< 1 Korinthians 2 >

1 Ninton wo me ye niyi mir vayi mena ye ni gwa ninta ko ni hi kima na nitre irji, ni bunko kpi bi biwa ba rhiba gamee ni tre Rji wa me kpayem ni wu.
Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya banyere ihe omimi niile nke okwu Chineke.
2 Ninto wa mw yo suron mena takpe na nintu, me na he niyi na, sai de Yesu kristi, wa bi kle ni gicciye ni.
Nʼihi na ekpebiri m na naanị ihe m ga-ama nʼetiti unu bụ naanị ihe banyere Jisọs Kraịst na mkpọgbu a kpọgburu ya nʼelu obe.
3 Me he niyi ni mi ya ni sisir ni wer Kpa gbugbu'u.
Abịakwutere m unu nʼọnọdụ adịghị ike, oke ụjọ na ahụ ịma jijiji.
4 Nitre mu, ni dubu mu banahe gur hankali wukpi wa he nimi hiki ma na iye ni zho Ruhu mai-sarki ni iko.
Okwu m na ihe m kwusara abịakwaghị dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara nʼụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na ike ya.
5 Ana niyo suron mbi tu kpe wu biki ma ndi du hei wu Rji.
Ka okwukwe unu ghara ịdabere nʼamamihe mmadụ, kama ka ọ dabere nʼike Chineke.
6 Zizan ki tre wu hikima ni biwa kuson kpan kpan ahna biwa boo he ni biki ma gbu-gbu'u ko hi son ni mulki wu ton yi wukle yi wa ba ki wace. (aiōn g165)
Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi. (aiōn g165)
7 Naki ki tre nitu hikima wu Rji wa a riri da wu jaji wa bariyi ni hikima wu Rji wahe riri tun niton dau kako ima. (aiōn g165)
Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto. (aiōn g165)
8 Dubircu bi zizan ha na tou ki na, ba di na to niton mu ba di na kpayem do glo Yesu zu dakaka na. (aiōn g165)
O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe. (aiōn g165)
9 Wunaki nitrema, Rashishi wato, u ba ton awo ba suron ndi wa taba rhimere kpi biwa Irji a tiba nibawu ba wa ba kpayeme niwu.
Ma dịka e dere ya, “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”
10 Ama ikpi biyi Irji a tsor ta ni zo Ruhu. Nakiyi Ruhu niya kpi biwa bahe ni zurfi wu Rji.
Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi.
11 Anha to mi suron ndi, naki se de ruhu wa a he nindi? naki ba indi wato du kpi bi zurfi wu Rji saide Ruhu Rji
Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke.
12 Naki kina kpa ruhu wu gbungbu'u na, a Ruhu wa ahi kina kpa ruhu wu Rji kima wakya nito kpi ni shishi wa Rji a nota.
Ma mmụọ nke anyị natara abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị nwee ike ịghọta onyinye amara niile Chineke nyere anyị.
13 Ki tre ni tu kpi biyi ba ni klama wa ndi ba tsro ta ni hikima ndi ba ama ni Ruhu wa w tsou kpi bi ruhu ni ndi bi ruhu.
Nke a bụ ihe anyị na-ekwu, ọ bụghị nʼokwu a kuziiri anyị site nʼamamihe mmadụ, kama site nʼokwu nke Mmụọ kuziri anyị; anyị ji okwu nke Mmụọ na-akọwa eziokwu nke mmụọ.
14 Wa ana he ni Ruhu na ana kpa kpi bi Ruhu Rji na, ba zama kpi bi wauta niwu. Ana iya datoba na, don ba kpi bi ruhu.
Ma mmadụ ahụ Mmụọ na-adịghị nʼime ya adịghị anabata ihe ndị ahụ sị na Mmụọ nke Chineke bịa, nʼihi na ha bụ nzuzu nʼebe onye ahụ nọ. Ọ naghị aghọta ha, nʼihi na ha bụ ihe a na-aghọta naanị site nʼike nke Mmụọ.
15 Wa he ni Ruhaniya ani shari anta kpi ba na duki naki ama bari ba na sharanta u na.
Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọbụla ma ya onwe ya bụ onye mmadụ ọbụla na-enweghị ike ịghọta.
16 “A nha iya tou suron Rji wa ni iya do tre wawu ni tsro wu?” Duk naki kita kihe ni suron u vera Rji.
Nʼihi na, “Onye maara uche Onyenwe anyị ruo na ọ ga-ezi ya ụzọ?” Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.

< 1 Korinthians 2 >