< 2 Yohana 1 >

1 Churji nindi iwandi a che ni wa u mirli wandi minyeme niba kpukpome ana hime ni kankirzi muwa, nibiwandi bato njanji.
Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara nwanyị ahụ onye Chineke họpụtara, na ụmụ ya akwụkwọ a, bụ ndị m hụrụ nʼanya nʼime eziokwu. Ọ bụghị naanị m kama ndị niile maara eziokwu ahụ.
2 Nitu njanji wandi kiheniwua anihe nita kasese. (aiōn g165)
Nʼihi eziokwu ahụ nke dị nʼime anyị, nke ga-adịgidekwa nʼime anyị ruo mgbe ebighị ebi: (aiōn g165)
3 Tibi ni malati, ni sisro, ba sonita ni rji ubati yeni yesu almasihu vreji ni inyi njanji ninyeme.
Amara, na ebere, na udo nke sitere na Chineke Nna na Jisọs Kraịst, bụ Ọkpara Nna ahụ dịnyere anyị nʼeziokwu nʼịhụnanya.
4 min ngyiri kpukpome niwandi mito imri me bari bazere ni miyi njaji niyu wandi kikpa ngwroyi nitimbu.
Apụghị m ịkọ ụdị aṅụrị m nwere mgbe m hụrụ na ụfọdụ ụmụ gị na-ebi ndụ ịgbaso eziokwu dịka ihe Nna nyere anyị nʼiwu.
5 zizaa misi breu iyiko minasin ngya nwrosamambaniwuna iwayikife tunise tunturmu, ndikinyeme nikpambwu.
Ma ugbu a, ezi nwanyị, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-edere gị kama nke ahụ e nyere anyị site na mmalite. Ana m arịọ ka anyị hụrịta ibe anyị nʼanya.
6 iwayi, i iwayimba binwro, abini wandi biwo in mumla, ndiduyi zere miyima.
Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya.
7 bi gyurundi ba rju ni gbunblu biwandi banayeme ndi iverji ayenan diana ba babiandi ba gyrundi a nala nitingu ni vrerji.
Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide Kraịst.
8 ya kpambi, nahama ni kpe wandi kitindu tuma na yi, kpa sambi.
Lezienụ anya, ka unu ghara itufu ụgwọ ọrụ nke anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ maka ya, kama ka unu nata ụgwọ ọrụ unu nʼuju.
9 indyi wandi azerehini koshishi anahe myi nwro Almasihu na ana henirjina. iwandi a wonnwroa aheni tia-mba vre.
Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼozizi Kraịst, nke na-esite na ya na ewezuga onwe ya, enweghị Chineke. Ma onye ọbụla na-anọgide nʼozizi ahụ nwere Nna na Ọkpara ya.
10 indyi wandiaynyi anakpawroyina, nakpa nikombina, nachi menayi.
Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa izi unu ihe ọzọ dị iche site nʼozizi a, unu akpọbatala ya nʼụlọ unu, maọbụ nabatakwa ya.
11 mpempebi iwandi achia bati kyumban ni miyi memkppe wandi anitia.
Nʼihi na onye nabatara ya ga-eso onye dị otu a keta oke nʼajọ omume ya.
12 mihenikpe gbugbwu iwandi misongya niwa u mbe ni-ma ungya na tsramena. tokimame misingyri soye kini treni kpanbu shishi mba shishi, nindu kinkiasrombu ndu shune.
Ọ bụ ezie na enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere unu, ma achọghị m iji akwụkwọ na inki dee ha. Kama, ana m ele anya ịbịa leta unu ka mụ na unu kwukọrịta okwu ihu nʼihu, ka e sikwa otu a mee ka ọṅụ anyị zuo oke.
13 imirli v vayime iwandi binyeme niwu bachiu.
Ụmụ nwanne gị nwanyị, bụ onye a họpụtara, na-ekele unu.

< 2 Yohana 1 >