< Ndu Manzaniba 13 >
1 Zizan ni Ekklisiya wu Antioch, Anabawa baba bi tsro bari bana he. Bana ba BArnabas, Siman (wa ba yondi Niger), Lucius wu Cyrene, Manaen (vayi Herod wu retrarch wa bana kpa'u nji toh wu ngrji hi mba), mba Shawulu.
Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl.
2 Niwa basia bre ni kaa rhi kpe nda ni nzu Bachi hon, Ruhu Tsatsra a tre ndi, “Chuu ba Barnabas mba Shawulu zi tinkan nimu, ni duba ti ndu wa mi yoba duba ti.”
Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha.”
3 Hu bre ni kaarhibiri, mba yo woh ni tumba, ba tru ba yo ni duba hi.
Ya mere, mgbe ha busiri ọnụ kpekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka nʼisi zipụ ha.
4 Kima, Barnaba mba Shawulu, niwa Ruhu Tsatsra a ton ba rjuhi'a, ba grji hi Seleucia; rhiniki ba wu jrigi mma hini Cyprus.
Ebe Mmụọ Nsọ zipụrụ ha, ha gbadara Selusia, sitekwa ebe ahụ gbadaa Saiprọs.
5 Niwa ba he ni gbu Salamis, ba d'bu bla lantre Irji nimi ko Synagogues wu Yahudawa. Yohana ngame a he niba toh wu zoba.
Mgbe ha bịaruru Salamis, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu kwusaa okwu Chineke. Jọn sokwa ha dịka onye na-ejere ha ozi.
6 Niwa ba zren kaagon nclan meme gbungblu kima hi ni Paphos, ba ka tsra ni ndji wu katibrji ri ndi Yahudi wa ana anabi wu che, wa ndema ana Bar Yesu.
Mgbe ha gazuchara obodo niile ndị ahụ mmiri gbara gburugburu ruo Pafọs, ha zutere otu onye mgbaasị, onye Juu bụ onye amụma ụgha a na-akpọ Ba-Jisọs.
7 Ndji wu katibrji ana ta zren zontu ni kikle ndji wu gaatre, Sergius Paulus, wa aheni mre toh kpe kpukpome. Igu yi a yoye ni kpama, ba Barnabas mba Shawulu, nitu a nison wo lantre Irji.
Ya na otu onye ọchịchị obodo, aha ya bụ Sajiọs Pọlọs nọ. Ọ bụ nwoke nwere ọgụgụisi nʼebe ọ dị ukwuu, ọ kpọrọ Banabas na Sọl ka ha gwa ya okwu nke Chineke.
8 Ama Elymas “Wu katibrji” (toki ba k'ma ndema sran) a lu kri sen nyu wu ka kpanyme niba; a ta son k'ma kikle Iguwu gaatre rju ni nkon kpanyme'a.
Ma onye mgbaasị ahụ, onye aha ya bụkwa Elimas (nʼihi nke a bụ aha ya ma asụgharịa ya) malitere igbochi ha site nʼimegharị onyeisi ahụ anya ka ọ ghara ịnabata okwukwe ahụ.
9 Niki Shawulu, wandi bata yondi Bulus ngame, shuni Ruhu Tsatsra, a yo shishi yau gbahme
Ma Sọl, onye aha ya bụkwa Pọl, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, legidere ya anya
10 nda tre ndi, Iwu vren brji, wu shuni kpi kankan wu gyru mba meme dri. Wu kame ni ko ngye wa a he ni nkon tsatsra'a. Wuna don me ni k'ma sran nkon triime wu Bachi, ka ana naki na?
sị, “Gị nwa ekwensu, jupụtara nʼaghụghọ na nʼihe ọjọọ dị iche iche. Gị onye iro nke ezi omume niile. Ọ bụ na i gaghị akwụsị imerụ ụzọ niile ziri ezi nke Onyenwe anyị?
11 Zizan ya, Iwoh Bachi a he ni tume, wu k'mati ndji wu mfyen. Wuna toh kpanrhi wu nton bari na.” Hihari niki, ikpe too iwru mba bwu a ku nitu Elymas; wa dusi zren ni kaagon siwa nji duba vu ni wo tsro nkon.
Nʼihi ya lee, iwe nke Onyenwe anyị ga-adakwasị gị. Ị ga-ekpụ ìsì nwa oge, ị gaghị enwe ike hụ ìhè nke anyanwụ.” Nʼotu oge ahụ, ọ hụkwaghị ụzọ ọzọ. Ọ malitere na-ebigharị aka, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya.
12 Huwa kikle wu gaatre a toh kpewa a zren'a, a kpanyme, nitu tre wu Bachi wa a wo'a, a nuu rhimre ni sissri.
Mgbe onyeisi ahụ hụrụ ihe mere, o kweere, nʼihi na o juru ya anya bụ ozizi nke okwu Onyenwe anyị.
13 Zizan Bulus baba kpukpan ma ba ba wru zren hu ni nokn maa rjini Paphos nda ka rini Perga wu Pamphylia. Ama Yohana a kaba don nda k'ma hi ni Urushelima.
Pọl na ndị otu ya ji ụgbọ mmiri site na Pafọs garuo Pega nke dị nʼala Pamfilia. Nʼebe a ka Jọn hapụrụ ha laghachi Jerusalem.
14 Bulus baba kpukpan ma ba zren rhi ni Perga nda ka rini Antioch wu Pisidia. Niki bahi ka rini Synagogue chachu Sati nda ka kuson.
Site na Pega ha gara ruo Antiọk obodo nke dị na Pisidia. Nʼụbọchị izuike, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu nọdụ ala.
15 Hu, vu bla nha wu doka mba wu ba anabawa ba, bi ninkon wu Synagogue ba ton ba ni tre ndi, “Mri vayi, bita he ni tre wu nron ni ndji biyi, bika hla.”
Mgbe a gụpụtasịrị site nʼakwụkwọ iwu na nke ndị amụma, ndịisi ụlọ ekpere ahụ zigara ya ozi, sị, “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ịgbaume nye anyị, biko kwuonụ ya.”
16 Niki Bulus a lu kri nda nzuwo tibawu nda tre ndi, “Ndji bi Israila baba biyi wa bi klu Irji, woo yi.
Pọl guzoro ọtọ nʼetiti ha feere ha aka ya, sị, “Unu ndị Izrel na unu ụmụnna m ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Geenụ m ntị.
17 Irji wu ndji bi Israila yi a chu ba bachimbu nda du ndji ba bran ti gbu, niwa bana ki meme Egypt, mba ni woma waa nzu hon, a nji ba rju nikima.
Chineke nke Izrel họpụtara nna nna anyị ha mee ha mba dị ukwu nʼoge ha nọ nʼobodo Ijipt. O ji ike aka ya dupụta ha site nʼala ahụ.
18 Ni nton mla ise tso-tra-don-nza a tiya nji ba nimi gbungblu tsutsu miji. / Vunvu nha bi sen bari ba yo ndi / Wu ise mla tso-tra-don-nza asi mlabaya nji ni gbungblu tsutsu miji. /
Ọ nagidere ha iri afọ anọ nʼime ọzara.
19 Hu gon wa a yra gbungblu ndji tangban wa bana he ni meme Canaan'a, a ban meme mba nu ndji mbu ni du k'ma ti umba.
O bibiri mba asaa dị ukwuu nʼime ala Kenan nʼihi ha, nyekwa ndị ya obodo a ka ọ bụrụ nke ha.
20 Ikpe biyi ba rhuhe toki zan se 450 wa baka hi ye. Hu gon kpi biyi, Irji a nuba bi gaatre ka tsra ni nton anabi Samuel.
Nke a bụ ihe dị ka narị afọ anọ na iri afọ ise. “Mgbe nke a gasịrị, o nyere ha ndị ikpe dị iche iche ruo oge Samuel onye amụma.
21 Mle ndji ba ba mye ndi du nuba chu, u Irji a nuba Shawulu vren Kish, ndji wu grijhi Benjamin, ni du hon ti chu nitumba wu se tso-tra-don-nza.
Mgbe ahụ ha rịọrọ ka enye ha eze, Chineke nyekwara ha Sọl, nwa Kish, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta, onye chịrị iri afọ anọ.
22 Hu kima, Irji a churhu ni tuchu'a, nda nzu Dauda hon ni du k'ma he chumba. Ana Dauda yi wa Irji a hla tre ni tuma ndi, “Ngye mi ye toh Dauda vren Jesse a hi ndji wa ani hu sron mu, wa ani ti wawu kpiwa Mison ni du ti.
Mgbe o wepụsịrị ya, o mere Devid ka ọ bụrụ eze ha. Ọ gbara ama banyere ya sị, ‘Achọtala m Devid nwa Jesi, nwoke nke dị ka ọchịchọ obi m nke si dị. Ọ bụkwa onye ga-eme ihe niile m chọrọ ka o mee.’
23 Rhini h'pu iguhi Irji njiye ni Israila ndji wu kpachuwo, Yesu wa ana shirji ni tu a ni ti toki.
“Jisọs onye si nʼezinaụlọ Devid pụta ka Chineke wetaara Izrel Onye nzọpụta ahụ bụ Jisọs, dịka o kwere nkwa izite.
24 Niwa Yesu a rhihe ye, Yohana a d'bu batisma wu k'ma sron sran ni ndji bi Israila wawu.
Ma tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusala nye ndị Izrel banyere baptizim nke nchegharị.
25 Niwa a ta kle ndu ma, a tre ndi 'Bi rhimre ndi me mi nha?' Me, Mina wawuyi na. Ama srenton, iri ni ye hu gon mu, lagban za ma me mina mlakri wa mi siwuna.
Nʼoge Jọn na-arụsị ọrụ ya, ọ na-asị, ‘Onye ka unu chere na m bụ? Abụkwaghị m onye ahụ. Mba! Abụghị m ya. Ma otu onye ahụ na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.’
26 Mri vayi, mri wu iyi Ibrahim, baba biwa ba he nimi mbi wa ba klu Irji, ahi ni tawuyi mba ba ton tre wu kpachuwu yi ye.
“Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile.
27 Ni ndji biwa ba ki ni Urushelima, baba bi tuchu mba, bana mla too na nda du lantre ba anabawa wa ba ta bla chachu ni vi wu Sati'a, a hon tumba niwa ba kaamba niwu.
Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ.
28 Niwa ba wa ndana toh kpe wu lowu wu qu na, ba yo Pilate ndi du wuu.
Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesiri ọnwụ nʼaka ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya.
29 Niwa ba kle wawu kpi wa bana nha nituma'a, ba banwu grji rhini kunkron'a nda kawu yo kru nimi ibe.
Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha budatara ya site nʼelu obe, lie ya.
30 Ama Irji a nzuulu rjini qu.
Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie.
31 Wu vi gbugbuwu ndji waba hu rji ni Galili ye Urushelima basi too. Ahi ndji biyi yi basi bla kpi wa bato nituma ni ndji ba.
Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya.
32 Niki ki hla yiwu tre ndindi, shirji wa a ye niba bachimbu
“Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha.
33 a du ba ye he toki nitawu, mri mba, nitu wa a nzu Yesu lu. Na wa ba nha ni Zabura wu ha: “Wu hi wu vren mu, luwa mi k'ma ti time, /
O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma, “‘Ị bụ ọkpara m, taa abụrụla m nna gị.’
34 Nituwa a nzuu lu rji ni qu nitu du na la ka k'ma ye na, Irji a tre toyi: / Mie nu tsatsra mbalulu wa mi shirji ni Dauda.
Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru, “‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’
35 Nitu ki ala tre ni Zabura ri ngari ndi “Wuna du tsatsra me du toh gla na.'
E dekwara ya nʼebe ọzọ nʼabụ ọma, “‘Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.’
36 Niwa Dauda a kle ndu wa Irji a son niwu'a ni k'ba bi ngrjima, a ku kruna, e ba karhuu baba ba bachima, e k'ma ma a toh gla.
“Mgbe Devid rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ nʼọgbọ ha, ọ nwụrụ, e likọọ ya na ndị nna nna ya ha o rekwara ure.
37 Ama wawu wa Irji a nzu lu'a ana toh gla na.
Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure.
38 Niki bika toh, mri vayi, ndi, zu ni wo guyi, ba d'bu nihiwu, kpawruhle lahtre.
“Ya mere, ụmụnna m, achọrọ m ka o doo unu anya na mgbaghara mmehie dịkwa nʼime nwoke a, bụ Jisọs, anyị na-ekwusa nye unu.
39 Zuni wu, ko nha wa a kpanyme ani kpa yandindi nitu wawu kpi wa doka Musa ana toh ya ndindi niwu na.
A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume.
40 Nikima, mla zren nitu kpi wa anabawa ba tre nituma duna hon nitu mbi na:
Lezienụ anya ka ihe niile ndị amụma kwuru ghara ịdakwasị unu.
41 Mla ya, biyi bi kpa wruhle, ni ya ni nyu ni w'ho, mle ni qu kado; Toh, mi nji ndu niye nimi vi mbi biyi, Ndu wa bina kpanyme niwu na, ko ndrjo ri nita d'bu bla yiwu.'”
“‘Lee, unu ndị na-akwa emo, nọrọnụ na mgbagwoju anya ma lakwanụ nʼiyi. Nʼihi na agaje m ime otu ihe nʼụbọchị unu nke unu na-agaghị ekwe na o mere, ọ bụladị na mmadụ kọrọ unu maka ya.’”
42 Niwa Bulus mba BArnaba ba lusi hi, ndji ba ba breba ni duba la tre lan tre ba ngari ni chachu Sati wu hu kima.
Mgbe Pọl na Banabas na-apụ, ndị mmadụ rịọrọ ha ka ha bịakwa nʼizu ụka ọzọ gwa ha okwu gbasara ihe ndị a.
43 Niwa ku son mba wu Synagogue a ye kle'a, yahudawa gbugbumba baba biwa ba kpanyme nda k'ma ni hu Irji mba ba hu Bulus mba Barnaba, e ba tre niba nda nron ba ndi duba kri gbangban ni nkon ndindi wu Irji.
Mgbe a gbasara nzukọ ahụ, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sooro Pọl na Banabas, ndị gwara ha okwu, rịọsiekwa ha ike ka ha nọgide nʼamara Chineke.
44 Nivi Sati wa aka hu kima, igbua wawu ba ye zontu ki nitu duba wo lantre wu Bachi.
Nʼụbọchị izuike ọzọ ahụ, ọtụtụ ndị bi nʼobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị.
45 Niwa Yahudawa ba ba toh kpaandi ba, ngu a shu ni sron mba, nda duba tre meme nitu kpi wa Bulus a tre'a, nda si mren'u.
Mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, obi ha jupụtara nʼekworo, ha bidokwara ikwu okwu ọjọọ megide okwu niile Pọl na-ekwu.
46 Ama Bulus mba Barnaba ba tre rju ni gbengble sron ndi “Abi wa du yi guchi wo bla lantre Irji. Ni toyi bi tru hle rjuni kpa mbi, ni ban kpambi ti wa bina mla wu kpa vri wa ana kle na, tooyi, ki k'ma hi nibi wa ba bi kora. (aiōnios )
Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ. (aiōnios )
47 Toki Bachi a mmhata gbangban ni tre ndi, 'Mi yoyi nji kpachuwo hi ni gbungblu nkankan wu meme wawuu.'”
Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu, “‘Emeela m ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka ị nwee ike weruo nzọpụta nʼebe niile ụwa sọtụrụ.’”
48 Niwa bi kora'a ba wo tre yi, ba ngyiri nda nzu hon lantre wu Bachi. Wawu biwa a yoba yo ni duba kpa ivri wa ana kle na, ba kpanyme niwu. (aiōnios )
Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ, ha sọpụkwara okwu nke Onyenwe anyị. Ya mere ndị niile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi bụ ndị kwenyerenụ. (aiōnios )
49 Lantre Bachi a zren hi ni ngbran kima wawu.
Ya mere okwu Onyenwe anyị gbasara ruo ebe niile nʼobodo ahụ.
50 Ama Yahudawa ba ba chon mmba bi ninkon ndani kri gbangban ni hu'a, baba lilon bi tsro nkon wu hu ni gbu'a. Ba chon iya yo nitu Bulus mba BArnaba nda duba zuba vrarju ni ngbran kima.
Mgbe ahụ, ndị Juu kpaliri obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke ndị ọnọdụ ha dị elu, na ndị ikom ndị nke ndu obodo ahụ. Ha kpasuru mkpagbu megide Pọl na Banabas si otu a, chụpụ ha site nʼobodo ahụ.
51 Ama Bulus mba Barnaba ba kpon meme zamba rju du hon tumba. Mle ba hi ni gbu Iconium.
Ha tichapụrụ aja dị nʼụkwụ ha ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka na ntị mmegide ha. Ha hapụrụ obodo ahụ gaa Aikoniọm.
52 E mri ko bi hu ba ba shuni ngyiri mba ni Ruhu Tsatsra.
Ma ndị na-eso ụzọ ya jupụtakwara nʼọṅụ na nʼike nke Mmụọ Nsọ.