< ܥܒܪ̈ܝܐ 12 >
ܡܛܠ ܗܢܐ ܐܦ ܚܢܢ ܕܐܝܬ ܠܢ ܗܠܝܢ ܟܠܗܘܢ ܤܗܕܐ ܕܐܝܟ ܥܢܢܐ ܚܕܝܪܝܢ ܠܢ ܢܫܕܐ ܡܢܢ ܟܠ ܝܘܩܪܝܢ ܐܦ ܚܛܝܬܐ ܕܒܟܠܙܒܢ ܡܛܝܒܐ ܗܝ ܠܢ ܘܒܡܤܝܒܪܢܘܬܐ ܢܪܗܛܝܘܗܝ ܠܐܓܘܢܐ ܗܢܐ ܕܤܝܡ ܠܢ | 1 |
Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu.
ܘܢܚܘܪ ܒܝܫܘܥ ܕܗܘ ܗܘܐ ܪܝܫܐ ܘܓܡܘܪܐ ܠܗܝܡܢܘܬܢ ܕܚܠܦ ܚܕܘܬܐ ܕܐܝܬ ܗܘܐ ܠܗ ܤܝܒܪ ܨܠܝܒܐ ܘܥܠ ܒܗܬܬܐ ܐܡܤܪ ܘܥܠ ܝܡܝܢܐ ܕܟܘܪܤܝܗ ܕܐܠܗܐ ܝܬܒ | 2 |
Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke.
ܚܙܘ ܗܟܝܠ ܟܡܐ ܤܝܒܪ ܡܢ ܚܛܝܐ ܗܢܘܢ ܕܗܢܘܢ ܗܘܘ ܤܩܘܒܠܐ ܠܢܦܫܗܘܢ ܕܠܐ ܬܡܐܢ ܠܟܘܢ ܘܠܐ ܬܬܪܦܐ ܢܦܫܟܘܢ | 3 |
Tuleenụ nʼobi unu gbasara onye ahụ tachịrị obi na nkwụgide sitere nʼaka ndị mmehie, ka ike ghara ịgwụ unu maọbụ obi unu adaa mba.
ܠܐ ܥܕܟܝܠ ܡܛܝܬܘܢ ܥܕܡܐ ܠܕܡܐ ܒܐܓܘܢܐ ܕܠܘܩܒܠ ܚܛܝܬܐ | 4 |
Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu.
ܘܛܥܝܬܘܢܝܗܝ ܠܝܘܠܦܢܐ ܐܝܢܐ ܕܐܝܟ ܕܠܒܢܝܐ ܐܡܪ ܠܟܘܢ ܒܪܝ ܠܐ ܬܗܡܐ ܡܢ ܡܪܕܘܬܗ ܕܡܪܝܐ ܘܠܐ ܬܪܦܐ ܢܦܫܟ ܐܡܬܝ ܕܡܢܗ ܡܬܟܘܢ ܐܢܬ | 5 |
Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ, “Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba.
ܠܡܢ ܕܪܚܡ ܓܝܪ ܡܪܝܐ ܪܕܐ ܠܗ ܘܡܢܓܕ ܠܒܢܝܐ ܐܝܠܝܢ ܕܗܘ ܨܒܐ ܒܗܘܢ | 6 |
Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.”
ܤܝܒܪܘ ܗܟܝܠ ܡܪܕܘܬܐ ܡܛܠ ܕܐܝܟ ܕܠܘܬ ܒܢܝܐ ܤܥܪ ܨܐܕܝܟܘܢ ܐܠܗܐ ܐܝܢܘ ܓܝܪ ܒܪܐ ܕܠܐ ܪܕܐ ܠܗ ܐܒܘܗܝ | 7 |
Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.
ܘܐܢ ܕܠܐ ܡܪܕܘܬܐ ܐܢܬܘܢ ܗܝ ܕܒܗ ܡܬܪܕܐ ܟܠܢܫ ܗܘܝܬܘܢ ܠܟܘܢ ܢܘܟܪܝܐ ܘܠܐ ܒܢܝܐ | 8 |
Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko.
ܘܐܢ ܐܒܗܝܢ ܕܒܤܪܐ ܪܕܝܢ ܗܘܘ ܠܢ ܘܒܗܬܝܢ ܗܘܝܢ ܡܢܗܘܢ ܟܡܐ ܗܟܝܠ ܚܝܒܝܢܢ ܕܢܫܬܥܒܕ ܠܐܒܘܗܝܢ ܕܪܘܚܬܐ ܘܢܚܐ | 9 |
Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ.
ܗܢܘܢ ܓܝܪ ܠܙܒܢ ܗܘ ܙܥܘܪ ܐܝܟ ܕܨܒܝܢ ܗܘܘ ܪܕܝܢ ܗܘܘ ܠܢ ܐܠܗܐ ܕܝܢ ܠܥܘܕܪܢܢ ܕܢܫܬܘܬܦ ܠܩܕܝܫܘܬܗ | 10 |
Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma ọ na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya.
ܟܠ ܡܪܕܘܬܐ ܕܝܢ ܒܙܒܢܗ ܠܐ ܡܤܬܒܪܐ ܕܕܚܕܘܬܐ ܗܝ ܐܠܐ ܕܟܪܝܘܬܐ ܠܚܪܬܐ ܕܝܢ ܦܐܪܐ ܕܫܠܡܐ ܘܕܙܕܝܩܘܬܐ ܝܗܒܐ ܠܐܝܠܝܢ ܕܒܗ ܐܬܕܪܫܘ | 11 |
Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, ọ na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, ọ bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, ọ na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya.
ܡܛܠ ܗܢܐ ܐܝܕܝܟܘܢ ܡܫܪܝܬܐ ܘܒܘܪܟܝܟܘܢ ܪܥܠܬܐ ܫܪܪܘ | 12 |
Ya mere, setịpụ aka gị ahụ ike gwụrụ. Guzosie ike nʼụkwụ gị ahụ na-ama jijiji.
ܘܫܒܝܠܐ ܬܪܝܨܐ ܥܒܕܘ ܠܪܓܠܝܟܘܢ ܕܗܕܡܐ ܕܚܓܝܪ ܠܐ ܢܛܥܫ ܐܠܐ ܢܬܐܤܐ | 13 |
Debenụ ụkwụ unu nʼụzọ ziri ezi, ka ụkwụ na-adịghị ike ghara ịda ngwụrọ, kama ka o nwe ọgwụgwọ.
ܗܪܛܘ ܒܬܪ ܫܠܡܐ ܥܡ ܟܠ ܐܢܫ ܘܒܬܪ ܩܕܝܫܘܬܐ ܕܒܠܥܕܝܗ ܐܢܫ ܠܡܪܢ ܠܐ ܚܙܐ | 14 |
Gbalịsie ike mee ka gị na mmadụ niile biri nʼudo ya na ndụ dị nsọ, e wepụ ya, o nweghị onye pụrụ ịhụ Onyenwe anyị.
ܘܗܘܝܬܘܢ ܙܗܝܪܝܢ ܕܠܡܐ ܐܢܫ ܢܫܬܟܚ ܒܟܘܢ ܕܚܤܝܪ ܡܢ ܛܝܒܘܬܐ ܕܐܠܗܐ ܐܘ ܕܠܡܐ ܥܩܪܐ ܕܡܪܪܐ ܢܦܩ ܥܘܦܝܐ ܘܢܗܪܟܘܢ ܘܒܗ ܤܓܝܐܐ ܢܤܬܝܒܘܢ | 15 |
Hụkwanụ na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara Chineke, na o nwekwaghị onye ga-epupụta dịka mgbọrọgwụ ilu weta nsogbu a ga-esi nʼime ya merụọ ọtụtụ mmadụ.
ܐܘ ܠܡܐ ܐܢܫ ܢܫܬܟܚ ܒܟܘܢ ܕܙܢܝ ܘܪܦܐ ܐܝܟ ܥܤܘ ܕܒܚܕܐ ܡܐܟܘܠܬܐ ܙܒܢ ܒܘܟܪܘܬܗ | 16 |
Hụnụ na o nweghị onye na-ebi ndụ ruru unyi maọbụ onye nke na-enweghị nsọpụrụ dịka Ịsọ, onye nke rere ọnọdụ ọmụmụ ya nʼihi otu efere nri.
ܝܕܥܝܢ ܐܢܬܘܢ ܓܝܪ ܕܐܦ ܡܢ ܒܬܪܟܢ ܨܒܐ ܗܘܐ ܕܢܐܪܬ ܒܘܪܟܬܐ ܘܐܤܬܠܝ ܐܬܪܐ ܓܝܪ ܠܬܝܒܘܬܐ ܠܐ ܐܫܟܚ ܟܕ ܒܕܡܥܐ ܒܥܗ | 17 |
Dịka unu maara, o mechara chọọ ka o keta ngọzị ahụ, ma a jụrụ ya nʼihi na o nweghị ohere nchegharị. Ọ bụ ezie na o jiri anya mmiri chọsie ya ike.
ܠܐ ܓܝܪ ܐܬܩܪܒܬܘܢ ܠܢܘܪܐ ܕܝܩܕܐ ܘܡܬܓܫܐ ܐܦܠܐ ܠܚܫܘܟܐ ܘܠܥܪܦܠܐ ܘܠܥܪܘܪܐ | 18 |
Unu abịarughị nʼugwu nke a pụrụ ịmetụ aka, nke na-ere ọkụ, na ọchịchịrị na itiri na oke ifufe,
ܘܠܐ ܠܩܠܐ ܕܩܪܢܐ ܘܠܩܠܐ ܕܡܠܐ ܗܘ ܕܗܢܘܢ ܕܫܡܥܘܗܝ ܐܫܬܐܠܘ ܕܠܐ ܢܬܬܘܤܦ ܢܬܡܠܠ ܥܡܗܘܢ | 19 |
na ụda opi ike, maọbụ olu na-ekwu okwu, nke ndị nụrụ ya rịọrọ ka ọ kwụsị ịgwa ha.
ܠܐ ܓܝܪ ܡܫܟܚܝܢ ܗܘܘ ܠܡܤܝܒܪܘ ܡܕܡ ܕܐܬܦܩܕܘ ܕܐܦܢ ܚܝܘܬܐ ܬܬܩܪܒ ܠܘܬ ܛܘܪܐ ܬܬܪܓܡ | 20 |
Nʼihi na ha enweghị ike ịnagide ihe e nyere nʼiwu, “A sịkwarị na anụmanụ ọbụla emetụ ugwu ahụ ahụ, a ga-eji nkume tugbuo ya.”
ܘܗܟܢܐ ܕܚܝܠ ܗܘܐ ܚܙܘܐ ܕܡܘܫܐ ܐܡܪ ܕܕܚܝܠ ܐܢܐ ܘܪܬܝܬ ܐܢܐ | 21 |
Nʼezie, ihe ahụ anya hụrụ dị oke egwu na Mosis sịrị, “Ana m ama jijiji nʼihi ụjọ.”
ܐܢܬܘܢ ܕܝܢ ܐܬܩܪܒܬܘܢ ܠܛܘܪܐ ܕܨܗܝܘܢ ܘܠܡܕܝܢܬܐ ܕܐܠܗܐ ܚܝܐ ܠܐܘܪܫܠܡ ܕܒܫܡܝܐ ܘܠܟܢܫܐ ܕܪܒܘܬܐ ܕܡܠܐܟܐ | 22 |
Ma unu abịaruola nʼugwu Zayọn, bụ obodo Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe ahụ. Unu abịakwutela puku kwụrụ puku ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ zukọrọ nʼọṅụ.
ܘܠܥܕܬܐ ܕܒܘܟܪܐ ܕܡܬܟܬܒܝܢ ܒܫܡܝܐ ܘܠܐܠܗܐ ܕܝܢܐ ܕܟܠ ܘܠܪܘܚܬܐ ܕܟܐܢܐ ܕܐܬܓܡܪܘ | 23 |
Unu abịala nʼụlọ nzukọ nke onye ahụ ebu ụzọ mụpụta bụ ndị e dere aha ha nʼeluigwe. Unu abịakwutela Chineke, onye ga-ekpe mmadụ niile ikpe, unu abịakwutela mmụọ ndị ezi omume e mere ka ha bụrụ ndị zuruoke.
ܘܠܝܫܘܥ ܡܨܥܝܐ ܕܕܝܬܩܐ ܚܕܬܐ ܘܠܪܤܤ ܕܡܗ ܕܡܡܠܠ ܛܒ ܡܢ ܗܘ ܕܗܒܝܠ | 24 |
Unu abịakwutela Jisọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bịakwutekwa ọbara e fesara nke na-ekwu okwu dị mma karịa nke ọbara Ebel kwuru.
ܐܙܕܗܪܘ ܗܟܝܠ ܕܠܡܐ ܬܫܬܐܠܘܢ ܡܢ ܡܢ ܕܡܠܠ ܥܡܟܘܢ ܐܢ ܓܝܪ ܗܢܘܢ ܠܐ ܐܬܦܨܝܘ ܕܐܫܬܐܠܘ ܡܢ ܕܡܠܠ ܥܡܗܘܢ ܒܐܪܥܐ ܚܕ ܟܡܐ ܚܢܢ ܐܢ ܢܫܬܐܠ ܡܢ ܡܢ ܕܡܠܠ ܥܡܢ ܡܢ ܫܡܝܐ | 25 |
Gbalịsienụ ike ihu na unu ajụghị onye ahụ na-ekwu okwu. Nʼihi na ọ bụrụ na ha agbanarịghị ya, bụ onye ahụ dọrọ ha aka na ntị nʼelu ụwa, anyị agaghị agbanarị onye ahụ si nʼeluigwe na-adọ anyị aka na ntị.
ܐܝܢܐ ܕܩܠܗ ܐܪܥܐ ܐܙܝܥ ܗܫܐ ܕܝܢ ܡܠܟ ܘܐܡܪ ܕܬܘܒ ܚܕܐ ܙܒܢ ܐܢܐ ܐܙܝܥ ܠܐ ܒܠܚܘܕ ܐܪܥܐ ܐܠܐ ܐܦ ܫܡܝܐ | 26 |
Nʼoge ahụ, olu ya mere ka ụwa ma jijiji, ma ugbu a, ọ kwela nkwa, sị, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ, ọ bụghị naanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.”
ܗܕܐ ܕܝܢ ܕܐܡܪ ܚܕܐ ܙܒܢ ܡܚܘܝܐ ܫܘܚܠܦܐ ܕܗܢܘܢ ܕܡܬܙܝܥܝܢ ܡܛܠ ܕܥܒܝܕܐ ܐܢܘܢ ܕܢܩܘܘܢ ܗܢܘܢ ܕܠܐ ܡܬܙܝܥܝܢ | 27 |
Okwu a bụ, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ,” na-egosi mwepụ nke ihe na-ama jijiji dịka ihe e kere eke, iji hụ na nke na-anaghị ama jijiji ga-adị.
ܡܛܠ ܗܟܝܠ ܕܩܒܠܢ ܡܠܟܘܬܐ ܕܠܐ ܡܬܙܝܥܐ ܢܐܚܘܕ ܛܝܒܘܬܐ ܕܒܗ ܢܫܡܫ ܘܢܫܦܪ ܠܐܠܗܐ ܒܬܚܡܨܬܐ ܘܒܕܚܠܬܐ | 28 |
Ya mere, ebe anyị na-anata alaeze nke na-apụghị ịgbanwe, ka anyị jiri obi ekele, egwu na nsọpụrụ fee Chineke ofufe nʼụzọ ọ ga-anabata.
ܐܠܗܢ ܓܝܪ ܢܘܪܐ ܗܘ ܐܟܠܬܐ | 29 |
Nʼihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erepịa erepịa.