọ banyere ụgbọ mmiri.

< Ndu Manzaniba 20 >