< 2 Teselonikawa 1 >

1 Bulus, ni Salbanus di Timoti iya ye di Ikilisiya Tasolonika nime ishir intibu din tintibu invreshir.
Pọl, na Saịlas, na Timoti dere akwụkwọ a, Na-edegara nzukọ dị nʼobodo Tesalonaịka nʼime Chineke Nna anyị, na nʼime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
2 Idon imermu ni sungreme di yin in sinsarn ni bacintinbu di vreshirn Yesu Almasihu.
Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
3 Bebbimi ki gri nitimbu bihim don biyin mervenyi aha nakime dindi di yo surbin di shubi gbegbeme ki kpa yirni kpambu ki brabran.
Ụmụnna, anyị aghaghị ikele Chineke ekele mgbe niile banyere unu. O kwesiri ka anyị mee otu a, nʼihi okwukwe unu na-abawanye. Ịhụnanya onye ọbụla nʼime unu nwere nʼebe ibe ya nọ na-abawanyekwa.
4 Ki ta ni kpanmbu ki ulhu'ilkpome din Ikilisiya shir. khe tratra von sor din sisur ni tiryah bi kpa ni vunghr.
Nʼihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nʼetiti nzukọ Chineke niile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachiobi nọgidesie ike nʼime nsogbu niile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu, ọ bụladị nʼetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu.
5 In wa a la'tra bacinbu un dindima idima naki bi mle wa ba bayi hi ni shun ni Rji wa bi sha yah do wawu.
Ihe ndị a niile na-egosi na ikpe Chineke bụ nke ziri ezi, nke e ji eme unu ndị kwesiri alaeze Chineke, nke unu na-ata ahụhụ nʼihi ya.
6 Didima ni Rji aka sur in yama ni bin ba ti yin yah.
Chineke bụ onye ezi omume nʼezie. Ọ ga-eji mkpagbu kwụghachi ndị na-akpagbu unu.
7 A noyin si bi yin bintiyah ni kita. intinayi dun kmaye vevre Rji ni shun ni malaiku gbegble.
Ọ ga-enyekwa unu bụ ndị a na-akpagbu na anyị onwe anyị ezumike. Ọ ga-eme nke a mgbe a ga-eme ka Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị mmụọ ozi si nʼeluigwe pụta ìhè.
8 Ni melu wa ba muw ba ba yah bu ni tun bin ba na ton Rji bu Yesu Almasihu na.
Ọ ga-abịa nʼụdị ire ọkụ taa ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ na ndị jụrụ ịnabata oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
9 Bin tin yah bi kasun bana to yin ghana ni shishi Rji ni gresan gbeglema. (aiōnios g166)
Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya, (aiōnios g166)
10 A ni tin wayin iton wa ni yen ni chichunkin gbugle iji ba gren Ani kpe unsisir ni gbugle bin bakpanyme ni'u ni shaidar ba.
nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto, nʼime ndị nsọ ya, ya na ka ọ bụrụ ihe ịtụnanya nʼebe ndị kweerenụ nọ, nʼihi na unu kwenyere ama nke oziọma ahụ anyị gbaara unu.
11 Iki sa ki bran cicun ni tun bin. kin bra do Rjinbu a ton yin bin tin dindi wa yo in. ki bra nun hayin dun bi tin a didima ni dun bin tin bi kpanyme ni'u nigbegle.
Nʼihi nke a, anyị na-anọgide nʼekpere nʼihi unu, na-arịọ ka Chineke gụọ unu dịka ndị kwesiri ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na-arịọkwa ka o site nʼike ya mee ka unu mezuo ebumnobi nke ihe dị mma, na ezi ọrụ niile nke okwukwe.
12 Kin bra ni den invenre me in tin bu vevre Rji ki kpa dindima nikpa bin. inbrarbu bin ti dindima don dindi Rjin bu ni vivren Rji Yesu Almasihu.
Ka e nye aha Onyenwe anyị Jisọs otuto nʼime unu, unu onwe unu nʼime ya kwa, dị ka amara nke Chineke anyị na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst si dị.

< 2 Teselonikawa 1 >