< ইষ্রা 2 >

1 ব্যাবিলনের রাজা নেবুখাদনেজার যাদের বন্দি করে নিয়ে গিয়েছিলেন, তাদের মধ্যে সেই প্রদেশের এইসব লোকজন নির্বাসন কাটিয়ে জেরুশালেম ও যিহূদায় নিজের নিজের নগরে ফিরে এসেছিল।
Ugbu a, ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa Babilọn. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke ha.
2 তারা সরুব্বাবিল, যেশূয়, নহিমিয়, সরায়, রিয়েলায়, মর্দখয়, বিল্‌শন, মিস্পর, বিগ্‌বয়, রহূম ও বানার সঙ্গে ফিরে এসেছিল। ইস্রায়েলী পুরুষদের তালিকা:
Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Seraya, Reelaya, Mọdekai, Bilshan, Mispa, Bigvai, Rehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
3 পরোশের বংশধর, 2,172 জন;
Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ.
4 শফটিয়ের বংশধর, 372 জন;
Ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ.
5 আরহের বংশধর, 775 জন;
Ụmụ Ara, narị asaa na iri asaa na ise.
6 (যেশূয় ও যোয়াবের সন্তানদের মধ্যে) পহৎ-মোয়াবের বংশধর, 2,812 জন;
Ụmụ Pahat-Moab (site nʼụmụ Jeshua na Joab), dị puku abụọ na narị asatọ na iri na abụọ.
7 এলমের বংশধর, 1,254 জন;
Ụmụ Elam, otu puku na narị abụọ na iri ise na anọ.
8 সত্তূরের বংশধর, 945 জন;
Ụmụ Zatu, narị itoolu na iri anọ na ise.
9 সক্কয়ের বংশধর, 760 জন;
Ụmụ Zakai, narị asaa na iri isii.
10 বানির বংশধর, 642 জন;
Ụmụ Bani, narị isii na iri anọ na abụọ.
11 বেবয়ের বংশধর, 623 জন;
Ụmụ Bebai, narị isii na iri abụọ na atọ.
12 অস্‌গদের বংশধর, 1,222 জন;
Ụmụ Azgad, otu puku na narị abụọ na iri abụọ na abụọ.
13 অদোনীকামের বংশধর, 666 জন;
Ụmụ Adonikam, narị isii na iri isii na isii.
14 বিগ্‌বয়ের বংশধর, 2,056 জন;
Ụmụ Bigvai, puku abụọ na iri ise na isii.
15 আদীনের বংশধর, 454 জন;
Ụmụ Adin, narị anọ na iri ise na anọ.
16 (হিষ্কিয়ের বংশজাত) আটেরের বংশধর, 98 জন;
Ụmụ Atea, site na Hezekaya, iri itoolu na asatọ.
17 বেৎসয়ের বংশধর, 323 জন;
Ụmụ Bezai, narị atọ na iri abụọ na atọ.
18 যোরাহের বংশধর, 112 জন;
Ụmụ Jora, otu narị na iri na abụọ.
19 হশুমের বংশধর, 223 জন;
Ụmụ Hashum, narị abụọ na iri abụọ na atọ.
20 গিব্বরের বংশধর, 95 জন।
Ụmụ Giba, iri itoolu na ise.
21 বেথলেহেমের লোকেরা, 123 জন;
Ndị ikom Betlehem, otu narị na iri abụọ na atọ.
22 নটোফার লোকেরা, 56 জন;
Ndị ikom Netofa, iri ise na isii.
23 অনাথোতের লোকেরা, 128 জন;
Ndị ikom Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ.
24 অস্‌মাবতের লোকেরা, 42 জন;
Ndị ikom Azmavet, iri anọ na abụọ.
25 কিরিয়ৎ-যিয়ারীম, কফীরা ও বেরোতের লোকেরা, 743 জন;
Ndị ikom Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ.
26 রামার ও গেবার লোকেরা, 621 জন;
Ndị ikom Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu.
27 মিক্‌মসের লোকেরা, 122 জন;
Ndị ikom Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ.
28 বেথেল ও অয়ের লোকেরা, 223 জন;
Ndị ikom Betel na Ai, narị abụọ na iri abụọ na atọ.
29 নেবোর লোকেরা, 52 জন;
Ndị ikom Nebo, iri ise na abụọ.
30 মগ্‌বীশের লোকেরা, 156 জন;
Ndị ikom Magbish, otu narị na iri ise na isii.
31 অন্য এলমের লোকেরা, 1,254 জন;
Ụmụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ.
32 হারীমের লোকেরা, 320 জন;
Ụmụ Harim, narị atọ na iri abụọ.
33 লোদ, হাদীদ ও ওনোর লোকেরা, 725 জন;
Ụmụ Lod, Hadid na Ono, narị asaa na iri abụọ na ise.
34 যিরীহোর লোকেরা, 345 জন;
Ụmụ Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise.
35 সনায়ার লোকেরা, 3,630 জন।
Ụmụ Senaa, puku atọ, narị isii na iri atọ.
36 যাজকবর্গ: (যেশূয়ের বংশের মধ্যে) যিদয়িয়ের বংশধর, 973 জন;
Ndị nchụaja: ndị agbụrụ Jedaya (site nʼezinaụlọ Jeshua), narị itoolu na iri asaa na atọ
37 ইম্মেরের বংশধর, 1,052 জন;
ndị Imea, otu puku na iri ise na abụọ
38 পশ্‌হূরের বংশধর, 1,247 জন;
ndị Pashua, otu puku na narị abụọ na iri anọ na asaa
39 হারীমের বংশধর, 1,017 জন।
ndị Harim, otu puku, otu narị na asaa.
40 লেবীয়বর্গ: (হোদবিয়ের বংশজাত) যেশূয় ও কদ্‌মীয়েলের বংশধর, 74 জন।
Ndị Livayị: Ndị agbụrụ Jeshua na Kadmiel (nke ụmụ Hodavaya), iri asaa na anọ.
41 গায়কবৃন্দ: আসফের বংশধর, 128 জন।
Ndị ọbụ abụ: Ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri abụọ na asatọ.
42 মন্দিরের দ্বাররক্ষীবর্গ: শল্লুম, আটের, টল্‌মোন, অক্কূব, হটীটা ও শোবয়ের বংশধর, 139 জন।
Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu: Ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai. Ha dị otu narị, na iri atọ na itoolu.
43 মন্দিরের পরিচারকবৃন্দ: সীহ, হসূফা, টব্বায়োত,
Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: Ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
44 কেরোস, সীয়, পাদোন,
Keros, Siaha, Padon,
45 লবানা, হগাব, অক্কূব,
Lebana, Hagaba, Akub,
46 হাগব, শল্‌ময়, হানন,
Hagab, Shalmai, Hanan,
47 গিদ্দেল, গহর, রায়া,
Gidel, Gaha, Reaya,
48 রৎসীন, নকোদ, গসম,
Rezin, Nekoda, Gazam,
49 ঊষ, পাসেহ, বেষয়,
Ụza, Pasea Besai,
50 অস্না, মিয়ূনীম, নফূষীম,
Asna, Meunim, Nefusim,
51 বক্‌বূক, হকূফা, হর্হূর,
Bakbuk, Hakufa, Hahua,
52 বসলূত, মহীদা, হর্শা,
Bazlut, Mehida, Hasha,
53 বর্কোস, সীষরা, তেমহ,
Bakos, Sisera, Tema,
54 নৎসীহ ও হটীফার বংশধর।
Nezaya na Hatifa.
55 শলোমনের দাসদের বংশধর: সোটয়, হস্‌সোফেরত, পরূদা,
Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Hasoferet, Peruda,
56 যালা, দর্কোন, গিদ্দেল,
Jaala, Dakon, Gidel
57 শফটিয়, হটীল, পোখেরৎ-হৎসবায়ীম ও আমীর বংশধর।
Shefataya, Hatil, na Pokeret-Hazebaim na Ami.
58 মন্দিরের দাসেরা এবং শলোমনের দাসদের বংশধর 392 জন।
Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ.
59 তেল্-মেলহ, তেল্-হর্শা, করূব, অদ্দন ও ইম্মের, এসব স্থান থেকে নিম্নলিখিত লোকেরা এসেছিল, কিন্তু তারা ইস্রায়েলী লোক কি না, এ বিষয়ে নিজ নিজ পিতৃকুলের প্রমাণ দিতে পারল না:
Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
60 দলায়, টোবিয় ও নকোদের বংশধর, 652 জন।
Ndị agbụrụ Delaya, Tobaya na Nekoda, narị isii na iri ise na abụọ.
61 আর যাজকদের মধ্যে: হবায়ের, হক্কোষের ও বর্সিল্লয়ের বংশধর (এই বর্সিল্লয় গিলিয়দীয় বর্সিল্লয়ের এক মেয়েকে বিয়ে করেছিল এবং তাকে সেই নামেই ডাকা হত)।
Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ Hobaya, Hakoz na Bazilai, nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead, a kpọọ ya aha nʼaha ha.
62 বংশতালিকায় এই লোকেরা তাদের বংশের খোঁজ করেছিল, কিন্তু পায়নি এবং সেই কারণে তারা অশুচি বলে তাদের যাজকের পদ থেকে বাদ দেওয়া হয়েছিল।
Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
63 শাসনকর্তা তাদের এই আদেশ দিয়েছিলেন, যে ঊরীম ও তুম্মীম ব্যবহারকারী কোনো যাজক না আসা পর্যন্ত যেন লোকেরা কোনও মহাপবিত্র খাদ্য ভোজন না করে।
Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
64 সর্বমোট তাদের সংখ্যা ছিল 42,360 জন।
Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii,
65 এছাড়া তাদের দাস-দাসী ছিল 7,337 জন; এবং তাদের 200 জন গায়ক-গায়িকাও ছিল।
nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa na narị atọ na iri atọ na asaa, ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ.
66 তাদের 736-টি ঘোড়া, 245-টি খচ্চর,
Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii, ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise.
67 435-টি উট এবং 6,720-টি গাধা ছিল।
Ịnyịnya kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise, ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa, na iri abụọ.
68 যখন তারা জেরুশালেমে সদাপ্রভুর গৃহে এসে উপস্থিত হল, তখন পিতৃকুলপতিদের মধ্যে কেউ কেউ নির্দিষ্ট স্থানে মন্দির পুনর্নির্মাণের কাজে তাদের স্বেচ্ছাদান নিবেদন করলেন।
Mgbe ha bịarutere nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya.
69 তাদের ক্ষমতানুযায়ী কাজের জন্য সৃষ্ট ভাণ্ডারে তারা দান দিলেন। তাদের স্বেচ্ছাদানের পরিমাণ ছিল 61,000 অদর্কোন সোনা, 5,000 মানি রুপো, এবং 100-টি যাজকীয় পরিধেয় বস্ত্র।
Onye ọbụla nʼime ha webatara nʼụlọakụ ihe o nwere ike inye nʼihi ọrụ a. Ha nyere darik ọlaedo dị puku iri isii na otu, maịna ọlaọcha dị puku ise na onyinye uwe ndị nchụaja, otu narị.
70 যাজকেরা, লেবীয়েরা, গায়কেরা, দ্বাররক্ষীরা এবং মন্দিরের দাসেরা অন্যান্য কিছু লোকের, এবং অবশিষ্ট ইস্রায়েলীদের সঙ্গে নিজের নিজের নগরে বসবাস করতে লাগল।
Ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị na-eche ọnụ ụzọ ama, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ ọzọkwa, ha na ndị Izrel niile fọdụrụ gara biri nʼobodo nke aka ha.

< ইষ্রা 2 >